Hosia 13:1-16

  • Ifrem na-ekpere arụsị chefuru Jehova (1-16)

    • “Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?” (14)

13  “N’oge gara aga, ọ na-abụ Ifrem na-ekwu okwu, ndị mmadụ ana-ama jijiji. Ọ bụ onye a ma ama n’Izrel.+ Ma, ikpe mara ya n’ihi na ọ na-efe Bel.+ O wee nwụọ.   Ugbu a, ha na-emekwu mmehie,Jirikwa ọlaọcha ha na-akpụ arụsị.+ Ha na-eleru anya ala akpụ arụsị dị iche iche, nke bụ́ aka ọrụ ndị omenkà. Ha na-asị, ‘Ka ndị na-achụ àjà susuo ụmụ ehi ọnụ.’+   N’ihi ya, ha ga-adị ka ígwé ojii ụtụtụ,Dịkwa ka igirigi nke na-ekusa ngwa ngwa. Ha ga-adị ka mkpo ọka nke oké ifufe si ebe a na-azọcha ọka na-ebupụ,Dịkwa ka anwụrụ ọkụ nke si n’oghere dị n’uko ụlọ na-ekupụsị.   Ma, abụ m Jehova Chineke gị malite n’Ijipt.+ O nweghị Chi ọzọ ị ma ma e wezụga m. O nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.+   Ọ bụ m lekọtara gị n’ala ịkpa,+ ya bụ, n’ala mmiri na-anaghị ezo.   Ha rijuru afọ n’ihi na ha nwejuru nri enweju.+ Ha rijuru afọ wee dị mpako.* Ọ bụ ya mere ha ji chefuo m.+   M ga-abịakwute ha ka ọdụm.+ M ga-ezo n’akụkụ ụzọ na-eche ha ka agụ owuru.   M ga-abịakwute ha ka anụ ọhịa bea nke na-achọ ụmụ ya. M ga-adọwakwa obi ha. M ga-eri ha ebe ahụ otú ọdụm si eri anụ. Anụ ọhịa ga-adọrisị ha.   Izrel, ọ ga-ebibi gị,N’ihi na ọ bụ m, bụ́ onye na-enyere gị aka, ka i nupụụrụ isi. 10  Oleezi ebe eze gị nọ, ka o wee napụta gị n’obodo gị niile?+ Oleekwa ebe ndị na-achị* gị nọ, ndị i kwuru gbasara ha, sị,‘Nye m eze na ndị isi’?*+ 11  Eji m iwe nye gị eze.+ M ga-ejikwa iwe wepụ ya.+ 12  E kechiela mmehie Ifrem ihe.* E dowela mmehie ya. 13  Ahụ́ ga na-egbu ya mgbu otú o si egbu nwaanyị ime na-eme. Ọ bụkwa nwa na-amaghị ihe. Mgbe oge ruru ka a mụọ ya, ọ gaghị anọzi anọzi. 14  M ga-anapụta ha n’aka ili.* M ga-anapụta ha n’aka ọnwụ.+ Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?+ Ili, olee ebe ike ahụ i ji ala ndị mmadụ n’iyi dị?+ Agaghị m emetere gị ebere. 15  Ọ bụrụgodị na ọ ga-amị mkpụrụ ka ahịhịa amị,Ifufe si ebe ọwụwa anyanwụ, bụ́ ifufe Jehova, ga-abịa. Ọ ga-esi n’ọzara bịa, mịkpọọ olulu mmiri ya, mịkọrọkwa mmiri dị n’isi iyi ya. Onye ahụ ga-akwakọrọ akụ̀ ya niile bara ezigbo uru.+ 16  A ga-ama Sameria ikpe,+ n’ihi na ọ na-enupụrụ Chineke ya isi.+ A ga-eji mma agha gbuo ha.+ A ga-akụgbu ụmụ ha,Bọwaakwa ụmụ nwaanyị ha dị ime afọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “obi ha wee fụlie ha elu.”
Ma ọ bụ “ụmụ eze.”
Na Hibru, “ndị ikpe.”
Ma ọ bụ “E chekwaala mmehie Ifrem.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.