Ilu 19:1-29

  • Mmadụ ghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ (11)

  • Nwaanyị na-esekarị okwu yiri elu ụlọ na-ehi mmiri (13)

  • Jehova na-enye mmadụ nwaanyị nwere uche (14)

  • Dọọ nwata aka ná ntị mgbe olileanya ka dị (18)

  • Ịnụrụ ndụmọdụ bara uru (20)

19  Ọ ka mma mmadụ ịda ogbenye ma na-eme ihe dị mma+Kama mmadụ ga-abụ onye nzuzu na onye ụgha.+   Ọ dịghị mma mmadụ ịnọ n’amaghị ihe,+Onye na-emekwa ihe n’echeghị echiche na-eme mmehie.   Ọ bụ nzuzu mmadụ na-ezuzu na-eme ka ọ na-eme ihe na-adịghị mma,Ya ewesawazie Jehova oké iwe.   Akụnụba na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ ndị enyi,Ma ndị mmadụ ga-agbara ogbenye ọsọ, enyi ya ga-agbadịrị ya ọsọ.+   A ga-atarịrị onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ahụhụ,+A ga-atakwa onye ụgha juru ọnụ ahụhụ.+   Ọtụtụ ndị na-achọ ka ha na onye a ma ama* dịrị ná mma,Mmadụ niile na-emetakwa onye na-enye onyinye enyi.   Ndị niile bụ́ ụmụnne onye dara ogbenye kpọrọ ya asị.+ Ndị enyi ya na-agbadịrị ya ọsọ.+ Ọ na-arịọ ha arịrịọ, ma e nweghị onye na-atụpụrụ ya ọnụ.   Onye na-agbalị ka ọ mara ihe* ji ndụ ya kpọrọ ihe.+ Ihe ga-agaziri onye ọ bụla na-agbalị ka ọ ghọta ihe.+   A ga-atarịrị onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ahụhụ,Onye ụgha juru ọnụ ga-alakwa n’iyi.+ 10  Ọ dịghị mma ka onye nzuzu baa ọgaranya,Ọ dịghịkwa mma ka ohu chịwa ndị isi.+ 11  Ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+A ga-ajakwa ya mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.+ 12  Eze wee iwe, iwe ya na-adị ka ebe ọdụm na-agbọ ụja,+Ma amara ya na-adị ka igirigi nke dara n’elu ahịhịa. 13  Nwa nzuzu na-akpatara nna ya nsogbu.+ Nwaanyị nke na-esekarị okwu yiri elu ụlọ nke na-ehi mmiri mgbe niile.+ 14  Ihe ụmụ na-eketa n’aka nna ha bụ ụlọ na akụ̀,Ma ọ bụ Jehova na-enye mmadụ nwunye nwere uche.+ 15  Umengwụ na-eme ka mmadụ na-ehi oké ụra,Onye umengwụ ga-anọkwa agụụ.+ 16  Onye na-edebe iwu ga-adị ndụ.+ Onye na-anaghị echebara otú o si ebi ndụ echiche ga-anwụ.+ 17  Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe,+Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.+ 18  Dọọ nwa gị aka ná ntị mgbe olileanya ka dị,+Ekwekwala ka ọ bụrụ gị ga-akpatara ya ọnwụ.+ 19  Onye na-ewe iwe ọkụ ga-ata ahụhụ iwe ọkụ ya. Ọ bụrụ na ị gbalịa napụta ya, ị ka ga-eme ya ugboro ugboro.+ 20  Nụrụ ndụmọdụ, nabatakwa aka ná ntị a na-adọ gị,+Ka i wee mara ihe n’ọdịnihu.+ 21  Mmadụ na-eme ọtụtụ atụmatụ,Ma ọ bụ uche* Jehova ga-eme.+ 22  Ọ bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo mmadụ.+ Ọ ka mma na mmadụ bụ ogbenye karịa na mmadụ bụ onye ụgha. 23  Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ.+ Obi ga-eru onye na-atụ egwu ya ala, e nweghịkwa ihe ọ bụla ga-eme ya.+ 24  Onye umengwụ na-amanye aka n’efere nri,Ma ike iwere nri tinye n’ọnụ ya adịghịdị ya.+ 25  Tie onye na-akwa emo ihe+ ka onye na-amaghị ihe mara ihe,+Baakwara onye na-aghọta ihe mba ka ọ mụtakwuo ihe.+ 26  Nwa nke na-emesi nna ya ike, nke na-achụpụkwa nne ya,Na-emenye mmadụ ihere, na-emechukwa mmadụ ihu.+ 27  Nwa m, ọ bụrụ na ị kwụsị ịnabata aka ná ntị a na-adọ gị,Ọ ga-eme ka ị kwụsị ime ihe ndị dị mma ị mụtara. 28  Onye akaebe na-anaghị ekwu eziokwu ejighị ikpe ziri ezi kpọrọ ihe,+Ime ihe ọjọọ na-atọkwa ndị ajọ omume ụtọ ka nri.+ 29  A ga-ekpe ndị na-akwa emo ikpe,+A ga na-etikwa ndị nzuzu ihe n’azụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye na-emesapụ aka.”
Ma ọ bụ “ka o nwee uche.”
Ma ọ bụ “nzube.”