Hosia 10:1-15

  • A ga-ebibi Izrel bụ́ osisi vaịn mebiri emebi (1-15)

    • Ịgha mkpụrụ na ịghọrọ mkpụrụ (12, 13)

10  “Izrel dị ka osisi vaịn mebiri emebi,* nke na-amịrị onwe ya mkpụrụ.+ Ka ọ na-amịkwu mkpụrụ, ka ọ na-arụkwu ebe ịchụàjà.+ Ka ala ya na-emepụtakwu ihe, ka ogidi arụsị ya na-amakwu mma.+   Obi ha dị aghụghọ.* Ugbu a, a ga-ama ha ikpe. E nwere onye ga-akwatu ebe ịchụàjà ha dị iche iche, bibiekwa ogidi ha.   Ugbu a, ha ga-asị, ‘Anyị enweghị eze,+ n’ihi na anyị atụghị egwu Jehova. Gịnịkwa ka eze ga-emere anyị?’   Ha na-ekwu ihe na-enweghị isi, na-agha ụgha, na-aṅụ iyi ụgha,+ na-agbakwa ndụ. Ikpe na-ezighị ezi ha na-ekpe dị ka ahịhịa na-egbu mmadụ nke puru ebe a kọrọ ihe.+   Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ n’ihi arụsị nwa ehi nke Bet-even.+ Ndị ya ga-eruru ya uju,Ha na ndị nchụàjà chi ala ọzọ ya, bụ́ ndị na-enwebu aṅụrị maka ya, nakwa maka ebube ya. N’ihi na a ga-esi n’ebe ha nọ dọrọ ya n’agha.   A ga-eburukwa ya gaa Asiria ka ọ bụrụ onyinye a ga-enye eze ukwu.+ A ga-emenye Ifrem ihere. Ihere ga-emekwa Izrel n’ihi ndụmọdụ ọ nabatara.+   Sameria na eze ya ga-ala n’iyi+Dị ka ome a gbajipụrụ agbajipụ nke tọgbọ n’elu mmiri.   A ga-ebibi+ ebe ndị dị elu dị na Bet-even,+ nke mere ka Izrel mehie.+ Ogwu na uke ga-etochi ebe ịchụàjà ha.+ Ndị mmadụ ga-asịkwa ugwu ukwu, ‘Kpuchie anyị!’ Sịkwa ugwu nta, ‘Dakwasị anyị!’+   Izrel, i mehiela malite n’oge a kpara arụ na Gibia.+ Ha agbanweghị àgwà ha. E bibighị ndị ajọ omume kpamkpam mgbe a lụsoro ha agha na Gibia. 10  M ga-ata ha ahụhụ mgbe m chọrọ. M ga-akpọkọta ndị dị iche iche ka ha megide ha,Mgbe a ga-ekokwasị ha mmehie abụọ ha mere.* 11  Ifrem bụ nwa ehi a zụrụ nke ọma nke ịzọcha mkpụrụ na-atọ ụtọ. Ọ bụ ya mere na emerụghị m ya ahụ́ n’olu ya mara mma. Ma ugbu a, m ga-eme ka mmadụ nọrọ n’elu Ifrem.+ Juda ga-akọ ihe. Jekọb ga-egburiri ya ala. 12  Ghaanụ ezi omume ka mkpụrụ, ghọrọkwanụ ịhụnanya. Kọọrọnụ onwe unu ala ubi+ Mgbe oge ka dị ịchọ Jehova,+Ruo mgbe ọ ga-abịa kụziere unu ihe bụ́ ezi omume.+ 13  Ma unu akọọla ihe ọjọọ otú e si akọ ubi. Unu aghọrọla ajọ omume.+ Unu eriela mkpụrụ aghụghọ,N’ihi na unu tụkwasịrị ụzọ unu obi,Tụkwasịkwa ọtụtụ ndị agha unu obi. 14  Ndị gị ga-anọ n’ọgba aghara. A ga-ebibi obodo gị ndị a rụsiri ike+Otú ahụ Shalman bibiri Bet-AbelN’ụbọchị agha, mgbe a kụgburu ụmụ nwaanyị na ụmụ ha. 15  Betel, ihe a ka a ga-eme unu,+ n’ihi ihe ọjọọ unu n’enweghị atụ. A ga-alarịrị eze Izrel n’iyi mgbe chi bọrọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “na-agbasa agbasa.”
Ma ọ bụ “na-amị amị.”
Ya bụ, mgbe ha ga-ata ahụhụ ihe ha metara dị ka hà nya yok.