Hosia 6:1-11

  • A gwara ndị Izrel ka ha lọghachikwute Jehova (1-3)

  • Ọ naghị ete aka, ha akwụsị ịhụ Chineke n’anya (4-6)

    • Ịhụnanya ka àjà mma (6)

  • Omume ha na-eme ihere (7-11)

6  “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Jehova,N’ihi na ọ dọrisiela anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị. O tiri anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.   Ọ ga-eme ka anyị dị ndụ ma ụbọchị abụọ gachaa. N’ụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie. Anyị ga-adịkwa ndụ n’ihu ya.   Anyị ga-amara Jehova, chọsiekwa ike ịmara ya. Otú ahụ o doro anya na anyanwụ ga-awa n’ụtụtụ ka o doro anya na Chineke ga-abịakwute anyị. Ọ ga-abịakwute anyị dị ka mmiri ozuzo,Dị ka ụla mmiri nke na-ede ala.”   “Ifrem, gịnị ka m ga-eme gị? Juda, gịnị ka m ga-eme gị? Ebe ọ bụ na ịhụnanya unu* dị ka ígwé ojii ụtụtụ,Dịrịkwa ka igirigi nke na-ekusa ngwa ngwa.   Ọ bụ ya mere m ga-eji jiri ndị amụma bibie unu.+ M ga-eji okwu ọnụ m gbuo unu.+ Ikpe m ga-ekpe unu ga-enwu ka ìhè,+   N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ ịhụnanya,* ọ bụghị àjà. Ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ.+   Ma, dị ka ndị mmadụ nkịtị, ndị m emebiela ọgbụgba ndụ m.+ Ha emechuola m ihu n’ebe ahụ.   Gilied bụ obodo ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ha na-egbu ndị mmadụ* aghara aghara.+   Ndị nchụàjà na-echechi mmadụ dị ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga. Ha na-egbu mmadụ n’ụzọ gara Shikem,+N’ihi na omume ha na-eme ihere. 10  Ahụla m ihe jọgburu onwe ya n’Izrel. N’ebe ahụ ka Ifrem na-agba akwụna.+ Izrel emerụọla onwe ya.+ 11  Ma, e kwuola oge a ga-achịkọta Juda otú e si achịkọta ihe ubi n’oge a na-ewe ihe ubi. M ga-achịkọtaghachi ndị m a dọọrọ n’agha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya unu pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ebere; ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ha na-awụfu ọbara.”