Ezra 9:1-15

  • Ndị Izrel na ndị mba ọzọ gọrọ ọgọ (1-4)

  • Ezra kpere ekpere kwupụta mmehie ndị ya (5-15)

9  Ozugbo e mechara ihe ndị a, ndị isi bịakwutere m, sị: “Ndị Izrel na ndị nchụàjà na ndị Livaị ka so ndị bi n’ala ndị a na-emekọ ihe, sorokwa ha na-eme omume rụrụ arụ ndị ha na-eme,+ ya bụ, ndị Kenan, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Jebus, ndị Amọn, ndị Moab, ndị Ijipt,+ na ndị Amọraịt.+  Ha alụrụla ụfọdụ n’ime ụmụ nwaanyị ha, lụtakwara ụmụ ha ndị nwoke.+ Hanwa, bụ́ ụmụ* dị nsọ,+ na ndị ala a agwakọtala onwe ha.+ Ndị bu omume ọjọọ a n’isi bụ ndị isi na ndị osote onye na-achị achị.”  Ozugbo m nụrụ ihe a, m dọwara uwe m na uwe elu m na-enweghị aka, fopụkwa ụfọdụ ntutu isi m na afụ ọnụ m. M wee nọrọ ọdụ n’ihi na ihe a riri m ọnụ.  Ndị niile ji okwu Chineke Izrel kpọrọ ihe* zukọtara n’ebe m nọ n’ihi ihe ọjọọ ahụ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta nọ na-eme. M nọ ọdụ ebe ahụ ruo oge e ji achụ àjà ọka ná mgbede+ n’ihi na ihe a riri m ọnụ.  N’oge ahụ e ji achụ àjà ọka ná mgbede,+ eyi m uwe m na uwe elu m na-enweghị aka m dọwara adọwa ma si n’ebe ahụ m nọ na-eru uju bilie. M gburu ikpere n’ala ma gbasaara Jehova bụ́ Chineke m aka m.  M wee sị: “Chineke m, ihere na-eme m, enweghịkwa m ike iwelite ihu m, Chineke m, n’ihi na mmehie anyị adịla ọtụtụ,* omume ọjọọ anyị eruokwala n’eluigwe.+  Malite n’oge nna nna anyị hà ruo taa, mmehie anyị dị nnọọ ọtụtụ.+ Ọ bụkwa mmehie anyị mere e ji nyefee anyị, ndị eze anyị, na ndị nchụàjà anyị n’aka ndị eze na-achị ala ndị a. E jikwa mma agha gbuo anyị,+ dọrọ anyị n’agha,+ bukọrọ ihe anyị,+ menyekwa anyị ihere, otú ọ dị taa.+  Ma Jehova bụ́ Chineke anyị, i metụụrụ anyị amara kwe ka e nwee ndị fọrọ ndụ n’ime anyị ma mee ka anyị nọrọ n’ebe obi ruru anyị ala* n’ụlọ nsọ gị,+ ka anyị wee na-enwe ezigbo obi ụtọ* ma nweretụ onwe anyị n’ohu anyị na-agba, Chineke anyị.  N’ihi na n’agbanyeghị na anyị bụ ndị ohu,+ ị hapụghị anyị, Chineke anyị, ka anyị nọrọ na-agba ohu. Kama, i gosiri anyị na ị hụrụ anyị n’anya* wee mee ka ndị eze Peshia meere anyị amara,+ ka anyị wee nweta ume ma rụghachiri gị, Chineke anyị, ụlọ gị+ n’ebe ọ dịbu, ka anyị wee nwee mgbidi e ji nkume rụọ* na Juda nakwa na Jeruselem. 10  “Ma ugbu a, Chineke anyị, gịnị ka anyị ga-ekwu n’ihe a merenụ? N’ihi na anyị ahapụla iwu gị, 11  nke i si n’ọnụ ndị amụma gị na-ejere gị ozi nye anyị, sị: ‘Ala unu na-aga iweghara bụ ala rụrụ arụ n’ihi na ndị bi na ya adịghị ọcha. Ha emeela ka omume rụrụ arụ ndị ha na-eme jupụta ebe niile n’ala ahụ.+ 12  N’ihi ya, ya enwela mgbe unu ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ụmụ ha ndị nwoke. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+ Unu emekwala ihe ga-eme ka udo dịrị ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ihe gaziere ha,+ ka unu wee dị ike ma rie ihe ọma dị n’ala ahụ ma hapụkwara ya ụmụ unu ka ọ bụrụ ihe ha ga-eketa ruo mgbe ebighị ebi.’ 13  Mgbe ihe a niile mecharala anyị n’ihi omume ọjọọ anyị na ọtụtụ mmehie anyị, (n’ihi na gị bụ́ Chineke anyị emesoghị anyị otú mmehie anyị hà,+ i kwekwara ka anyị ndị nọ n’ebe a fọ ndụ)+ 14  ànyị ga-emebi iwu gị ọzọ, anyị na ndị a na-eme omume rụrụ arụ ana-agọ ọgọ?+ Ọ̀ bụ na ị gaghị ewesa anyị oké iwe nke na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, a ghara inwe onye ga-afọ ma ọ bụ onye ga-alanahụ? 15  Jehova bụ́ Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume+ ebe ọ bụ na anyị fọrọ ndụ ruo taa. Lee, anyị bu mmehie anyị nọrọ n’ihu gị, ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị iguzo n’ihu gị n’ihi ihe a anyị mere.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Ndị na-ama jijiji n’ihi okwu Chineke Izrel.”
Na Hibru, “amụbaala n’elu isi anyị.”
Na Hibru, “ma nye anyị mkpọ́.”
Na Hibru, “ka anya anyị na-enwu gbaa.”
Ma ọ bụ “gosiri anyị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mgbidi ga-echebe anyị.”