Ilu 10:1-32

  • Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ (1)

  • Onye na-arụsi ọrụ ike ga-aba ọgaranya (4)

  • Ọtụtụ okwu na-akpata mmehie (19)

  • Ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya (22)

  • Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ (27)

10  Ilu Solomọn.+ Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+Ma nwa nzuzu na-eme ka nne ya na-eru uju.   Akụ̀ e ji aghụghọ kpata agaghị aba uru,Ma ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+   Jehova agaghị ekwe ka agụụ gụgbuo onye ezi omume,+Ma ọ ga-eme ka ndị ajọ omume ghara inweta ihe na-agụsi ha ike.   Onye umengwụ ga-ada ogbenye,+Ma, onye na-arụsi ọrụ ike ga-aba ọgaranya.+   Nwa na-aghọta ihe na-achịkọta ihe ubi n’oge okpomọkụ,Ma nwa iberiibe na-anọ n’ezigbo ụra n’oge a na-ewe ihe ubi.+   A ga-agọzi onye ezi omume,+Ma okwu* onye ajọ omume na-eme ka a ghara ịmata ihe ọjọọ dị ya n’obi.   A ga-echeta onye ezi omume ma gọzie ya,+Ma aha ndị ajọ omume ga-efu.*+   Onye ma ihe ga-anabata ntụziaka* e nyere ya,+Ma onye na-ekwu okwu nzuzu ga-ala n’iyi.+   Obi ga-eru onye kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ ala,+Ma a ga-agba ihe onye aghụghọ na-eme n’anwụ.+ 10  Onye na-atabi anya iji ghọgbuo mmadụ na-eme ka ndị ọ na-aghọgbu ruwe uju,+Onye na-ekwu okwu nzuzu ga-alakwa n’iyi.+ 11  Okwu* onye ezi omume na-eme ka mmadụ dị ndụ;+ Ma okwu onye ajọ omume na-eme ka a ghara ịmata ihe ọjọọ dị ya n’obi.+ 12  Ịkpọasị na-akpata esemokwu,Ma ịhụnanya na-ekpuchi mmejọ niile.+ 13  Ihe onye na-aghọta ihe na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+Ma e mere ụtarị maka azụ onye na-enweghị uche.+ 14  Ndị ma ihe na-agbalịsi ike ka ha mụta ihe,+Ma ọnụ onye nzuzu na-etinye ya ná nsogbu.+ 15  Akụ̀ onye bara ọgaranya nwere bụụrụ ya obodo a rụsiri ike. Ịda ogbenye na-ala ndị ogbenye n’iyi.+ 16  Ihe onye ezi omume na-eme ga-eme ka ọ dị ndụ,Ma ihe onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ na-eme mmehie.+ 17  Onye na-anabata aka ná ntị a dọrọ ya na-eme ka ndị ọzọ dị ndụ,*Ma onye na-anaghị eji mba a baara ya kpọrọ ihe na-edufu ndị ọzọ. 18  Onye na-eme ka a ghara ịmata na ọ kpọrọ mmadụ asị na-agha ụgha.+ Onye na-akọsa akụkọ ọjọọ* banyere ndị ọzọ dị nzuzu. 19  Mgbe mmadụ na-ekwu ọtụtụ okwu, ọ ga-emerịrị mmehie,+Ma onye na-ejide ọnụ ya aka na-egosi na o nwere uche.+ 20  Ire onye ezi omume dị ka ọlaọcha kacha mma,+Ma obi onye ajọ omume abachaghị uru. 21  Ihe onye ezi omume na-ekwu na-abara ọtụtụ ndị uru,*+Ma onye nzuzu na-anwụ maka na o nweghị uche.+ 22  Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya,+E nweghịkwa nsogbu* ya na ya na-eso. 23  Onye nzuzu na-ewere ime omume rụrụ arụ ka egwuregwu,Ma onye na-aghọta ihe nwere amamihe.+ 24  Ihe onye ajọ omume na-atụ ụjọ ya ga-abịara ya,Ma a ga-emere ndị ezi omume ihe na-agụ ha.+ 25  Mgbe oké ifufe ga-efe, onye ajọ omume ga-ala n’iyi,+Ma onye ezi omume dị ka ntọala ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ 26  Otú ahụ mmanya gbara ụka si egbu ezé, anwụrụ ọkụ ana-afụkwa ụfụ n’anya,Ka ihe onye umengwụ na-eme si agbakasị onye dunyere ya ozi* ahụ́. 27  Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ,+Ma a ga-eme ka ndị ajọ omume ghara ịdịte ndụ aka.+ 28  Ihe ndị ezi omume na-atụ anya ya* ga-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ,+Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya agaghị enwe isi.+ 29  Ihe Jehova na-eme* na-echebe onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+Ma ọ* na-eme ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa n’iyi.+ 30  A gaghị eme ka onye ezi omume daa,+Ma ndị ajọ omume agaghịzi ebi n’ụwa.+ 31  Ihe juru onye ezi omume ọnụ bụ okwu amamihe,Ma a ga-ebepụ ire onye na-ekwu okwu ọjọọ. 32  Onye ezi omume na-ekwu ihe dị mma,Ma ihe juru ndị ajọ omume ọnụ bụ okwu ọjọọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ọnụ.”
Na Hibru, “ga-ere ure.”
Ma ọ bụ “iwu.”
Na Hibru, “Ọnụ.”
O nwere ike ịbụ, “nọ n’ụzọ nke ndụ.”
Ma ọ bụ “na-akọsa asịrị.”
Ma ọ bụ “na-eduzi ọtụtụ ndị.”
Ma ọ bụ “ihe mgbu.”
Ma ọ bụ “onye ọ na-arụrụ ọrụ.”
Ma ọ bụ “Olileanya ndị ezi omume.”
Na Hibru, “Ụzọ Jehova.”
Ya bụ, ihe Chineke na-eme.