Ezra 4:1-24

  • Ndị iro gbalịrị ime ka a kwụsị ịrụ ụlọ nsọ (1-6)

  • Ndị iro degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi (7-16)

  • Atazaksis zaghachiri ha (17-22)

  • Ọrụ a na-arụ n’ụlọ nsọ kwụsịrị (23, 24)

4  Mgbe ndị iro Juda na Benjamin+ nụrụ na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta+ na-arụrụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ nsọ,  ha bịakwutere Zerubabel na ndị isi ọnụmara dị iche iche ozugbo ma sị ha: “Ka anyị soro unu rụọ ụlọ a n’ihi na anyị so unu efe* Chineke unu.+ Anyị na-achụkwara ya àjà kemgbe oge Eze Isa-hadọn+ nke Asiria, bụ́ onye kpọtara anyị n’ebe a.”+  Ma, Zerubabel na Jeshụa na ndị ọzọ bụ́ ndị isi ọnụmara n’Izrel sịrị ha: “E nweghị ihe jikọrọ anyị na unu n’ụlọ a anyị na-arụrụ Chineke anyị+ n’ihi na ọ bụ naanị anyị ga-arụrụ ya Jehova bụ́ Chineke Izrel, otú Eze Saịrọs bụ́ eze Peshia nyere anyị n’iwu.”+  Ndị ala ahụ wee na-eme ka obi ghara isi ndị Juda ike,* na-emekwa ka ike ịrụ ụlọ ahụ gwụ ha.+  Ha goro ndị ndụmọdụ ka ha ghasaa atụmatụ ha+ n’oge niile Eze Saịrọs nke Peshia na-achị ruo n’oge Eze Darayọs+ chịwara Peshia.  Mgbe Ahazuirọs malitere ịchị, ha dere akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha boro ndị bi na Juda na Jeruselem ebubo.  N’oge ọchịchị Eze Atazaksis nke Peshia, Bishlam, Mitridat, Tabiel, na ndị òtù ya ndị ọzọ, degaara Atazaksis bụ́ eze akwụkwọ ozi. Ha sụgharịrị ya n’asụsụ Arameik,+ jiri mkpụrụ akwụkwọ Arameik dee ya.*  * Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi ma bo ndị bi na Jeruselem ebubo, sị:  (O si n’aka Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị ikpe na ndị osote gọvanọ, ndị odeakwụkwọ, ndị Irek,+ ndị Babịlọn, ndị bi na Susa,+ ya bụ, ndị Ịlam,+ 10  na mba ndị ọzọ Asenapa onye ukwu a na-akwanyere ùgwù dọọrọ n’agha ma kpọta n’obodo ndị dị na Sameria,+ nakwa ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.* Ugbu a, 11  ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ha zigaara ya.) “Eze Atazaksis, ndị na-ejere gị ozi, ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-edetara gị akwụkwọ ozi: Ugbu a, 12  ka eze mara na ndị Juu si n’ebe ị nọ bịakwute anyị erutela Jeruselem. Ha na-arụghachi obodo ọjọọ ahụ na-enupụ isi, ha na-achọkwa ịrụcha mgbidi ya+ na ịrụzi ntọala ya. 13  Ugbu a, ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a, rụchaakwa mgbidi ya, ha agaghị atụ ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ. Ọ ga-eme ka ndị eze ghara inweta ego ole ha kwesịrị ịna-enweta. 14  Ebe ọ bụ na anyị na-eri nnu si n’obí eze,* ọ dịghị mma ka anyị kwe ka e mebiere eze ihe. Ọ bụ ya mere anyị ji zite akwụkwọ ozi a ka anyị kọọrọ ya eze, 15  ka e wee nyochaa n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge nna nna gị hà.+ Ị ga-ahụ n’akwụkwọ ahụ, matakwa na obodo a bụ obodo na-enupụ isi ma na-akpatara ndị eze na ógbè* dị iche iche nsogbu. Malite n’oge gboo, e nwere ụfọdụ n’ime ha na-emegide ndị ọchịchị. Ọ bụ ya mere e ji bibie obodo a.+ 16  Anyị na-eme ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a ma rụchaa mgbidi ya, ị gakwaghị na-achị ógbè* dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.”+ 17  Eze wee zigara Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, ozi, ya na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, bụ́ ndị bi na Sameria na ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. Ọ sịrị ha: “Ana m ekele unu! Ugbu a, 18  a gụọrọla m* akwụkwọ ozi unu ziteere anyị nke ọma. 19  M nyere iwu, e mee nchọnchọ ma chọpụta na malite n’oge gboo, obodo ahụ na-emegide ndị eze. Ha na-enupụkwa isi ma na-akpata ọgba aghara.+ 20  E nwekwara ndị eze dị ike chịrị Jeruselem, ndị chịkwara ndị niile bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. A kwụkwara ha ụtụ isi, ụtụ ahịa, na ụtụ ụzọ. 21  Nyenụ iwu ka ụmụ nwoke ndị a kwụsị ọrụ, ka a ghara ịrụghachi obodo ahụ ruo mgbe m nyere iwu. 22  Hụnụ na unu mere ihe a, ka a ghara imebikwuru eze ihe.”+ 23  Mgbe a gụchaara Rihọm na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ akwụkwọ ozi Eze Atazaksis, ha gawara Jeruselem ozugbo, gakwuru ndị Juu ma manye ha ka ha kwụsị ọrụ ahụ. 24  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ Chineke dị na Jeruselem kwụsịrị. Ọrụ ahụ kwụsịrị ruo n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs nke Peshia.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “achọ.”
Na Hibru, “na-eme ka aka ndị Juda ghara isi ike.”
O nwere ike ịbụ, “E dere ya n’asụsụ Arameik ma sụgharịa ya.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Ezra 4:8 ruo 6:18.
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Ma ọ bụ “e si n’obí eze akwụ anyị ụgwọ ọnwa.”
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
N’Arameik, “enwe òkè n’ógbè.”
O nwere ike ịbụ, “a sụgharịala ma gụọrọ m.”