Ilu 15:1-33

  • Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu (1)

  • Anya Jehova na-ahụ ihe niile (3)

  • Ekpere ndị ezi omume na-eme Chineke obi ụtọ (8)

  • Atụmatụ na-aghasasị ma a gbaghị izu (22)

  • Na-atụgharị uche tupu ị zaghachi

15  Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi* zaa ya okwu,+Ma okwu ọjọọ* na-akpasu iwe.+   Ndị ma ihe na-ekwu ihe dị mma ha ma,+Ma ndị iberiibe na-ekwu okwu nzuzu.   Anya Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ na-ahụ ma ndị ọma ma ndị ọjọọ.+   Okwu ọma na-eme ka mmadụ dị ndụ,*+Ma okwu ọjọọ na-agbawa obi.   Onye nzuzu na-elelị aka ná ntị nna ya na-adọ ya,+Ma onye ma ihe na-anabata ndụmọdụ.*+   Akụ̀ na-eju n’ụlọ onye ezi omume,Ma ihe onye ajọ omume na-eme* na-akpatara ya nsogbu.+   Ihe ndị ezi omume na-ekwu na-eme ka ndị mmadụ mụta ihe,+Ma obi ndị nzuzu adịghị otú ahụ.+   Jehova kpọrọ àjà ndị ajọ omume na-achụ asị,+Ma ekpere ndị ezi omume na-ekpe na-eme ya obi ụtọ.+   Jehova kpọrọ ihe onye ajọ omume na-eme asị,+Ma ọ hụrụ onye na-agba mbọ na-eme ezi omume n’anya.+ 10  Onye na-achọghị ịnọ n’ezigbo ụzọ na-ewere aka ná ntị a na-adọ ya ka ihe ọjọọ,*+Ma onye kpọrọ mba a na-abara ya asị ga-anwụ.+ 11  Ebe ọ bụ na Jehova na-ahụ ndị nọ n’ili* nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị,*+O doro anya na ọ na-ahụ ihe dị ndị mmadụ n’obi.+ 12  Onye na-akwa mmadụ emo anaghị ahụ onye na-abara ya mba* n’anya.+ Ọ gaghị agakwuru ndị ma ihe ka ha dụọ ya ọdụ.+ 13  Ọ bụrụ na obi dị mmadụ mma, ihu na-abụ ya ọchị ọchị,Ma ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na obi adịghị ya mma.+ 14  Onye na-aghọta ihe na-agba mbọ ka ọ mụta ihe,+Ma ihe juru ndị nzuzu ọnụ bụ okwu iberiibe.+ 15  Ụbọchị niile na-abụrụ onye na-ata ahụhụ* nsogbu nsogbu,+Ma onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.+ 16  Ọ ka mma mmadụ inwe obere ihe ma ya ana-atụ egwu Jehova+Kama mmadụ inweju akụnụba ma obi anaghị eru ya ala.*+ 17  Ọ ka mma na ndị mmadụ na-eri naanị akwụkwọ nri ma hụ ibe ha n’anya+Kama ịna-ata anụ ehi gbara agba ma kpọọ ibe ha asị.+ 18  Onye na-ewe iwe ọkụ na-akpata esemokwu,+Ma onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu bie.+ 19  Ogwu juru n’ụzọ onye umengwụ,*+Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka okporo ụzọ dị larịị.+ 20  Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+Ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.+ 21  Nzuzu na-atọ onye na-enweghị uche ụtọ,+Ma onye na-aghọta ihe na-eso ezigbo ụzọ.+ 22  Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu,Ma a na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+ 23  Mmadụ na-aṅụrị ọṅụ ma ọ zata ajụjụ,+Okwu e kwuru mgbe kwesịrị ekwesị na-adịkwa ezigbo mma.+ 24  Onye na-aghọta ihe na-aga n’ụzọ na-agbago agbago nke na-eduga ná ndụ.+ Ọ naghị abanye n’ụzọ na-agbada agbada nke na-eduga n’ili.*+ 25  Jehova ga-akwatu ụlọ ndị dị mpako,+Ma ọ ga-eme ka a ghara ịkpa ala nwaanyị di ya nwụrụ aka.+ 26  Jehova kpọrọ nkata onye ọjọọ na-akpa asị,+Ma okwu ọma na-adị ya mma.+ 27  Onye ji aghụghọ akpa akụ̀ na-akpatara ezinụlọ ya nsogbu,*+Ma onye kpọrọ ịnara aka azụ asị ga na-adị ndụ.+ 28  Onye ezi omume na-atụgharị uche tupu ya azaghachi,*+Ma ndị ajọ omume na-ekwupụsị okwu ọjọọ. 29  Jehova anaghị abịa ndị ajọ omume nso,Ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.+ 30  Ihu ọchị na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. Akụkọ dị mma na-eme ka mmadụ nwee ume.*+ 31  Onye na-anabata mba a na-abara yaNa-egosi na ọ ma ihe.+ 32  Onye ọ bụla nke na-anaghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ndụ ya asị,+Ma onye ọ bụla nke na-anabata mba a na-abara ya na-aghọta ihe.+ 33  Ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Jehova, ọ ga-amụta otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ka onye ma ihe.+ Mmadụ ga-ebukwa ụzọ dị umeala n’obi tupu a kwanyere ya ùgwù.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “okwu na-agbawa obi.”
Ma ọ bụ “e jiri nwayọọ.”
Na Hibru, “bụ osisi nke ndụ.”
Ma ọ bụ “mba a na-abara ya.”
Ma ọ bụ “na-enweta.”
Ma ọ bụ “na-ewere aka ná ntị a na-adọ ya ka ịta ya nnukwu ahụhụ.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “n’Abadọn.”
Ma ọ bụ “onye na-adọ ya aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “onye obi na-adịghị mma.”
Ma ọ bụ “ma nọrọ ná mgbagwoju anya.”
Ma ọ bụ “Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige e ji osisi ogwu gbaa.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na-emechu ezinụlọ ya ihu.”
Ma ọ bụ “na-echebara ihe ọ ga-aza ezigbo echiche; na-eche echiche tupu ya ekwuo okwu.”
Na Hibru, “na-eme ka ọkpụkpụ sie ike.”