Ilu 31:1-31

  • OKWU EZE LEMUEL (1-31)

    • Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị? (10)

    • Ọ na-arụsi ọrụ ike (17)

    • Obiọma na-achị ire ya (26)

    • Ụmụ ya na di ya na-aja ya mma (28)

    • Mma na-ala ala (30)(30)

31  Okwu Eze Lemuel, bụ́ okwu gbara ọkpụrụkpụ nne ya gwara ya mgbe ọ na-adụ ya ọdụ:+   Nwa m, gịnị ka m ga-agwa gị? Nwa m buru n’afọ,Nwa m ji maka ya kwee nkwa,+ gịnị ka m ga-agwa gị?   Emefusịla ike gị n’ahụ́ ụmụ nwaanyị,+Ebikwala ụdị ndụ na-ala ndị eze n’iyi.+   Lemuel, eze ekwesịghị ime ihe a,Eze ekwesịghị ịṅụ mmanya,Onye na-achị achị ekwesịghịkwa ịsị, “Olee ebe mmanya m dị?”+   Ka ọ ghara ịṅụ mmanya wee chefuo ihe iwu kwuruMa napụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ihe ruuru ha.   Nyenụ ndị nọ n’ọnụ ọnwụ mmanya na-aba n’anya,+Nyekwanụ ndị obi na-adịghị mma mmanya.+   Ka ha ṅụọ mmanya wee chefuo na ha dara ogbenye;Ka ha ghara icheta nsogbu ha ọzọ.   Kwuchitere onye ogbi ọnụ ya. Gbachitere ndị niile nọ n’ọnụ ọnwụ.+   Kwuo okwu ma kpee ikpe ziri ezi. Gbachitere* ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+ א [Alef] 10  Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị?+ Ọ bara ezigbo uru karịa nkume kọral.* ב [Bet] 11  Di ya tụkwasịrị ya obi,E nweghịkwa ihe bara uru kọrọ di ya. ג [Gimel] 12  Ná ndụ ya niile,Ọ na-eji ihe ọma akwụ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ. ד [Dalet] 13  Ọ na-achọta ajị anụ na ákwà linin. Obi na-atọ ya ụtọ iji aka ya arụ ọrụ.+ ה [Hee] 14  Ọ dị ka ụgbọ mmiri nke onye na-azụ ahịa.+ Ọ na-esi n’ebe dị anya ebubata nri. ו [Wọọ] 15  Ọ na-ebilikwa mgbe chi na-abọchabeghịKwadebere ndị ezinụlọ ya ihe ha ga-eri,Nyekwa ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi òkè nke ha.*+ ז [Zayin] 16  Ọ na-eleru ala anya zụta ya. Ọ na-eji ihe ọ rụtara* akụ ubi vaịn. ח [Het] 17  Ọ na-akwadebe onwe ya maka ịrụ ọrụ siri ike,+Ọ na-emekwa ka aka sie ya ike n’ọrụ ya. ט [Tet] 18  Ọ na-achọpụta na ọ na-erite uru n’ahịa ọ na-azụ. Ọkụ* ya anaghị anyụ n’abalị. י [Yod] 19  Ọ na-eji osisi e ji akpa ákwà n’aka ya,Jirikwa mkpịsị aka ya jide mkpịsị e ji akpa ákwà.+ כ [Kaf] 20  Ọ na-enyere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya aka,Ọ na-emesapụkwara ogbenye aka.+ ל [Lamed] 21  Ọ naghị echegbu onwe ya maka ndị ezinụlọ ya n’oge oyi,N’ihi na ndị ezinụlọ ya niile yi uwe e ji achụ oyi.* מ [Mem] 22  Ọ na-eji aka ya akpa ákwà ọ na-agbasa n’elu ihe o ji edina ala.* E ji ákwà linin na ajị anụ na-acha pọpụl kpaa uwe ya. נ [Nun] 23  A ma di ya ama n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+N’ebe ya na ndị okenye obodo na-anọ ọdụ. ס [Samek] 24  Ọ na-eji ákwà linin akpa uwe* ma na-ere,Ọ na-ebugakwara ndị ahịa ájị̀* ọ kpara. ע [Ayin] 25  O siri ike, a na-akwanyekwara ya ùgwù. Ọ naghị atụ ụjọ ihe echi ga-abụ. פ [Pee] 26  Okwu ya na-egosi na ọ ma ihe.+ Iwu obiọma na-achị ire ya.* צ [Sadee] 27  Ọ na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya,Ọ naghịkwa eri nri umengwụ.+ ק [Kof] 28  Ụmụ ya na-ebili too ya. Di ya na-ebili jaa ya mma. ר [Resh] 29  E nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị bụ́ ezigbo ụmụ nwaanyị,Ma ị ka ha niile mma. ש [Shin] 30  Mma nwere ike iduhie mmadụ, nwaanyị nwekwara ike ịma mma taa, echi mma ya alaa,+Ma a ga na-aja nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova mma.+ ת [Tọọ] 31  Kwụọnụ ya ụgwọ ihe ọ na-eme,+Ka ọrụ ọ na-arụ meekwa ka e too ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Kpechite ọnụ.”
O nwere ike ịbụ, “ọrụ ha ga-arụ.”
Ma ọ bụ “ihe ọ kpatara.”
Ma ọ bụ “Oriọna.”
Na Hibru, “uwe abụọ abụọ.”
Ma ọ bụ “n’elu àkwà ya.”
Ma ọ bụ “uwe ime.”
Ya bụ, belt.
Ma ọ bụ “Ọ na-eji obiọma akụzi ihe.” Na Hibru, “Iwu ịhụnanya pụrụ iche dị n’ire ya.”