Jenesis 21:1-34

  • A mụrụ Aịzik (1-7)

  • Ishmel ji Aịzik na-eme ihe ọchị (8, 9)

  • A chụpụrụ Hega na Ishmel (10-21)

  • Ndụ Ebreham na Abimelek gbara (22-34)

21  Jehova chetara Sera otú o kwuru. Jehova meere Sera ihe o kwere ná nkwa.+  Sera wee dị ime,+ mụọrọ Ebreham nwa nwoke mgbe Ebreham merela agadi. Ọ mụrụ nwa ahụ kpọmkwem n’oge Chineke kwere ya nkwa na Sera ga-amụ nwa.+  Ebreham gụrụ nwa ya nwoke a mụrụ ọhụrụ Aịzik, bụ́ nwa Sera mụụrụ ya.+  Ebreham wee bie Aịzik nwa ya nwoke úgwù n’ụbọchị nke asatọ, otú Chineke nyere ya n’iwu.+  Ebreham dị otu narị (100) afọ mgbe a mụụrụ ya Aịzik.  Sera wee sị: “Chineke emeela ka m chịa ọchị. Onye ọ bụla nụrụ ya ga-eso m chịa ọchị.”*  Ọ sịkwara: “Ònye gaara agwa Ebreham, sị, ‘Sera ga-enye nwa ara?’ Ma, amụtarala m ya nwa nwoke mgbe o merela agadi?”  Aịzik toro, a kwụsị ya ara. Ebreham wee mee nnukwu oriri n’ụbọchị a kwụsịrị ya ara.  Ma, Sera nọ na-ahụ na nwa Hega+ onye Ijipt, bụ́ nwa Hega mụụrụ Ebreham, ji Aịzik na-eme ihe ọchị.+ 10  O wee gwa Ebreham, sị: “Chụpụ ohu nwaanyị a na nwa ya n’ihi na nwa ohu nwaanyị a agaghị eso Aịzik nwa m keta akụnụba gị.”+ 11  Ma ihe ahụ o kwuru gbasara nwa ahụ wutere nnọọ Ebreham.+ 12  Chineke wee sị Ebreham: “Ekwela ka ihe ọ bụla Sera na-agwa gị banyere nwa ahụ nakwa banyere ohu gị nwaanyị wute gị. Gee ya ntị, n’ihi na ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.+ 13  Ma m ga-eme ka nwa ohu nwaanyị+ ahụ bụrụ mba,+ n’ihi na ọ bụ nwa* gị.” 14  Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ were achịcha na karama akpụkpọ mmiri nye Hega. Ọ tụkwasịrị ihe ndị a n’ubu Hega ma chụpụ ya na nwata nwoke ahụ.+ Hega wee gawa, na-agagharị n’ala ịkpa Bia-shiba.+ 15  N’ikpeazụ, mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụrụ. O wee hapụ nwata nwoke ahụ n’okpuru otu n’ime osisi ndị dị n’ebe ahụ. 16  Ọ pụwara gaa nọdụ ala naanị ya n’ebe dịtụ anya,* maka na ọ sịrị: “Achọghị m ịhụ mgbe nwata a ga-anwụ.” N’ihi ya, ọ nọdụrụ ala n’ebe dịtụ anya malite ibesi ákwá ike. 17  Chineke nụrụ olu nwata nwoke ahụ.+ Mmụọ ozi Chineke wee si n’eluigwe kpọọ Hega òkù, sị ya:+ “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu n’ihi na Chineke anụla olu nwata nwoke ahụ n’ebe ahụ ọ nọ. 18  Bilie, kulite nwata nwoke ahụ, jidekwa ya aka, n’ihi na m ga-eme ka ọ bụrụ nnukwu mba.”+ 19  Chineke wee meghee anya ya, ya ahụ olulu mmiri. Ọ gara gbanye mmiri na karama akpụkpọ ahụ, nye nwa ya nwoke, ya aṅụọ. 20  Chineke nọnyeere nwata nwoke ahụ+ mgbe ọ na-eto. O biri n’ala ịkpa, mechaakwa bụrụ onye na-agba ụta. 21  Ọ gara biri n’ala ịkpa Peran.+ Nne ya wee lụtara ya nwaanyị n’Ijipt. 22  N’oge ahụ, Abimelek na Faịkọl, onyeisi ndị agha ya, sịrị Ebreham: “Chineke na-anọnyere gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.+ 23  N’ihi ya, jiri aha Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị aghọ mụ na ụmụ m na ụmụ ụmụ m aghụghọ nakwa na ị ga-egosi mụ na ndị obodo m, ndị bi n’ala a i bi, na ị hụrụ anyị n’anya* otú m gosiri gị.”+ 24  Ebreham wee sị: “M na-aṅụrụ gị iyi.” 25  Ma, Ebreham gwara Abimelek banyere olulu mmiri ndị na-ejere Abimelek ozi weghaara n’ike.+ 26  Abimelek sịrị: “Amaghị m onye mere ihe a. Ị kọrọghị m banyere ya. Ọ bụ taa i kwuru ya ka m na-anụ ya.” 27  Ebreham wee kpụrụ atụrụ na ehi kpụnye Abimelek, ha abụọ agbaa ndụ. 28  Mgbe Ebreham si n’ìgwè atụrụ kpụpụta nne atụrụ asaa iche, 29  Abimelek sịrị Ebreham: “Gịnị mere i ji kpụpụta nne atụrụ asaa ndị a iche?” 30  O wee sị: “Ị ga-anara m nne atụrụ asaa ndị a ka ha bụrụ ihe àmà na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” 31  Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Bia-shiba,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha abụọ ṅụrụ iyi. 32  Ha wee gbaa ndụ+ na Bia-shiba. Mgbe ha gbachara ndụ, Abimelek na Faịkọl, onyeisi ndị agha ya, biliri laghachi n’ala ndị Filistia.+ 33  Mgbe e mechara, Ebreham kụrụ osisi tamarisk na Bia-shiba ma nọrọ n’ebe ahụ kpọkuo aha Jehova,+ bụ́ Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 34  Ebreham wee biri* n’ala ndị Filistia ruo ogologo oge.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ga-achị m ọchị.”
Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “n’ebe akụ́ ụta ga-eru ma a gbapụ ya.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ọ ga-abụ na Bia-shiba pụtara “Olulu Mmiri Ịṅụ Iyi; Olulu Mmiri Asaa.”
Ma ọ bụ “bụrụ onye mbịarambịa.”
Na Hibru, “ọtụtụ ụbọchị.”