Ezra 7:1-28

  • Ezra rutere Jeruselem (1-10)

  • Akwụkwọ ozi Atazaksis nyere Ezra (11-26)

  • Ezra toro Jehova (27, 28)

7  Mgbe ihe ndị a gachara, n’oge Eze Atazaksis+ nke Peshia na-achị, Ezra*+ lọtara. Ọ bụ nwa Seraya,+ nwa Azaraya, nwa Hilkaya,+  nwa Shalọm, nwa Zedọk, nwa Ahaịtọb,  nwa Amaraya, nwa Azaraya,+ nwa Mereyọt,  nwa Zerahaya, nwa Ọzaị, nwa Bọkaị,  nwa Abishua, nwa Finihas,+ nwa Elieza,+ nwa Erọn+ onyeisi nchụàjà.  Ezra a hapụrụ Babịlọn. Ọ bụ odeakwụkwọ.* Ọ makwa Iwu Mosis nke ọma,*+ nke Jehova bụ́ Chineke Izrel nyere. Eze nyere Ezra ihe niile ọ rịọrọ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya.  Ụfọdụ n’ime ndị Izrel, ndị nchụàjà, ndị Livaị,+ ndị na-abụ abụ,+ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá,+ na ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ lawara Jeruselem n’afọ nke asaa n’ọchịchị Eze Atazaksis.  Ezra rutere Jeruselem n’ọnwa nke ise, n’afọ nke asaa n’ọchịchị eze.  N’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ọ hapụrụ Babịlọn. O rutekwara Jeruselem n’abalị mbụ n’ọnwa nke ise n’ihi na Chineke ya nọnyeere ya.+ 10  Ezra kwadebere obi ya* ịmụ Iwu Jehova na ime ihe dị na ya,+ nakwa ịkụzi ntụziaka ndị dị na ya na ịkụzi ikpe ziri ezi n’Izrel.+ 11  Ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi Eze Atazaksis nyere Ezra, bụ́ onye nchụàjà na odeakwụkwọ,* onye bụ́kwa ọkà n’ịmụ iwu* Jehova na ntụziaka ndị o nyere Izrel: 12  * “Atazaksis,+ bụ́ eze ndị eze, na-asị gị, Ezra onye nchụàjà, onye na-edepụta ihe dị n’Iwu Chineke nke eluigwe: Udo dịrị gị. Ugbu a, 13  enyela m iwu ka onye ọ bụla nọ n’alaeze m bụ́ onye Izrel nke chọrọ iso gị laa Jeruselem lawa,+ ma ndị nchụàjà ha ma ndị Livaị. 14  N’ihi na eze na ndị ndụmọdụ asaa ya na-edunye gị ka ị gaa chọpụta ma ndị bi na Juda nakwa na Jeruselem hà na-eme ihe e dere n’Iwu Chineke gị nke i ji,* 15  nakwa ka i buru ọlaọcha na ọlaedo eze na ndị ndụmọdụ ya ji obi ha nye Chineke Izrel, onye bi na Jeruselem, 16  na ọlaọcha na ọlaedo niile ị na-enweta* n’ógbè niile dị na Babịlọn, na onyinye ndị gị na ndị nchụàjà ji obi ha nye maka ụlọ Chineke ha dị na Jeruselem.+ 17  Ị ga-eji ego a zụọ oké ehi,+ ebule,+ na ụmụ atụrụ+ ozugbo, zụọkwa ihe ndị ị ga-eji chụọ àjà ọka+ na àjà mmanya+ ha na ha na-agakọ. Ị ga-achụkwa ha n’àjà n’elu ebe ịchụàjà dị n’ụlọ Chineke unu na Jeruselem. 18  “Ihe ọ bụla dị gị na ụmụnne gị mma iji ọlaọcha na ọlaedo ndị fọrọ mee otú Chineke unu chọrọ, meenụ ya. 19  Arịa niile e bunyere gị maka ije ozi n’ụlọ Chineke gị, buga ha niile na Jeruselem n’ihu Chineke.+ 20  Ihe ndị ọzọ dị mkpa maka ụlọ Chineke gị, bụ́ ndị i kwesịrị inye, ị ga-esikwa n’akụ̀ eze were ha.+ 21  “Mụnwa bụ́ Eze Atazaksis enyela ndị niile na-echekwa akụ̀ eze n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis* iwu na ihe niile Ezra+ onye nchụàjà, onye na-edepụta Iwu Chineke nke eluigwe, rịọrọ unu, meenụ ya n’egbughị oge, 22  ọ bụrụgodị na o ruru otu narị (100) talent* ọlaọcha, otu narị (100) kọọ* ọka wit, otu narị (100) bat* mmanya,+ otu narị (100) bat mmanụ,+ na nnu+ hiri ezigbo nne. 23  Ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe ọ bụla Chineke nke eluigwe nyere n’iwu maka ụlọ ya,+ ka Chineke nke eluigwe ghara iwesa alaeze eze na ụmụ ya iwe.+ 24  Ana m agwakwa unu na a gaghị ana ndị nchụàjà na ndị Livaị, ndị na-abụ abụ na ndị na-akụ egwú,+ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke a, ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ. 25  “Ma gịnwa, Ezra, jiri amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị na-enyere ndị ikpe aka na ndị ikpe ka ha na-ekpe ndị niile nọ n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis ikpe, bụ́ ndị niile ma iwu Chineke gị. Kụziekwara ya onye ọ bụla na-amaghị ya.+ 26  Onye ọ bụla na-anaghị edebe Iwu Chineke gị na iwu eze, ka e mee ya ihe iwu kwuru n’egbughị oge, ma ọ̀ bụ igbu ya egbu, ma ọ̀ bụ ịchụpụ ya n’obodo, ma ọ̀ bụ iri ya iwu, ma ọ̀ bụ ịtụ ya mkpọrọ.” 27  Ka otuto dịrị Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà, onye mere ka eze nwee mmasị ịchọ ụlọ Jehova dị na Jeruselem mma.+ 28  O gosiri m na ọ hụrụ m n’anya* ma mee ka eze na ndị ndụmọdụ ya+ na ndị dike niile eze mere ndị isi meere m amara.+ Obi wee sie m ike n’ihi na Jehova bụ́ Chineke m nọnyeere m. M wee si ná ndị Izrel kpọkọta ndị isi ka ha soro m lawa Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezra pụtara “Enyemaka.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “Ọ bụ aka ochie n’idepụta Iwu Mosis.”
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “kpebiri n’obi ya.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “aka ochie n’idepụta okwu ndị dị n’iwu.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Ezra 7:12 ruo 7:26.
N’Arameik, “dị n’aka gị.”
N’Arameik, “ị na-ahụ.”
Ma ọ bụ “n’ógbè dị n’Ofe Osimiri.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ndị Netinim.” N’Arameik, “ndị e nyere n’onyinye.”
Ma ọ bụ “gosiri m ịhụnanya pụrụ iche.”