Hosia 5:1-15

  • A mara Ifrem na Juda ikpe (1-15)

5  ““Ndị nchụàjà,+ nụrụnụ okwu a. Ndị Izrel, ṅaakwanụ ntị. Ndị si n’ezinụlọ eze, geekwanụ ntị,Maka na ọ bụ unu ka a ga-ekpe ikpe a,N’ihi na unu bụ ọnyà e siri na Mizpa,Bụrụkwa ụgbụ e ji sie ọnyà na Tebọ.+   Ndị nupụụrụ m isi* jizi oge ha niile na-egbu* anụ e ji achụ àjà. M ga-adọkwa ha niile aka ná ntị.*   Ama m Ifrem,Izrel ezoghịkwa ezo n’anya m. Ugbu a, Ifrem, gị na ọtụtụ ụmụ nwaanyị akwaala iko.* Izrel emerụọla onwe ya.+   Omume ha ekweghị ha lọghachikwute Chineke ha,N’ihi na obi ha dị n’ịgba akwụna.*+ Ha amaghịkwa Jehova.   Ihe Izrel ji anya isi agbagidela ya akaebe.*+ Ma Izrel ma Ifrem adaala n’ihi mmehie ha. Juda esorokwala ha daa.+   Ha chị ìgwè atụrụ ha na ìgwè ehi ha gaa ịchọ Jehova,Ma ha achọtaghị ya. Ọ hapụla ha.+   Ha emechuola Jehova ihu,+N’ihi na ha amụọla ụmụ bụ́ ndị mba ọzọ.* N’ime otu ọnwa, a ga-ebibi ha na ihe ndị ha ketara.*   Fụọnụ opi+ na Gibia, fụọkwanụ opi na Rema.+ Tienụ mkpu agha na Bet-even.+ Benjamin, anyị so gị n’azụ.   Ifrem, ihe a ga-eme gị n’ụbọchị a ga-ata gị ahụhụ ga-adị egwu.+ Emeela m ka ebo niile n’Izrel mata ihe ga-emerịrị. 10  Ndị isi Juda dị ka ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ.+ M ga-awụsa ha iwe m dị ka mmiri. 11  E mekpaala Ifrem ahụ́. Ngwepịa e gwepịara ya kwesịrị ekwesị,N’ihi na o kpebisiri ike iso onye iro ya.+ 12  M ga-eri Ifrem otú egu* si erichapụ osisi,M ga-emekwa ka Juda rekasịa otú osisi si erekasị. 13  Mgbe Ifrem hụrụ ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnyá nke dị ya n’ahụ́,Ifrem gara Asiria+ zigara eze ukwu ndị ozi. Ma ọ gwọlighị unu. O melighịkwa ka ọnyá unu laa. 14  M ga-adị ka ọdụm n’anya Ifrem,M ga-adịkwa ka ọdụm siri ike n’anya ndị Juda. M ga-adọrisị ha.+ M ga-agakwa buru ha. O nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+ 15  M ga-alaghachi ebe m si ruo mgbe ha ji isi ha buru ihe ha metara. Ha ga-achọkwa ka m meere ha amara.*+ Mgbe ihe siiri ha ike, ha ga-achọ m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ndị dapụrụ adapụ.”
Ma ọ bụ “emikpuola onwe ha n’igbu.”
Ma ọ bụ “M ga-atakwa ha niile ahụhụ.”
Ma ọ bụ “gị na ndị akwụna akwaala iko.”
Ma ọ bụ “n’ịkwa iko.”
Na Hibru, “agbagidela ya akaebe n’ihu ya.”
O nwere ike ịbụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ mụtaara ha ụmụ ndị ahụ, nke mere ka ụmụ ahụ na Chineke ghara ịdị ná mma.
Ma ọ bụ “ala ha.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Na Hibru, “Ha ga-achọkwa ihu m.”