Ilu 4:1-27

  • Ezigbo ntụziaka nna nyere nwa ya (1-27)

    • Ka amamihe soro n’ihe ndị ị ga-enweta (7)

    • Zere ụzọ ọjọọ (14, 15)

    • Ìhè na-enwusikwu ike n’ụzọ ndị ezi omume (18)

    • “Chebe obi gị” (23)

4  Ụmụ m, nabatanụ aka ná ntị onye bụ́ nna na-adọ unu.+ Geenụ ntị ka unu ghọta ihe,   N’ihi na m ga-enye unu ezigbo ntụziaka. Unu ahapụla ihe m na-akụziri* unu.+   Abụụrụ m nna m ezigbo nwa,+Bụrụkwa onye nne m kacha hụ n’anya.+   Nna m kụziiri m ihe ma sị m: “Ka ihe m na-agwa gị ghara ịpụ gị apụ n’obi.+ Na-edebe iwu m ka i wee dịrị ndụ.+   Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.+ Echefula ihe m kwuru, ahapụkwala ya.   Ahapụla amamihe. Ọ ga-azọ gị ndụ. Jiri ya kpọrọ ihe. Ọ ga-echebe gị.   Nweta amamihe n’ihi na amamihe bụ ihe kacha mkpa.*+ N’ihe niile ị na-enweta, gbalịa ka nghọta soro na ha.+   Jiri amamihe kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ ga-eme ka ị bụrụ onye ukwu.+ A ga na-akwanyere gị ùgwù maka na i ji obi gị niile nabata ya.+   Ọ ga-ekpuwe gị okpu mara mma e ji okooko kpaa. Ọ ga-ekpuwe gị okpueze mara mma.” 10  Nwa m, gee ntị ma nabata ihe m na-ekwu,Ị ga-adịtekwa ndụ aka.+ 11  M ga-akụziri gị otú ị ga-esi mara ihe.+ M ga na-edu gị ka ị na-aga n’ezigbo ụzọ.+ 12  E nweghị ihe ga-anọchiri gị ụzọ mgbe ị na-eje ije. Ị gaghịkwa ada ada mgbe ị na-agba ọsọ. 13  Nabata aka ná ntị a dọrọ gị. Ajụla ya.+ Jiri ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ ga-azọ gị ndụ.+ 14  Etinyela isi n’ụzọ ndị ajọ omume,Agakwala n’ụzọ ndị ọjọọ.+ 15  Zere ya. Agala na ya.+ Abanyela na ya. Si ebe ọzọ gafere.+ 16  N’ihi na ha enweghị ike ihi ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ. Ụra anaghị atụ ha ọ gwụla ma hà kwaturu mmadụ. 17  Ihe ọjọọ na-atọ ha ụtọ ka nri,Tigbuo zọgbuo na-atọkwa ha ụtọ ka mmanya. 18  Ma ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ,Nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.+ 19  Ụzọ ndị ajọ omume yiri ọchịchịrị. Ha amaghị ihe na-akwatu ha. 20  Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m na-agwa gị. Gee ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu. 21  Echefula ha. Dowe ha n’ime ime obi gị,+ 22  N’ihi na ha na-azọ ndị na-anabata ha ndụ,+Ha na-emekwa ka ahụ́ dị ha mma. 23  N’ime ihe niile ị na-eche nche, chebe obi gị,+N’ihi na ọ bụ ya bụ isi ndụ gị. 24  Ekwula okwu na-adịghị mma,+Ekwukwala ihe ga-eduhie mmadụ. 25  Ka anya gị dịrị n’ebe ị na-aga,Na-elekwa anya n’ebe ị na-aga.+ 26  Mee ka ụzọ ị na-aga dị larịị,*+Ụkwụ ga-esikwa gị ike n’ala. 27  Abanyela n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “iwu m na-enye.”
Ma ọ bụ “bụ isi.”
O nwere ike ịbụ, “Chebara ụzọ ị na-aga echiche nke ọma.”