Ilu 2:1-22
2 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwuMa jiri iwu m na-enye gị kpọrọ ihe,+
2 I wee gee ntị ka ị mara ihe+Ma meghee obi gị ka ị na-aghọta ihe;+
3 Ọ bụrụkwa na ị rịọ arịrịọ ka ị ghọta ihe+Ma rịọsie arịrịọ ike ka ihe wee doo gị anya;+
4 Ọ bụrụ na ị na-achọ ya otú e si achọ ọlaọcha,+Na-achọkwa ya otú e si achọ akụ̀ zoro ezo;+
5 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe ịtụ egwu Jehova pụtara,+Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.+
6 N’ihi na ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe.+
Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.
7 Ọ na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe.
Ọ bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta.+
8 Ọ na-eche ụzọ ndị na-ekpe ikpe ziri ezi nche,Ọ ga-echekwa ụzọ ndị na-erubere ya isi nche.+
9 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ,Ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.+
10 Mgbe amamihe banyere gị n’obi,+Ịmụta ihe ana-atọkwa gị* ụtọ,+
11 Ichebara ihe echiche nke ọma ga-eche gị nche,+Ịghọta ihe ga-echebekwa gị.
12 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịbanye n’ụzọ ọjọọ,Ka ị ghara ịdaba n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+
13 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị na-ahapụ ezigbo ụzọGawa n’ụzọ gbara ọchịchịrị,+
14 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị ime ihe ọjọọ na-atọ ụtọ,Ndị ịrụ arụrụala na-eme obi ụtọ,
15 Ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ,Ndị na-aghọkwa aghụghọ n’ihe niile ha na-eme.
16 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*N’aka nwaanyị na-akwa iko* nke na-eji ire ụtọ arata mmadụ,+
17 Bụ́ nwaanyị na-ahapụ enyi ọma* o nwere kemgbe ọ bụ agbọghọ,+Na-echefukwa ndụ ya na Chineke gbara.
18 N’ihi na ịga n’ụlọ ya dị ka mmadụ ịgakwuru ọnwụ,Ụzọ ụlọ ya na-edugakwa mmadụ n’ili.+
19 E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọta,Ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ na-eduga ná ndụ.+
20 N’ihi ya, soro ụzọ ndị ezigbo mmadụ,Nọrọkwa n’ụzọ ndị ezi omume.+
21 N’ihi na ọ bụ naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa,Ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta* ga-anọ na ya.+
22 Ma a ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa,+A ga-ebibikwa ndị aghụghọ nọ na ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “mkpụrụ obi gị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.
^ Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.
^ Ma ọ bụ “di.”
^ Ma ọ bụ “ndị kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”