Akwụkwọ Ozi Jems Dere 4:1-17
4 Gịnị kpatara okwu unu na-ese na ọgụ unu na-alụ? Ọ́ bụghị maka na ihe na-achị unu bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ unu agụụ?+
2 Ọ bụ ya mere unu ji na-achọ inweta ihe, ma unu anaghị enweta ya. Unu kpọrọ ibe unu asị.* Ihe ndị ọzọ nwe na-agụkwa unu agụụ, ma unu agaghị enweta ihe ọ bụla. Unu na-alụ ọgụ, na-alụkwa agha.+ Unu enweghị ihe n’ihi na unu anaghị arịọ ihe ọ bụla.
3 Ọ bụrụkwa na unu arịọ, unu anaghị arịọta n’ihi na ihe unu na-arịọ maka ya bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ unu agụụ na ihe unu ga-eji mee ihe ọjọọ.
4 Ndị na-akwa iko,* ọ̀ bụ na unu amaghị na mmadụ bụrụ enyi ụwa, ọ ghọọla onye iro Chineke? N’ihi ya, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+
5 Ka ùnu chere na o nweghị ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ọ bụ maka na anyị nwere ike inwere ndị ọzọ anyaụfụ mere agụụ inweta ihe dị iche iche ji agụ anyị mgbe niile”?+
6 Ma, amara Chineke na-emere anyị na-enyere anyị aka ka ihe ndị ahụ kwụsị ịna-agụ anyị agụụ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke,+ ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.”+
7 N’ihi ya, na-eruberenụ Chineke isi.*+ Ma na-alụsonụ Ekwensu ọgụ.+ Ọ ga-esikwa ebe unu nọ gbapụ.+
8 Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.+ Ndị mmehie, meenụ ka aka unu dị ọcha.+ Ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme, meenụ ka obi unu dị ọcha.+
9 Ruonụ uju, beekwanụ ákwá.+ Unu ekwesịghị ịna-achị ọchị, kama unu kwesịrị ịna-eru uju. Unu ekwesịghịkwa ịna-aṅụrị ọṅụ, kama obi kwesịrị ịna-ajọ unu njọ.
10 Wedanụ onwe unu ala otú Jehova* chọrọ.+ Ọ ga-ebulikwa unu elu.+
11 Ụmụnna m, kwụsịnụ ikwutọ ibe unu.+ Onye ọ bụla nke na-ekwutọ nwanna ya ma ọ bụ na-ekpe nwanna ya ikpe na-ekwutọ iwu Chineke, na-asịkwa na ọ dịghị mma. Ma ọ bụrụ na ị na-asị na iwu Chineke adịghị mma, ị naghị edebe ya, kama ị bụ onyeikpe.
12 E nwere naanị otu onye, bụ́ Onye na-enye iwu na Onyeikpe,+ onye nwere ike ịzọpụta mmadụ, nweekwa ike ibibi mmadụ.+ Ma, ònye ka ị bụ mere ị ga-eji na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?+
13 Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị na-asị: “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-eje obodo dị otú a, nọọ otu afọ ebe ahụ, zụọ ahịa, ritekwa uru,”+
14 ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu dị ka alụlụụ nke ọ na-abụ, ya pụta, obere oge a gaghịzi ahụ ya.+
15 Kama ikwu otú ahụ, unu kwesịrị ịsị: “Ọ bụrụ uche Jehova,*+ anyị ga-adị ndụ mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.”
16 Ma ugbu a, unu na-akpa nganga, na-etukwa ọnụ. Ụdị ọnụ a unu na-etu adịghị mma.
17 N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ma otú ọ ga-esi mee ihe dị mma ma o meghị ya, o mehiela.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “na-egbu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “Ndị na-anaghị erubere Chineke isi.”
^ Ma ọ bụ “na-edonụ onwe unu n’okpuru Chineke.”