Hosia 8:1-14

  • A ga-ata ha ahụhụ maka na ha na-ekpere arụsị (1-14)

    • Ha na-agha ifufe dị ka mkpụrụ, na-aghọrọ oké ifufe mmiri (7)

    • Ndị Izrel chefuru Onye kere ha (14)

8  “Tinye opi n’ọnụ gị.+ Onye iro na-abịa ka ugo ka o megide ndị* nke mụnwa bụ́ Jehova,+ N’ihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara,+ mebiekwa iwu m.+   Ha na-etiku m, sị, ‘Chineke anyị, anyị bụ́ Izrel ma gị.’+   Izrel ajụla ihe dị mma.+ Ka onye iro chụwa ya ọsọ.   Ha emeela ndị mmadụ eze, ma ọ bụghị m gwara ha. Ha emeela ndị mmadụ ndị isi,* ma amaghị m gbasara ya. Ha ejirila ọlaọcha ha na ọlaedo ha meere onwe ha arụsị,+Nke ga-eme ka e bibie ha.+   Sameria, ajụla m nwa ehi gị.+ M na-ewesa gị iwe.+ Olee mgbe ha ga-amalite ịsacha onwe ha ka ha dị ọcha?   N’ihi na ọ bụ Izrel mere ihe a. Ọ bụ omenkà mere ya, ọ bụghị Chineke. A ga-akụri nwa ehi Sameria.   N’ihi na ọ bụ ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ. Ọ bụkwa oké ifufe mmiri ka ha ga-aghọrọ.+ E nweghị okporo ọka ga-amị ọka kara aka.*+ E nweghị ihe puru ome nke ga-emepụta ihe a ga-esi na ya nweta ntụ ọka. E nwee nke mepụtara, ndị ala ọzọ ga-elo ya.+   A ga-elo Izrel.+ Ugbu a, ha ga-adị ka arịa na-abaghị uruN’anya mba dị iche iche.+   N’ihi na ha agakwurula Asiria,+ dị ka jakị ọhịa nke nọ naanị ya. Ifrem agakwurula ndị akwụna.+ 10  Ọ bụ eziokwu na ha na-agakwuru ha ná mba dị iche iche,M ga-achịkọta ha ọnụ ugbu a. Ha ga-amalite ịta ahụhụ+ n’ihi ibu arọ eze na ndị isi* boro ha. 11  N’ihi na Ifrem arụọla ọtụtụ ebe ịchụàjà, si otú ahụ mehie.+ Ebe ịchụàjà ndị ahụ ghọrọ ebe ọ na-anọ eme mmehie.+ 12  M deere ya ọtụtụ iwu m,*Ma o weere ya ka ihe na-agbasaghị ya.+ 13  Ha na-achụ anụ n’àjà ka ọ bụrụ onyinye ha nyere m, ha na-atakwa anụ ndị ahụ. Ma, ọ naghị amasị Jehova.+ Ugbu a, ọ ga-echeta mmehie ha, taakwa ha ahụhụ maka mmehie ha.+ Ha gara ka Ijipt nyere ha aka.*+ 14  Izrel echefuola Onye kere ya,+ rụọkwa ụlọ arụsị dị iche iche.+ Juda arụọkwala ọtụtụ obodo siri ike.+ Ma m ga-etinye ọkụ n’obodo ya niile. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na nke ọ bụla n’ime ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụlọ nsọ.”
Ma ọ bụ “ụmụ eze.”
Ma ọ bụ “ọka kwụ ọtọ.”
Ma ọ bụ “ụmụ eze.”
Ma ọ bụ “ntụziaka m.”
O nwere ike ịbụ, “Ha ga-alaghachi Ijipt.”