Jenesis 22:1-24

  • A gwara Ebreham ka ọ chụọ Aịzik n’àjà (1-19)

    • A ga-esi n’aka nwa Ebreham gọzie mba niile (15-18)

  • Ezinụlọ Ribeka (20-24)

22  Mgbe ihe ndị a mechara, ezi Chineke nwalere Ebreham.+ Ọ kpọrọ ya òkù, sị: “Ebreham!” ya azaa ya, sị: “Lee m!”  Chineke wee sị ya: “Biko, kpọrọ Aịzik+ nwa gị nwoke, otu mkpụrụ nwa ị mụrụ, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu,+ gaa n’ala Moraya.+ Jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ahụ, n’otu n’ime ugwu m ga-egosi gị.”  Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ dokwasị ihe e ji anọ ọdụ n’elu jakị ya, kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere ya ozi, kpọrọkwa Aịzik nwa ya. Ọ wara nkụ ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. O biliziri gawa n’ebe ahụ ezi Chineke gwara ya.  N’ụbọchị nke atọ, Ebreham leliri anya ma nọrọ n’ebe dị anya hụ ebe ahụ ọ na-aga.  Ebreham sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Unu na jakị a nọrọ ebe a ka mụ na nwa m nwoke gaa n’ebe ahụ fee Chineke. E mechaa, anyị ga-alọghachikwute unu.”  Ebreham wee bo Aịzik nwa ya nkụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ ma were ọkụ* na mma, ha abụọ esoro na-aga.  Aịzik wee sị Ebreham nna ya: “Nna m,” ya azaa ya, sị: “Ee, nwa m.” Aịzik wee sị: “Anyị ji ọkụ, anyị bukwa nkụ, oleekwanụ atụrụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ?”  Ebreham wee sị: “Nwa m, ọ bụ Chineke ga-eweta atụrụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.”+ Ha abụọ wee soro na-aga.  N’ikpeazụ, ha rutere n’ebe ahụ ezi Chineke gwara ya ka ọ gaa. Ebreham wee rụọ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma hazie nkụ ahụ n’elu ya. O kere Aịzik nwa ya eriri ụkwụ na aka ma kukwasị ya n’elu nkụ ahụ o dokwasịrị n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 10  Ebreham matịziri aka were mma ahụ ka o gbuo nwa ya.+ 11  Ma mmụọ ozi Jehova si n’eluigwe kpọọ ya òkù, sị: “Ebreham, Ebreham!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 12  O wee sị ya: “Emerụla nwa ahụ ahụ́, emekwala ya ihe ọ bụla, n’ihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke ebe ọ bụ na ị jụghị inye m nwa gị nwoke, bụ́ otu mkpụrụ nwa ị mụrụ.”+ 13  Ebreham wee lelie anya hụ ebule mpi ya konyere n’osisi. Ebreham gara kpụrụ ebule ahụ, jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ kama ịchụ nwa ya nwoke n’àjà. 14  Ebreham kpọrọ ebe ahụ Jehova-jaịre.* Ọ bụ ya mere a ka ji ekwu ruo taa, sị: “Jehova ga-eweta ihe ndị a chọrọ n’ugwu ya.”+ 15  Mmụọ ozi Jehova wee si n’eluigwe kpọọ Ebreham òkù nke ugboro abụọ, 16  sị: “Jehova sịrị, ‘Eji m onwe m na-aṅụ iyi+ na ebe ọ bụ na i mere ihe a, ị jụghịkwa inye m nwa gị nwoke, bụ́ otu mkpụrụ nwa ị mụrụ,+ 17  n’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe nakwa ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Nwa* gị ga-ewegharakwa obodo* ndị iro ya.+ 18  M ga-esi n’aka nwa* gị+ gọzie mba niile dị n’ụwa n’ihi na i gere m ntị.’”+ 19  Mgbe e mechara, Ebreham laghachikwutere ndị na-ejere ya ozi. Ha wee bilie soro Ebreham laghachi Bia-shiba,+ birikwa n’ebe ahụ. 20  Mgbe ihe ndị a mechara, e ziri Ebreham ozi, sị: “Milka amụọkwarala Nehọ nwanne gị nwoke ụmụ ndị nwoke:+ 21  Nwa nke mbụ bụ Ọz. Nke na-eso ya bụ Bọz, ndị nke ọzọ abụrụ Kemuel (nna Eram), 22  Kised, Hezọ, Pildash, Jidlaf, na Betuel.”+ 23  Betuel bụ nna Ribeka.+ Ọ bụ mmadụ asatọ ahụ ka Milka mụụrụ Nehọ nwanne Ebreham. 24  Ruma, bụ́ iko nwaanyị Nehọ, mụkwaara Nehọ ụmụ nwoke. Ha bụ: Tiba, Geham, Tehash, na Meaka.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ icheku ọkụ ka a na-ekwu.
Jehova-jaịre pụtara “Jehova Ga-eweta; Jehova Ga-ahụ Maka Ya.”
Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Na Hibru, “ọnụ ụzọ ámá.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”