Hosia 9:1-17

  • Chineke jụrụ Ifrem n’ihi mmehie o mere (1-17)

    • Ha nyefere chi na-asọ oyi onwe ha (10)

9  “Izrel, aṅụrịla ọṅụ.+ Enwela aṅụrị otú ndị dị iche iche na-enwe. N’ihi na ịgba akwụna* emeela ka ị hapụ Chineke gị wee kpafuo.+ Ụgwọ a na-akwụ gị maka akwụna ị na-agba n’ebe niile a na-azọcha ọka* na-amasị gị.+   Ebe a na-azọcha ọka na ebe a na-azọchapụta mmanya agaghị emepụtara ha ihe. Mmanya ọhụrụ ha agaghịzi adị.+   Ha agaghịzi ebi n’ala Jehova,+Kama, Ifrem ga-alaghachi Ijipt. Ha ga-erikwa ihe na-adịghị ọcha n’Asiria.+   Ha agaghịzi na-awụpụrụ Jehova mmanya.+ Àjà ha agaghị atọ ya ụtọ.+ Ọ dị ka nri a na-eri n’oge a na-eru uju. Ndị niile na-eri ya ga-emerụ onwe ha,N’ihi na nri ha bụ naanị maka onwe ha.* Ọ gaghị abata n’ụlọ Jehova.   Olee ihe unu ga-eme n’ụbọchị a ga-ezukọta,*N’ụbọchị ememme Jehova?   N’ihi na ha ga-agbalaga maka na ndị iro ha ga-abịa bibie ha.+ Ijipt ga-achịkọta ha ọnụ,+ Memfis ga-elikwa ha.+ Ahịhịa akụwa* ga-eweghara ihe ha ndị bara ezigbo uru e ji ọlaọcha mee. Osisi ogwu ga-ejupụtakwa n’ụlọikwuu ha.   Ụbọchị a ga-elebara ha anya ga-abịa.+ Ụbọchị a ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha metara ga-abịa. Ndị Izrel ga-ama ihe na-emenụ. Onye amụma ha ga-aghọ onye nzuzu, ara agbaakwa onye na-ekwu na Chineke gwara ya okwu. Ndị iro unu dị ọtụtụ n’ihi na mmehie unu dị ọtụtụ.”   E nwere mgbe onye nche+ Ifrem na-erubere Chineke m isi.+ Ma ugbu a, ụzọ niile nke ndị amụma ya+ dị ka ọnyà onye na-achụ nta nnụnụ. Ibu iro dị n’ụlọ Chineke ya.   Ha na-akpa àgwà ndị jọgburu onwe ha otú ndị Gibia kpara, nke ga-eme ka e bibie ha.+ Ọ ga-echeta mmehie ha, taakwa ha ahụhụ maka mmehie ha.+ 10  “Mgbe m hụrụ Izrel, ọ dị ka mgbe mmadụ hụrụ mkpụrụ vaịn n’ala ịkpa.+ Mgbe m hụrụ ndị nna nna unu, ọ dị ka mgbe mmadụ hụrụ mkpụrụ mbụ osisi fig mịrị. Ma, ha gakwuuru Bel nke Piọ.+ Ha nyefere chi na-asọ oyi* onwe ha.+ Ha ghọkwara ndị rụrụ arụ dị ka ihe ahụ ha hụrụ n’anya. 11  Ebube Ifrem ga-efepụ dị ka nnụnụ. Ha agaghị atụrụ ime, ha agaghịkwa amụ nwa.+ 12  Ọ bụrụgodị na ha azụọ ụmụ,M ga-egbugide ha ruo mgbe ha ga-agbara aka ụmụ.+ Ha ga-ata ahụhụ mgbe m ga-ahapụ ha.+ 13  Ifrem, onye a kụrụ n’ala mara mma, dị m ka Taya.+ Ugbu a, Ifrem ga-akpọpụta ụmụ ya ka e gbuo ha.” 14  Jehova, nye ha ihe ị chọrọ inye ha. Mee ka ime ọ bụla ha tụụrụ pụọ, nyekwa ha ara tara mmiri. 15  “Ihe ọjọọ ha niile dị na Gilgal,+ n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka m nọ kpọ ha asị. M ga-achụpụ ha n’ụlọ m n’ihi ajọ omume ha.+ Agaghịzi m ahụ ha n’anya.+ Ndị isi* ha niile na-eme isi ike. 16  A ga-etikpọ Ifrem.+ Mgbọrọgwụ ha ga-akpọ nkụ, ha agaghịkwa amị mkpụrụ ọ bụla. Ọ bụrụkwa na ha amụọ ụmụ, m ga-egbu ụmụ ha ha hụrụ n’anya.” 17  Chineke m ga-ajụ ha,N’ihi na ha egeghị ya ntị.+ Ha ga-agbagakwa ọsọ ndụ ná mba dị iche iche.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “maka mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “n’ụbọchị unu ji eme ememme.”
Ma ọ bụ “Ahịhịa ogwu.”
Ma ọ bụ “ihe ihere.”
Ma ọ bụ “Ụmụ eze.”