Hosia 2:1-23

  • A ga-ata ndị Izrel ahụhụ maka na ha hapụrụ Jehova (1-13)

  • Ndị Izrel ga-alọghachikwute Jehova, ya abụrụ di ha (14-23)

    • “Ị ga-akpọ m Di m” (16)

2  “Sịnụ ụmụnne unu ndị nwoke, ‘Unu bụ ndị m.’*+ Sịkwanụ ụmụnne unu ndị nwaanyị, ‘Unu bụ ndị nwaanyị e meere ebere.’*+   Bonụ nne unu ebubo. Bonụ ya ebubo,N’ihi na ọ bụghị nwunye m,+ abụghịkwa m di ya. O kwesịrị ịkwụsị ịgba akwụna.* O kwesịkwara ịkwụsị ịkwa iko.   Ma ọ́ bụghị ya, m ga-agba ya ọtọ, mee ka ọ dịrị otú ọ dị n’ụbọchị a mụrụ ya,Meekwa ka ọ dị ka ala ịkpa.M ga-eme ka ọ dị ka ala mmiri na-adịghị,Meekwa ka agụụ mmiri gụgbuo ya.   Agaghị m emere ụmụ ya ebere,N’ihi na ha bụ ụmụ a kwatara n’iko.*   N’ihi na nne ha na-agba akwụna.*+ Onye buru afọ ime ha akpaala àgwà na-eme ihere,+ n’ihi na ọ sịrị,‘M ga-agakwuru ndị mụ na ha na-eme enyi,+Ndị na-enye m nri, mmiri,Ákwà e ji ajị anụ mee, ákwà linin, mmanụ na mmanya.’   N’ihi ya, m ga-eji ogwu gbaa ụzọ ya ogige. M ga-ejikwa nkume rụchibido ya mgbidi,Ka ọ ghara ịchọta ụzọ ya.   Ọ ga-achụwa ndị ya na ha na-eme enyi, ma ọ gaghị achụkwute ha.+ Ọ ga-achọ ha, ma ọ gaghị achọta ha. Ọ ga-asịkwa, ‘M ga-alaghachikwuru di m nke mbụ,+N’ihi na ihe dịịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’+   Ọ mataghị na ọ bụ m nyere ya nri+ na mmanya ọhụrụ na mmanụ,Nakwa na ọ bụ m mere ka o nwee ọtụtụ ọlaọchaNa ọlaedo, bụ́ ndị ha ji na-efe Bel.+   N’ihi ya, m ga-agbanwe otú m si eme, nara ya nri m na-enye ya n’oge ya,Narakwa ya mmanya ọhụrụ m n’oge ya.+ M ga-anarakwa ya ákwà m e ji ajị anụ mee na ákwà linin m o ji kpuchie ọtọ ya. 10  Ugbu a, m ga-ekpughe ihe o ji bụrụ nwaanyị n’ihu ndị ya na ha na-eme enyi. O nweghịkwa onye ga-anapụta ya n’aka m.+ 11  M ga-eme ka ọ kwụsị ịṅụrị ọṅụ. M ga-emekwa ka ememme ya,+ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ya, ụbọchị izu ike ya, na oge ememme ya niile kwụsị. 12  M ga-ebibi osisi vaịn ya na osisi fig ya, bụ́ ndị o kwuru gbasara ha, sị: ‘Ihe ndị a ka ndị mụ na ha na-eme enyi ji kwụọ m ụgwọ.’ M ga-emekwa ka ha dị ka oké ọhịa. Anụ ọhịa ga-erichapụkwa ha. 13  M ga-eme ka ọ zaa ajụjụ maka ụbọchị niile ọ nọ na-achụrụ Bel àjà,+Mgbe o ji ọla ntị ya na ihe ndị o ji achọ mma na-achọ onwe ya mma, chụrụkwa ndị ya na ha na-eme enyi na-aga. Ma, ọ bụ m ka o chefuru.+ Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova na-ekwu ihe a. 14  N’ihi ya, m ga-eme ka o kweta. M ga-eduru ya gaa n’ala ịkpa. M ga-agwa ya okwu ga-eru ya n’obi. 15  M ga-enyeghachi ya ubi vaịn ya malite mgbe ahụ gawa.+ M ga-enyekwa ya Ndagwurugwu Ekọ+ ka ọ bụrụ ọnụ ụzọ ámá olileanya. Ọ ga-aza òkù ebe ahụ dị ka ọ zara n’oge ọ bụ agbọghọ,Dịkwa ka ọ zara n’ụbọchị o si n’Ijipt pụta.+ 16  N’ụbọchị ahụ kwa, mụnwa bụ́ Jehova ga-asị ya,Ị ga-akpọ m Di m, ị gaghịzi akpọ m Onyenwe m.* 17  M gaghịkwa ekwe ka ọ na-akpọ aha arụsị niile bụ́ Bel.+ A gaghịzi echeta aha ha.+ 18  N’ụbọchị ahụ, mụ na anụ ọhịa ga-agba ndụ maka ha,+Mụ na nnụnụ na ihe ndị na-arị arị* ga-agbakwa ndụ maka ha.+ M ga-ewepụ ụta na mma agha na agha n’ala ha.+ Meekwa ka obi ruo ha ala ma ha dinara ala.+ 19  M ga-ekwe nkwa ịlụ gị ruo mgbe ebighị ebi. M ga-ekwe nkwa ịlụ gị n’ezi omume na n’ikpe ziri ezi,N’ịhụnanya* nakwa n’ebere.+ 20  M ga-ekwe nkwa ịlụ gị, m gaghịkwa agharịpụ gị. Ị ga-amakwa Jehova.+ 21  N’ụbọchị ahụ, mụnwa bụ́ Jehova ga-aza òkù,M ga-aza eluigwe òkù. Eluigwe ga-azakwa ala òkù.+ 22  Ala ga-azakwa nri na mmanya ọhụrụ na mmanụ òkù.Ihe ndị a ga-azakwa Jezril* òkù.+ 23  M ga-agha ya n’ala dị ka mkpụrụ maka onwe m.+ M ga-emekwara onye a na-emereghị ebere ebere,*M ga-agwa ndị na-abụghị ndị m:* ‘Unu bụ ndị m.’+ Ha ga-asịkwa: ‘Ị bụ Chineke anyị.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji na Ho 1:9.
Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji na Ho 1:6.
Ma ọ bụ “ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “a gbatara n’akwụna.”
Ma ọ bụ “na-akwa iko.”
Ma ọ bụ “Bel m.”
Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”
Ma ọ bụ “N’ịhụnanya pụrụ iche.”
Jezril pụtara “Chineke Ga-agha Mkpụrụ.”
Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji na Ho 1:6.
Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji na Ho 1:9.