Ilu 14:1-35
14 Nwaanyị ma ihe na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ya,+Ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya aghasa ezinụlọ ya.
2 Onye na-akwụwa aka ọtọ na-atụ egwu Jehova,Ma onye aghụghọ* na-eleda Chineke anya.
3 Okwu ọjọọ onye nzuzu na-ekwu dị ka ụtarị,Ma ihe ndị ma ihe na-ekwu ga-echebe ha.
4 N’ebe a na-enweghị ehi, ihe e ji etinyere ehi nri na-adị ọcha,Ma otú oké ehi si arụsi ọrụ ike na-eme ka ihe a na-eweta n’ubi buo ibu.
5 Onye akaebe a tụkwasịrị obi agaghị agha ụgha,Ma ụgha juru onye akaebe ụgha ọnụ.+
6 Onye na-akwa emo na-achọ ka ọ mara ihe, ma ọ naghị ama ihe.
Ma ọ na-adịrị onye na-aghọta ihe mfe ịmụta ihe.+
7 Gị na onye nzuzu emekọla ihe,N’ihi na ị gaghị amụta ihe n’ọnụ ya.+
8 Amamihe na-eme ka onye ma ihe na-aghọta ihe ọ na-eme,Ma ihe na-eduhie ndị nzuzu* bụ iberiibe ha.+
9 Ihe ọjọọ ndị iberiibe na-eme na-atọ ha ọchị,+Ma ndị ezi omume na-adị njikere idozi okwu.
10 Ọ bụ onye ihe na-ewute ma ihe na-ewute ya n’obi,Onye ọzọ enweghịkwa ike ịghọta obi ụtọ mmadụ na-enwe.
11 A ga-ebibi ụlọ ndị ajọ omume,+Ma ihe ga na-aga nke ọma n’ụlọikwuu ndị ezi omume.
12 E nwere ihe na-adị mma n’anya mmadụ,+Ma ọ na-emecha butere mmadụ ọnwụ.+
13 Mmadụ nwere ike na-achị ọchị mgbe obi na-adịghị ya mma,Onye na-aṅụrị ọṅụ nwekwara ike ruwezie uju.
14 Onye obi ya na-adịghị n’ime ihe dị mma ga-ata ahụhụ ihe ndị ọ na-eme,+Ma ezigbo mmadụ ga-eri uru ihe ndị ọ na-eme.+
15 Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru,Ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.+
16 Onye ma ihe na-akpachapụ anya, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.
Ma onye nzuzu anaghị akpachapụ anya,* ọ tụkwasịkwara onwe ya obi.
17 Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ na-ezuzu nzuzu,+Ma a kpọrọ onye na-echebara ihe echiche asị.
18 Ndị na-amaghị ihe ga-aghọ ndị nzuzu,Ma ndị ma ihe ga-amụta ihe.+
19 Ndị ọjọọ ga-akpọrọ ndị ezigbo mmadụ isiala,Ndị ajọ omume ga-akpọkwa isiala n’ọnụ ụzọ ámá ndị ezi omume.
20 Ndị mmadụ na-akpọ ogbenye asị, ndị agbata obi ya na-akpọdị ya asị.+
Ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.+
21 Onye na-eleda onye agbata obi ya anya na-eme mmehie,Ma onye na-emetere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebere na-enwe obi ụtọ.+
22 Ọ̀ bụ na ndị na-akpa nkata ọjọọ agaghị akpafu?
Ma a ga-ahụ ndị na-agbalị ka ha mee ihe dị mma n’anya, tụkwasịkwa ha obi.+
23 Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike,Ma mmadụ ịna-ekwu naanị okwu ga-eme ka ọ daa ogbenye.+
24 Mma onye ma ihe bụ akụnụba ya,Ma ndị iberiibe ga na-ezuzu naanị nzuzu.+
25 Onye akaebe nke na-ekwu eziokwu na-azọ mmadụ ndụ,Ma ihe juru onye na-aghọ aghụghọ ọnụ bụ ụgha.
26 Obi na-esi onye na-atụ egwu Jehova ezigbo ike,+Ịtụ egwu Chineke ga-echebekwa ụmụ ya.+
27 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ,Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu ga-ata isi ya.
28 Gidigidi bụ ùgwù eze,+Ma onye ọchịchị na-ala n’iyi ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ọ na-achị.
29 Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-aghọta ihe nke ọma,+Ma onye na-anaghị enwe ndidi na-egosi na ọ dị nzuzu.+
30 Ahụ́ na-adị mmadụ mma ma obi ruo ya ala,Ma anyaụfụ dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ mmadụ na-ere ure.+
31 Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-akparị Onye kere ya,+Ma onye na-emetere ogbenye ebere na-eto Onye kere ya.+
32 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ laa n’iyi,Ma a ga-echebe onye ezi omume maka na ọ kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.+
33 Onye na-aghọta ihe anaghị ekwu na ya ma ihe,+Ma onye iberiibe na-akọsa na ya ma ihe.
34 Ezi omume na-eme ka a na-akwanyere obodo ùgwù,+Ma mmehie na-eme ka ihere na-eme ndị bi na ya.
35 Eze na-enwe mmasị n’ohu ya nke na-aghọta ihe,+Ma ọ na-ewesa onye na-emechu mmadụ ihu ezigbo iwe.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ.”
^ O nwere ike ịbụ, “ihe ndị nzuzu ji eduhie ndị ọzọ.”
^ Ma ọ bụ “na-ewe iwe ọkụ.”