Hosia 3:1-5

  • Hosia gara kpọlata nwunye ya na-akwa iko (1-3)

  • Ndị Izrel ga-alọghachikwute Jehova (4, 5)

3  Jehova wee sị m: “Gaghachi hụ nwunye gị n’anya, onye nwoke ọzọ hụrụ n’anya na onye na-akwa iko.+ Hụ ya n’anya otú Jehova si hụ ndị Izrel n’anya+ mgbe ha na-agakwuru chi ọzọ dị iche iche,+ na-achụrụ ha keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ n’àjà.”*  M wee were mkpụrụ ego ọlaọcha iri na ise na otu homa* ọka bali na ọkara zụrụ ya.  M wee sị ya: “Ị ga-abụ nke m ruo ọtụtụ ụbọchị. Agbakwala akwụna.* Gị na nwoke ọzọ enwekwala mmekọahụ. Mụ na gị agaghịkwa enwe mmekọahụ.”  Ọ bụ n’ihi na ruo ogologo oge,* ndị Izrel ga-ebi n’enweghị eze,+ n’enweghị onyeisi, n’achụghị àjà, n’enweghị ogidi, n’enweghịkwa efọd+ na arụsị ezinụlọ.*+  E mechaa, n’oge ikpeazụ, ndị Izrel ga-alọghachi chọọ Jehova bụ́ Chineke ha,+ chọọkwa Devid bụ́ eze ha.+ Ha ga-amarakwa jijiji bịakwute Jehova ka o gosi ha ịdị mma ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ndị nke e ji efe chi ụgha.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Akwakwala iko.”
Na Hibru, “ọtụtụ ụbọchị.”
Na Hibru, “terafim.”