Ilu 16:1-33
16 Mmadụ na-ahazi ihe dị ya n’obi ọ ga-ekwu,Ma ọ bụ Jehova na-eme ka ọ mara ihe* ọ ga-aza.+
2 Ihe niile mmadụ na-eme na-adị mma n’anya ya,*+Ma Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi.+
3 Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova,+Ihe ndị ị chọrọ ime ga-agakwa nke ọma.
4 Jehova na-eme ka ihe niile mezuo nzube ya,Ka e wee bibie ndị ajọ omume n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.+
5 Jehova kpọrọ onye ọ bụla dị mpako asị.+
Ka obi sie gị ike na a ga-atarịrị ya ahụhụ.
6 Ịhụnanya na eziokwu na-eme ka a gbaghara mmehie,+Ịtụ egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ kwụsị ime ihe ọjọọ.+
7 Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eme dị Jehova mma,Ọ na-emedị ka onye ahụ na ndị iro ya dịrị námma.+
8 Ọ ka mma mmadụ inwe obere ihe ma bụrụ onye ezi omume+Kama mmadụ ịkpataju akụ̀ ma ya abụrụ na ọ naghị akwụwa aka ọtọ.+
9 Mmadụ nwere ike ichepụta ihe ọ ga-eme,Ma ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ ya.+
10 Eze kwesịrị ịna-ekwu ihe Chineke kpebiri.+
O kwesịghị ikpe ikpe na-ezighị ezi.+
11 Ọ bụ Jehova nwe ihe dị iche iche zuru ezu e ji atụ̀ ihe.
Ọ bụ ya mere ka e nwee ihe niile e ji atụ̀ otú ihe dịruru arọ.+
12 Ndị eze kpọrọ ajọ omume asị,+N’ihi na ọ bụ ezi omume na-eme ka ọchịchị* kwụsie ike.+
13 Obi na-atọ ndị eze ụtọ ma mmadụ kwuo ihe dị mma.
Ha hụrụ onye na-ekwu eziokwu n’anya.+
14 Iwe eze nwere ike ime ka e gbuo mmadụ,+Ma onye ma ihe na-eme ka iwe eze dajụọ.*+
15 Onye eze lere anya ọma ga-adị ndụ.
Amara ya dị ka mmiri na-ezo n’ụla mmiri.+
16 Ọ kacha mma ka mmadụ nweta amamihe kama inweta ọlaedo.+
Ọ ka mma ka mmadụ họrọ ịghọta ihe kama ịhọrọ ọlaọcha.+
17 Ndị ezi omume anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.
Onye ọ bụla nke na-echebara otú o si ebi ndụ echiche na-echebe ndụ* ya.+
18 Nganga na-ala mmadụ n’iyi,Mpako na-emekwa ka mmadụ daa.+
19 Ọ ka mma na mmadụ wedara onwe ya ala soro ndị dị umeala n’obi nọrọ+Kama mmadụ iso ndị mpako kee ihe ha kwatara.
20 Ihe ga-agaziri mmadụ ma ọ bụrụ na e nwee okwu pụtaranụ, ya akpaa àgwà gosiri na ọ na-aghọta ihe,Onye tụkwasịrị Jehova obi na-enwekwa obi ụtọ.
21 A ga-ewere onye ma ihe ka onye na-aghọta ihe.+
Onye na-ekwu okwu ọma na-ekwu ihe* na-eru mmadụ n’obi.+
22 Ịghọta ihe na-eme ka mmadụ dị ndụ,Ma ahụhụ ndị nzuzu na-ata bụ na ha ga na-ezuzu nzuzu.
23 Onye ma ihe na-echebara ihe ọ na-ekwu echiche nke ọma,+Ọ na-ekwukwa okwu otú ga-eru mmadụ n’obi.
24 Okwu ọma dị ka ezigbo mmanụ aṅụ.
Ọ na-atọ ụtọ, na-agwọkwa mmadụ.*+
25 E nwere ihe na-adị mma n’anya mmadụ,Ma ọ na-emecha butere mmadụ ọnwụ.+
26 Agụụ nke na-agụ* onye ọrụ na-eme ka ọ rụrụ ọrụ na-aga,N’ihi na ọ na-arụsi ọrụ ike ka o nweta ihe ọ ga-eri.+
27 Onye nzuzu na-akpa nkata ọjọọ.+
Okwu ya na-erekwa ka ọkụ nke na-enwusi ike.+
28 Onye okwu na ụka* na-akpata esemokwu,+Onye asịrị na-ekewakwa ndị bụ́ ezigbo enyi.+
29 Onye tigbuo zọgbuo na-arata onye agbata obi ya
Ma duba ya n’ụzọ ọjọọ.
30 Ọ na-atabi anya ya mgbe ọ na-akpa nkata ọjọọ.
Ọ na-atagide egbugbere ọnụ ya ezé ma ọ rụwa arụrụala o chepụtara.
31 Isi awọ́ bụ okpueze mara mma*+Ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-ebi ndụ dị mma.+
32 Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ+ ka dike mma,Onye na-ejide onwe ya ma iwe wewe ya kakwa onye meriri obodo mma.+
33 Mmadụ na-efe nza,*+Ma ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe niile a na-efeta na nza.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe kwesịrị ekwesị.”
^ Ya bụ, n’anya mmadụ.
^ Ma ọ bụ “ocheeze.”
^ Ma ọ bụ “na-ezere iwe eze.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “Okwu dị ụtọ.”
^ Na Hibru, “na-agwọkwa ọkpụkpụ.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “Onye na-akpa nkata ọjọọ.”
^ Ma ọ bụ “dị ebube.”
^ Na Hibru, “Ọ bụ n’apata ụkwụ ka a na-efe nza.”