Ilu 23:1-35
23 Ị nọdụ ala ka gị na eze rie ihe,Chebara ihe ị ga-eme echiche nke ọma.
2 Ọ bụrụ na ị na-eri oké nri,Jide akpịrị gị aka.*
3 Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,Ka o wee ghara ịbụrụ gị ọnyà.
4 Adọgbula onwe gị n’ọrụ ka ị kpata akụ̀.+
Kwụsị ime otú ahụ, kama gosi na ị na-aghọta ihe.*
5 I lee ya anya, ị ga-ahụ na ọ dịghịzi+N’ihi na ọ ga-epu nku ka ugo fega na mbara igwe.+
6 Erila nri onye aka ntagide.
Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,
7 N’ihi na ọ na-agbakọ ihe niile ị na-eri.
Ọ na-asị gị, “Rie nri, ṅụọkwa mmanya,” ma o sighị ya n’obi.
8 Ị ga-agbọ nri i riri,Ekele niile i kelere ya ga-alakwa n’iyi.
9 Agwala onye nzuzu okwu,+N’ihi na ọ gaghị eji okwu bara uru ị gwara ya kpọrọ ihe.+
10 Ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala unu n’oge ochie azụ,+Abanyekwala n’ubi ụmụ na-enweghị nna.
11 N’ihi na Onye na-agbachitere* ha siri ike.
Ọ ga-ekpechite ọnụ ha ma mesie gị ike.+
12 Jiri obi gị nabata aka ná ntị m na-adọ gị,Geekwa ntị n’okwu onye ma ihe na-ekwu.
13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+
Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ.
14 I kwesịrị ịpịa ya ụtarịKa ị zọọ ya ndụ.*
15 Nwa m, ọ bụrụ na ị mara ihe,Obi ga-adị m ụtọ.+
16 M ga-aṅụrị ọṅụ n’ime ime obi m*Mgbe i ji ọnụ gị na-ekwu ihe dị mma.
17 Enwerela ndị mmehie anyaụfụ n’ime obi gị.+
Kama, na-atụ egwu Jehova mgbe niile.+
18 I mee otú ahụ, ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu,+Ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-emekwara gị.
19 Nwa m, gee ntị ka i wee mara ihe,Duziekwa obi gị ka i wee na-eme ihe dị mma.
20 Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya,+Esokwala ná ndị na-atafe anụ ókè,+
21 N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eri oké nri ga-ada ogbenye,+Ụra ha na-ehi ga-eyiwekwa ha nkịrịka ákwà.
22 Gee nna mụrụ gị ntị,Eledakwala nne gị anya maka na o meela agadi.+
23 Zụta eziokwu, erekwala ya,+Zụtakwa amamihe na ndụmọdụ* na nghọta.+
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.
Onye ọ bụla bụ́ nna onye ma ihe ga-enwekwa obi ụtọ n’ihi nwa ya.
25 Nne gị na nna gị ga-aṅụrị ọṅụ,Nwaanyị mụrụ gị ga-enwekwa obi ụtọ.
26 Nwa m, mee ka obi gị dịrị n’ebe m nọ,Ka ime ihe ndị m kwuru na-atọkwa gị ụtọ.+
27 N’ihi na nwaanyị akwụna dị ka olulu miri emi,Nwaanyị na-akwa iko* dịkwa ka olulu mmiri dị warara.+
28 Ọ na-echechi mmadụ n’ụzọ ka onye ohi.+
Ọ na-eme ka ụmụ nwoke ndị na-eme ihe ọjọọ na-adịkwu ọtụtụ.
29 Ònye na-ata ahụhụ? Ònye ka ahụ́ na-anaghị eru ala?
Ònye na-ese okwu? Ònye na-ekpesa mkpesa?
Ònye ka ọnyá juru ahụ́ mgbe a na-etighị ya ihe? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi?
30 Ọ bụ ndị na-aṅụte mmanya aka.+
Ndị na-achọ ebe mmanya a gwara agwa dị.
31 Ekwela ka otú mmanya si acha ọbara ọbara masị gị,Ekwekwala ka otú o si egbuke egbuke n’iko na otú o si eji nwayọọ agbada n’akpịrị masị gị.
32 N’ihi na n’ikpeazụ, ọ na-ata ka agwọ,Ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala.
33 Anya gị ga na-ahụ ihe na-enweghị isi na ọdụ,Obi gị ga-emekwa ka ị na-ekwu okwu rụrụ arụ.+
34 Ọ ga-adị gị ka ì dina ala n’etiti oké osimiri,Ka à ga-asị na i dina ala n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri.
35 Ị ga-asị: “Ha etiela m ihe, ma o rughị m n’ahụ́.*
Ha kụrụ m ihe, ma amaghị m na ha kụrụ m ihe.
Olee mgbe m ga-eteta?+M ka chọrọ ịṅụ ọzọ.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Tinye mma n’akpịrị gị.”
^ O nwere ike ịbụ, “Kwụsị iso nghọta gị.”
^ Na Hibru, “Onye na-agbapụta.”
^ Na Hibru, “Ka ị napụta ya na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “Akụrụ m ga-aṅụrị ọṅụ.”
^ Na Hibru, “ịdọ aka ná ntị.”
^ Ma ọ bụ “ọ fụghị m ụfụ.”