Ilu 22:1-29

  • Inwe ezigbo aha ka inweju akụnụba mma (1)

  • E bido n’oge zụwa nwata, ọ gaghị ahapụ ihe ọ mụtara (6)

  • Onye umengwụ na-atụ ụjọ na ọdụm nọ n’èzí (13)

  • Ịdọ aka ná ntị na-eme ka nzuzu kwụsị (15)

  • Onye ma ọrụ ya nke ọma na-eguzo n’ihu ndị eze (29)

22  Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.+Ọ ka mma ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù kama inwe ọlaọcha na ọlaedo.   Ihe jikọrọ ọgaranya na ogbenye bụ naỌ bụ Jehova kere ha abụọ.+   Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo,Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.   Ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu JehovaNa-eme ka mmadụ baa ọgaranya, dịrị ndụ ma bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.+   Ogwu na ọnyà dị n’ụzọ onye aghụghọ,Ma onye ọ bụla ji ndụ ya kpọrọ ihe anaghị aga ha nso.+   Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso.+ Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.+   Ọgaranya na-achị ogbenye,Onye gbazitere ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe.+   Onye na-akụ ajọ omume ka mkpụrụ ga-aghọrọ nsogbu,+A ga-emekwa ka ike ọ na-akpa* kwụsị.+   A ga-agọzi onye na-emesapụ akaMaka na ọ na-enyetụ ogbenye nri.+ 10  Chụpụ onye na-akwa mmadụ emoKa okwu na ụka bie. Esemokwu na mkparị ga-akwụsịkwa. 11  Onye obi ya dị ọcha, nke na-ekwukwa okwu ọma,Ga-abụ enyi eze.+ 12  Jehova na-echebe onye ma ihe,Ma ọ naghị ege ntị n’okwu ndị aghụghọ.+ 13  Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’èzí! Ọ ga-adọgbu m n’ámá obodo!”+ 14  Ọnụ ụmụ nwaanyị ndị rụrụ arụ* dị ka olulu miri emi.+ Onye Jehova mara ikpe ga-adaba na ya. 15  Ụmụaka na-ezuzu nzuzu,+Ma ha ga-akwụsị izuzu nzuzu ma e jiri ụtarị dọọ ha aka ná ntị.+ 16  Onye na-erigbu ogbenye ka o wee bakwuo ọgaranya+Nakwa onye na-enye ọgaranya onyinyeGa-ada ogbenye. 17  Tọọ ntị n’ala nụrụ, geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu,+Ka i wee jiri obi gị nabata ihe m na-akụzi,+ 18  N’ihi na ọ dị mma ka i mee ka ha bamie gị n’ime ime obi,+Ka i wee na-ekwu gbasara ha mgbe niile.+ 19  M na-eme ka ị mụta ihe taa,Ka i wee tụkwasị Jehova obi. 20  E nwere ihe ndị m dere nye gị,Bụ́ ndị m ji dụọ gị ọdụ ma mee ka ị mụta ihe, 21  Ka m wee kụziere gị eziokwu,Ka i wee laghachi kọọrọ onye zitere gị ihe ndị bụ́ eziokwu. 22  Apụnarala ogbenye ihe ya maka na ọ dara ogbenye,+Emegbukwala ogbenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+ 23  N’ihi na Jehova ga-ekpechitere ha ọnụ ha,+Ọ ga-egbukwa ndị na-erigbu ha. 24  Gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpala,Gị na onye na-ewekarị iwe emekọkwala ihe, 25  Ka ị ghara ịmụta àgwà yaWee tinye onwe gị ná nsogbu.+ 26  Esola ná ndị na-ekweta* na ha ga-ana onye ọzọ n’ibé,Ndị na-ekwe nkwa na ha ga-akwụ ego onye ọzọ bitere.+ 27  Ọ bụrụ na i nweghị ihe ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,A ga-eburu àkwà* i dina na ya. 28  Ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala unu n’oge ochie azụ,Bụ́ ókè nna nna gị hà kpara.+ 29  Ọ bụrụ na mmadụ ma ọrụ ya nke ọma,Ọ ga-eguzo n’ihu ndị eze.+ Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “A ga-agbajikwa mkpanaka nke iwe ya.”
Na Hibru, “ụmụ nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.
Ma ọ bụ “na-ekwe n’aka.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”