Hosia 12:1-14

  • Ifrem kwesịrị ịlọghachikwute Jehova (1-14)

    • Jekọb gbasoro Chineke mgba (3)

    • Jekọb bere ákwá ka Chineke meere ya amara (4)

12  “Ifrem tụkwasịrị ihe na-abaghị uru obi.* Mgbe niile, ọ na-achụ ihe na-abaghị uru.* Ọ na-aghagbu onwe ya n’ụgha. Ihe na-agụkwa ya mgbe niile bụ tigbuo zọgbuo. Ya na Asiria agbaala ndụ.+ Ọ na-ebugakwara Ijipt mmanụ.+   Jehova na Juda nwere okwu.+ Ọ ga-eme ka Jekọb zaa ajụjụ ihe niile o metere. Ọ ga-akwụkwa ya ụgwọ ihe o metere.+   O jidere nwanne ya n’ikiri ụkwụ mgbe ọ nọ n’afọ.+ O jikwa ike ya niile gbaso Chineke mgba.+   Ya na mmụọ ozi gbara mgba, ya emerie. O bere ákwá, rịọkwa ka o meere ya amara.”+ Chineke hụrụ ya na Betel. N’ebe ahụkwa ka Chineke gwara anyị okwu.+   Jehova bụ Chineke nke ụsụụ ndị agha.+ Jehova bụ aha e ji echeta ya.+   “N’ihi ya, lọghachikwutenụ Chineke unu.+ Na-ahụnụ ndị ọzọ n’anya,* na-ekpekwanụ ikpe ziri ezi.+ Tụkwasịnụ Chineke unu obi mgbe niile.   Ma, ihe onye ahịa ji n’aka ya bụ ihe wayo e ji atụ̀ ihe. Ịghọgbu ndị mmadụ na-atọ ya ụtọ.+   Ifrem na-asịkwa, ‘N’eziokwu, abaala m ọgaranya.+ Akpatala m akụ̀.+ O nweghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụ mmehie ọ bụla ha ga-ahụ m mere n’otú niile m si na-arụgbu onwe m n’ọrụ.’   Ma, abụ m Jehova Chineke gị malite n’Ijipt.+ M ga-eme ka i biri n’ụlọikwuuOtú ị na-ebi n’oge ememme. 10  M gwara ndị amụma okwu,+Mee ka ha hụ ọtụtụ ọhụụ,Sikwa n’ọnụ ndị amụma mee ihe atụ dị iche iche. 11  Gilied na-aghọ aghụghọ,*+ na-aghakwa ụgha. Ha achụọla ehi dị iche iche n’àjà na Gilgal.+ Ebe ịchụàjà ha dịkwa ka ikpo nkume nke dị n’ubi.+ 12  Jekọb gbagara Eram.*+ Izrel+ jere ozi ebe ahụ ka ọ lụta nwaanyị.+ O lekọtakwara atụrụ ka ọ lụta nwaanyị.+ 13  Jehova ji onye amụma si n’Ijipt kpọpụta Izrel.+ O jikwa onye amụma chee ya nche.+ 14  Ifrem kpasuru Chineke ezigbo iwe.+ Ọbara ndị o gburu dị ya n’isi. Onyenwe ya ga-akwụ ya ụgwọ maka mkparị ọ kparịrị ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ọ na-achụ ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ.”
Na Hibru, “Ifrem na-eri ifufe.”
Ma ọ bụ “Na-egosinụ ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-eme anwansi.”
Ma ọ bụ “Siria.”