Ezra 6:1-22

  • Ihe Darayọs chọpụtara nakwa iwu o nyere (1-12)

  • A rụchara ụlọ nsọ ma nyefee ya Chineke (13-18)

  • E mere Ememme Ngabiga (19-22)

6  Ọ bụ mgbe ahụ ka Eze Darayọs nyere iwu, ha wee gaa chọọ n’ụlọ ebe a na-edowe akwụkwọ dị iche iche, bụ́ ebe ndị a na-edowe akụ̀ na Babịlọn.  E wee hụ otu akwụkwọ mpịakọta n’ụlọ a rụsiri ike dị n’obodo Ekbatana, nke dị n’ógbè* Midia. Ihe e dere na ya bụ:  “N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Saịrọs, Eze Saịrọs nyere iwu banyere ụlọ Chineke dị na Jeruselem, sị:+ ‘Ka a rụghachi ụlọ ahụ ka ọ bụrụ ebe ha ga na-achụ àjà. A ga-atọkwa ntọala ya. Ọ ga-adị kubit iri isii* n’ịdị elu, dịrịkwa kubit iri isii n’obosara.+  Ọ ga-enwe ahịrị nnukwu nkume atọ na otu ahịrị osisi.+ Ka e sikwa n’akụ̀ eze kwụọ ụgwọ ihe niile a ga-emefu.+  Ka e bughachikwa arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha ndị dịbu n’ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma bute ha na Babịlọn,+ ka e wee doghachi ha n’ebe ha na-adị n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka e dosakwa ha n’ụlọ Chineke.’+  “Ugbu a, Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,* Shita-bọzenaị, na ndị unu na ha na-arụkọ ọrụ, ndị osote gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,+ unu agakwala ebe ahụ.  Unu akwụsịla ọrụ ahụ a na-arụ n’ụlọ Chineke. Gọvanọ ndị Juu na ndị okenye ndị Juu ga-arụghachi ụlọ Chineke n’ebe ọ dịbu.  Ana m enyekwa unu iwu banyere ihe unu ga-emere ndị okenye ndị Juu a maka ụlọ Chineke ha na-arụghachi: Sinụ n’akụ̀ eze,+ n’ụtụ a na-anakọta n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-akwụ ụmụ nwoke ndị a ụgwọ ihe ọ bụla ha mefuru n’egbughị oge, ka ọrụ ha ghara ịkwụsị.+  Ka a na-enyekwa ha ihe ọ bụla dị ha mkpa kwa ụbọchị n’akwụsịghị akwụsị, ya bụ, oké ehi,+ ebule,+ na ụmụ atụrụ+ maka àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Chineke nke eluigwe, ọka wit,+ nnu,+ mmanya,+ na mmanụ,+ otú ndị nchụàjà nọ na Jeruselem kwuru, 10  ka ha wee na-achụ àjà dị Chineke nke eluigwe mma ma na-ekpe ekpere ka ihe gaziere* eze na ụmụ ya.+ 11  M nyekwala iwu na onye ọ bụla dara iwu a, a ga-efopụta otu nnukwu osisi n’ụlọ ya, bulie onye ahụ elu ma kwụwa ya n’elu osisi ahụ. A ga-ejikwa ụlọ ya mere ebe ọhaneze ga na-aga mposi* maka na ọ dara iwu a. 12  Ka Chineke, onye họọrọ ka a nọrọ ebe ahụ na-eto aha ya,+ kwatuo eze ọ bụla na ndị ọ bụla nwara ịda iwu a na ibibi ụlọ Chineke ahụ dị na Jeruselem. Ọ bụ m, Darayọs, na-enye iwu a. Ka e mee ya ozugbo.” 13  Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, Shita-bọzenaị,+ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ wee mee ihe niile Eze Darayọs nyere ha n’iwu. 14  Ndị okenye ndị Juu wee na-arụ ụlọ ahụ. Ọrụ ahụ nọkwa na-aga nke ọma+ n’ihi na amụma Hagaị+ onye amụma na Zekaraya+ nwa nwa Ido nọ na-ebu gbara ha ume. Ha rụchara ya n’ihi iwu Chineke Izrel nyere ha+ nakwa nke Saịrọs+ na Darayọs+ na Eze Atazaksis+ nke Peshia nyere ha. 15  Ha rụchara ụlọ a n’abalị atọ n’ọnwa Eda,* n’afọ nke isii n’ọchịchị Eze Darayọs. 16  Ndị Izrel, ma ndị nchụàjà ma ndị Livaị+ ma ndị ọzọ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee jiri ọṅụ nyefee Chineke ụlọ a. 17  Ha chụrụ otu narị ehi (100), narị ebule abụọ (200), narị ụmụ atụrụ anọ (400) n’àjà maka inyefe Chineke ụlọ a. Ha chụkwara mkpi iri na abụọ n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie maka Izrel niile, bụ́ ole ebo Izrel dị.+ 18  Ha họpụtara ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè, họpụtakwa ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè maka ozi ha ga na-ejere Chineke na Jeruselem,+ otú e dere ya n’akwụkwọ Mosis.+ 19  Ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ.+ 20  Ndị nchụàjà na ndị Livaị niile mere onwe ha ka ha dị ọcha, ha niile wee dị ọcha.+ Ha gburu anụ e ji eme Ememme Ngabiga maka ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, maka ndị nchụàjà ibe ha, nakwa maka onwe ha. 21  Ndị Izrel ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee rie ya, ha na ndị niile sonyeere ha, bụ́ ndị sepụrụla aka n’ihe rụrụ arụ mba ndị dị n’ala ahụ na-eme, ka ha fewe* Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ 22  Ha jikwa ọṅụ mee Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ụbọchị+ asaa n’ihi na Jehova mere ka ha ṅụrịa ọṅụ. O mekwara ka eze Asiria* nwee mmasị n’ebe ha nọ,+ nke mere na o nyeere ha aka* n’ọrụ ha na-arụ n’ụlọ ezi Chineke, bụ́ Chineke Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ihe dị ka mita 26.7 (amaụkwụ 87.6). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
N’Arameik, “maka ndụ.”
O nwere ike ịbụ, “ebe a na-ekpofu ahịhịa; ikpo nsị.”
Gụọ B15.
Na Hibru, “chọọ.”
Ihe a bụ aha a na-etu Eze Darayọs nke Mbụ nke Peshia. N’oge ahụ, ọ bụ ya na-achị ebe Alaeze Asiria chịburu.
Na Hibru, “mere ka aka ha dị ike.”