Hosia 7:1-16

  • E kwuru otú omume Ifrem jọruru ná njọ (1-16)

    • Ha agaghị esili n’ụgbụ Chineke pụta (12)

7  “Mgbe ọ bụla m chọrọ ịgwọ Izrel,Mmehie Ifrem na-apụta ìhè,+Ihe ọjọọ Sameria na-eme na-apụtakwa ìhè.+ Ha na-aghọ aghụghọ.+ Ha na-abata zuo ohi, na-ebukọrọkwa ihe ndị mmadụ n’èzí.+   Ma, obi ha anaghị agwa ha na m ga-echeta ihe ọjọọ niile ha na-eme.+ Ugbu a, omume ọjọọ ha niile agbaala ha gburugburu. Ha dị n’ihu m.   Ha ji ihe ọjọọ ha eme ka eze ṅụrịa,Jirikwa aghụghọ ha eme ka ndị isi* ṅụrịa.   Ha niile bụ ndị na-akwa iko. Ha dị ka ekwú nke onye na-eme achịcha kwanyere ọkụ,Nke ọ na-akwụsị ịkwanye ọkụ malite mgbe ọ gwọchara ntụ ọka* ruo mgbe o koro eko.   N’ụbọchị eze anyị na-eme ememme, ndị isi* na-arịa ọrịa. Mmanya na-eme ka iwe ju ha obi.+ Ya na ndị na-akwa emo na-akpa.   Obi ha na-ere ọkụ dị ka ọkụ dị n’ekwú* n’ihi na naanị ihe ha na-achọ ime bụ ihe ọjọọ. N’abalị, onye na-emere ha achịcha na-ehi ụra. N’ụtụtụ, ọkụ dị n’ekwú ha na-enwusikwa ike.   Ha niile dị ọkụ ka ọkụ dị n’ekwú. Ha na-erepịakwa ndị na-achị ha.* Ndị eze ha niile adaala.+ O nweghị onye n’ime ha na-akpọku m.+   Ifrem na mba dị iche iche na-emekọ ihe.+ Ifrem dị ka keeki a na-atụgharịghị atụgharị.   Ndị ala ọzọ anapụla ya ike ya,+ ma ọ maghị. Isi achaakwala ya awọ́, ma ọ maghị. 10  Ihe Izrel ji anya isi agbaala akaebe na o mere ihe ọjọọ,+Ma ha alaghachikwurughị Jehova bụ́ Chineke ha.+ Ihe a niile emeghịkwa ka ha chọwa ya. 11  Ifrem dị ka nduru dị nzuzu nke na-enweghị uche.+ Ha akpọkuola Ijipt,+ gakwurukwa Asiria.+ 12  Ebe ọ bụla ha na-aga, m ga-eji ụgbụ m jide ha. M ga-adọdata ha otú e si adọdata nnụnụ. M ga-ata ha ahụhụ otú ahụ m gwara nzukọ ha.+ 13  Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ha si n’aka m gbapụ. A ga-ebibi ha, n’ihi na ha emehiela m. Adị m njikere ịgbapụta ha, ma ha aghagidela m ụgha.+ 14  N’agbanyeghị na ha nọ n’àkwà* ha na-etiku m,+Ha anaghị eji obi ha akpọ m ka m nyere ha aka. Ha na-egbukasị onwe ha ahụ́ ka e nye ha nri na mmanya ọhụrụ. Ha na-enupụrụ m isi. 15  N’agbanyeghị na m dọrọ ha aka ná ntị, meekwa ka ha dị ike,Ha na-enupụrụ m isi, na-akpakwa nkata ime ihe ọjọọ. 16  Ha gbanwere ndụ ha, ma ha amaliteghị ife m otú kwesịrị ekwesị. Ha dị ka ụta a na-ekwesighị ike.+ A ga-eji mma agha gbuo ndị isi* ha n’ihi na ha ji ire ha ekwu okwu ọjọọ. N’ihi ya, a ga-akwa ha emo n’Ijipt.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụmụ eze.”
Ụdị ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ọka wit na ọka bali.
Ma ọ bụ “ụmụ eze.”
O nwere ike ịbụ, “Ka ha ji aghụghọ na-abịa, obi ha dị ka ọkụ dị n’ekwú.”
Na Hibru, “ndị ikpe ha.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ụmụ eze.”