Ilu 5:1-23

  • Aka ná ntị a dọrọ banyere nwaanyị na-akwa iko (1-14)

  • Ka gị na nwunye gị na-aṅụrị ọṅụ (15-23)

5  Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m ji amamihe na-agwa gị. Gee ntị nke ọma n’ihe m na-akụziri gị banyere ịghọta ihe,+   Ka i wee kpachapụrụ otú i si eche echiche anyaMa na-ekwu ihe bụ́ eziokwu mgbe niile.+   N’ihi na okwu* nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* na-atọ ka mmanụ aṅụ.+ Ọ na-eji okwu ọnụ ya arafu mmadụ.*+   Ma n’ikpeazụ, nwaanyị a na-elu ilu ka ahịhịa ilu,+Ọ dịkwa nkọ ka mma agha nwere ihu abụọ.+   Ụkwụ ya na-eduga n’ọnwụ. Nzọụkwụ ya na-eduga mmadụ n’ili.*   Ọ naghị eche echiche banyere ụzọ na-eduga ná ndụ. Ọ na-agagharị, ma ọ maghị ebe ọ na-aga.   Ụmụ m, geenụ m ntị,Unu ahapụkwala ihe m na-ekwu.   Agala nwaanyị a nso. Agala nso n’ọnụ ụzọ ụlọ ya,+   Ka i wee ghara ire ùgwù gị,+Ka ị gharakwa ịta ahụhụ n’afọ niile fọrọ ná ndụ gị.+ 10  Ka ndị bịara abịa ghara irichapụ akụ̀ gị,+Ka ihe ị rụgburu onwe gị n’ọrụ nweta gharakwa ịlara ezinụlọ onye mba ọzọ. 11  Ọ bụrụ na i geghị m ntị, ị ga na-asụ ude n’ikpeazụMgbe ike na-adịghịzi gị, mgbe ahụ́ niile ga-agwụkwa gị.+ 12  I wee sị: “Ejighị m aka ná ntị a dọrọ m kpọrọ ihe. Obi m anabataghị mba a baara m. 13  Egeghị m ntị n’ihe ndị na-akụziri m ihe kwuru,Aṅaghịkwa m ndị nkụzi m ntị. 14  Ọ fọla obere ka nke m gwụN’ime ọgbakọ niile.”+ 15  Ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri* gị,Ṅụọkwa mmiri dị mma nke si n’isi mmiri gị.+ 16  Isi iyi gị ò kwesịrị ịna-asọga n’èzí? Iyi gị ò kwesịrị ịna-asọga n’ámá obodo?+ 17  Ka ọ bụrụ naanị nke gịMa ghara ịbụ nke gị na ndị bịara abịa.+ 18  Ka a gọzie isi mmiri gị. Ka gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa na-aṅụrị ọṅụ.+ 19  Ọ dị ka ọmarịcha nne ele, dịrịkwa ka ewu ọhịa mara mma.+ Ka ara ya na-eme gị obi ụtọ* mgbe niile. Ka obi na-atọ gị ụtọ mgbe niile maka na ọ hụrụ gị n’anya.+ 20  Nwa m, gịnịzi mere ị ga-eji nwee mmasị n’ebe nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* nọ? Gịnị mere ị ga-eji na-amakụ nwaanyị na-akwa iko?*+ 21  Jehova na-ahụ ihe niile mmadụ na-eme. Ọ na-eleru ihe niile mmadụ na-eme anya.+ 22  Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ ma n’ọnyà. Mmehie ọ na-eme ga-eke ya agbụ.+ 23  Ọ ga-anwụ maka na ọ nabataghị aka ná ntị a dọrọ ya,Ọ ga-akpafukwa maka na ọ dị ezigbote iberiibe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “egbugbere ọnụ.”
Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.
Na Hibru, “Ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a pụtara mmiri dị n’ihe a rụrụ n’ime ala nke mmiri na-asọba.
Ma ọ bụ “na-egbu gị ka mmanya.”
Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.
Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu Ilu 2:16.