Ilu 28:1-28
28 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ ha,Ma obi na-esi ndị ezi omume ike ka ọdụm.+
2 Mgbe ndị obodo na-emebi iwu, otu onyeisi chịtụ, ibe ya anọchie ya.+
Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-aghọta ihe nke ma ihe, otu onyeisi ga-achịte aka.+
3 Ogbenye nke na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya+Dị ka mmiri ozuzo nke na-eburu nri niile bufuo.
4 Ndị na-anaghị edebe iwu na-eto onye ajọ omume,Ma ndị na-edebe iwu na-akpọ ha asị.+
5 Ndị na-eme ihe ọjọọ enweghị ike ịghọta ikpe ziri ezi,Ma ndị na-achọ Jehova na-aghọta ihe niile.+
6 Onye dara ogbenye ma na-akwụwa aka ọtọKa ọgaranya nke na-anaghị akwụwa aka ọtọ mma.+
7 Nwa na-aghọta ihe na-edebe iwu,Ma onye ya na ndị na-eri oké nri na-akpa na-emechu nna ya ihu.+
8 Onye na-anara ọmụrụ nwa ma na-aghọ aghụghọ ka o wee kpatakwuo akụ̀+Na-akpakọtara ya onye na-emere ndị ogbenye amara.+
9 Onye na-ekweghị eme ihe iwu kwuru,Chineke ga-eweredị ekpere ya ka ihe rụrụ arụ.+
10 Onye na-eduhie ndị ezi omume ka ha wee mewe ihe ọjọọ ga-adaba n’olulu o gwuru,+Ma ihe ọma ga-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta.+
11 Ọgaranya na-eche na ya ma ihe,+Ma ogbenye nke na-aghọta ihe ga-achọpụta ụdị onye ọgaranya ahụ bụ.+
12 Ndị ezi omume merie, a na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,Ma ndị ajọ omume malite ịchị, ndị mmadụ na-aga zoo.+
13 Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya,+Ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.+
14 Onye na-akpachapụ anya* mgbe niile na-enwe obi ụtọ,Ma onye na-akpọchi obi ya ga-adaba ná nsogbu.+
15 Onye ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị onye na-enyere ha akaDị ka ọdụm na-agbọ ụja na anụ ọhịa bea nke ji ọsọ na-aga ịdọri anụ.+
16 Onye ndú nke na-enweghị uche na-emegbu ndị ọ na-edu,+Ma onye kpọrọ uru e ji aghụghọ erite asị ga-adịte ndụ aka.+
17 Onye ikpe ọbara mara maka na o gburu mmadụ ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ọ banyere n’ili.*+
Ya enwela onye ga-akwado ya.
18 A ga-azọpụta onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+Ma onye na-aghọ aghụghọ* ga-ada na mberede.+
19 Onye na-akọ ubi ya ga-enweju ihe oriri enweju,Ma onye na-achụ ihe na-abaghị uru ga-ada ezigbote ogbenye.+
20 Ọtụtụ ngọzi ga-abịara onye a tụkwasịrị obi,+Ma onye na-achọ ka ọ baa ọgaranya ngwa ngwa ga-etinyerịrị aka n’ihe ọjọọ.+
21 Ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma.+
Ma mmadụ nwere ike ime ihe ọjọọ n’ihi otu ibé achịcha.
22 Onye anyaụfụ* na-agbasi mbọ ike ka ọ baa ọgaranya,Ma ọ maghị na ọ ga-ada ogbenye.
23 E mechaa, a ga-ele onye na-abara mmadụ mba anya ọma+Karịa onye na-eto mmadụ otuto elu ọnụ.
24 Onye na-ezu nne ya na nna ya ohi ma na-asị, “Ọ bụghị ihe ọjọọ,”+Ya na onye na-ala ihe n’iyi bụ otu.+
25 Onye anyaukwu* na-akpata esemokwu,Ma ihe ga-agaziri onye tụkwasịrị Jehova obi.+
26 Onye tụkwasịrị onwe ya* obi dị nzuzu,+Ma onye na-akpa àgwà otú gosiri na ọ ma ihe agaghị abanye ná nsogbu.+
27 E nweghị ihe ga-akọ onye na-enye ogbenye ihe.+
Ma onye na-eme anya ka à ga-asị na ọ naghị ahụ ogbenye, a ga-abụ ya ọnụ.
28 Mgbe ndị ajọ omume malitere ịchị, ndị mmadụ na-ezo,Ma mgbe ha lara n’iyi, ndị ezi omume na-adị ọtụtụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Onye na-atụ egwu.”
^ Ma ọ bụ “n’olulu.”
^ Ma ọ bụ “onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ.”
^ Ma ọ bụ “Onye anyaukwu.”
^ O nwere ike ịbụ, “Onye dị mpako.”
^ Na Hibru, “obi ya.”