Ilu 9:1-18

  • Ezigbo amamihe na-akpọ òkù (1-12)

    • “M ga-eme ka ị dịtee ndụ aka” (11)

  • Nwaanyị nzuzu na-akpọ òkù (13-18)

    • “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ” 17)

9  Ezigbo amamihe arụọla ụlọ ya. O gwunyela* ogidi asaa ya.   O gbuchaala anụ ya. Ọ gwaala mmanya ya. Ọ dọwala ihe dị iche iche na tebụl ya.   O zipụla ụmụ nwaanyị na-ejere ya oziKa ha nọrọ n’ebe ndị dị elu n’obodo na-akpọ ndị mmadụ òkù, sị:+   “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.” Ọ na-agwa onye na-enweghị uche, sị:   “Bịa rie nri m,Sorokwa ṅụọ mmanya m gwara agwa.   Kwụsị izuzu nzuzu* ka i wee dịrị ndụ.+ Na-ebi ndụ otú na-egosi na ị na-aghọta ihe.”*+   Onye na-adọ onye na-akwa mmadụ emo aka ná ntị na-akparị onwe ya,+Ihere ga-emekwa onye na-abara onye ajọ omume mba.   Abarala onye na-akwa mmadụ emo mba ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+ Baara onye ma ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+   Kụziere onye ma ihe ihe, ọ ga-amakwu ihe.+ Kụziere onye ezi omume ihe, ọ ga-amụtakwu ihe. 10  Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova,+Ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.+ 11  N’ihi na m ga-eme ka ị dịtee ndụ aka,+M ga-emekwa ka ị dị ogologo ndụ. 12  Ọ bụrụ na ị mara ihe, ọ bụ gị ka ọ ga-abara uru. Ma, ọ bụrụ na ị na-akwa ndị mmadụ emo, ọ bụ naanị gị ga-ata ahụhụ ya. 13  Nwaanyị nzuzu na-eme mkpọtụ.+ O nweghị uche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla. 14  Ọ na-anọrọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ya,N’oche dị n’ebe ndị dị elu n’obodo,+ 15  Na-akpọ ndị na-agafe agafe òkù,Bụ́ ndị na-agara onwe ha n’ụzọ, sị: 16  “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.” Ọ na-agwa ndị na-enweghị uche, sị:+ 17  “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ,Nri e riri na nzuzo na-adịkwa ụtọ.”+ 18  Ma ha amaghị na ụlọ ya bụ ụlọ ndị nwụrụ anwụ,Na ndị na-abanye na nke ya nọ n’ime ime ili.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ọ wapụtala.”
Ma ọ bụ “Hapụ ndị na-amaghị ihe.”
Na Hibru, “Na-eje ije n’ụzọ nghọta.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.