Jenesis 38:1-30

  • Juda na Tema (1-30)

38  N’oge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa maa ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe otu nwoke Adọlam bi. Aha nwoke ahụ bụ Haịra.  Juda hụrụ nwa nwaanyị otu nwoke Kenan+ n’ebe ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Shua. Juda wee lụọ nwa ya nwaanyị ahụ, ya na ya enwee mmekọahụ.  Nwaanyị ahụ wee dị ime, mechaa mụọ nwa nwoke. Juda wee gụọ ya Ea.+  Ọ dịkwara ime ọzọ ma mụọ nwa nwoke wee gụọ ya Onan.  Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ ma gụọ ya Shila. Ha* nọ n’Akzib+ mgbe ọ mụrụ nwa ahụ.  Ka oge na-aga, Juda lụtaara Ea, ọkpara ya, nwaanyị. Aha nwaanyị ahụ bụ Tema.+  Ma àgwà Ea, ọkpara Juda, adịghị Jehova mma. Jehova wee gbuo ya.  N’ihi ya, Juda gwara Onan, sị: “Gị na nwunye nwanne gị nwee mmekọahụ. Kuchie ya ka ị mụtara nwanne gị nwoke nwa.”+  Ma Onan ma na nwa ọ ga-amụta agaghị abụ nke ya.+ N’ihi ya, mgbe ya na nwunye nwanne ya na-enwe mmekọahụ, ọ na-anyụfusị ọbara ọcha ya n’ala ka o wee ghara ịmụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 10  Ihe ahụ o mere dị njọ n’anya Jehova. N’ihi ya, o gbukwara ya.+ 11  Juda sịziri Tema, nwunye nwa ya: “Biri n’ụlọ nna gị, alụkwala di ọzọ, ruo mgbe Shila nwa m toro.” Juda gwara ya ihe a maka na o kwuru n’obi ya, sị: “Shila nwekwara ike ịnwụ otú ụmụnne ya nwụrụ.”+ N’ihi ya, Tema gara biri n’ụlọ nna ya. 12  Mgbe obere oge gafere, nwunye Juda, bụ́ nwa Shua,+ nwụrụ. Juda wee ruoro ya uju. Mgbe Juda ruchaara ya uju, ọ gawara Timna,+ n’ebe ndị na-akpachara ya ajị atụrụ nọ. Ya na Haịra enyi ya, onye Adọlam,+ so gaa. 13  A kọọrọ Tema, sị: “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha ajị atụrụ ya.” 14  N’ihi ya, o yipụrụ ákwà o yi na-eruru di ya uju, yiri ákwà ọzọ, jirikwa ákwà kpuchie onwe ya ka a ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ gaziri nọrọ ọdụ n’ebe e si abanye Eneyim. Eneyim dị n’ụzọ gara Timna. Ihe mere Tema ji mee ihe a bụ na ọ hụrụ na Shila etoola, ma nna di ya akpọrọghị ya kpọnye Shila ka ọ lụwa ya.+ 15  Mgbe Juda hụrụ Tema, o chere ozugbo na ọ bụ nwaanyị akwụna maka na o ji ákwà kpuchie ihu ya. 16  N’ihi ya, ọ gakwuuru ya n’akụkụ ụzọ, sị ya: “Biko, ka mụ na gị nwee mmekọahụ,” n’ihi na ọ maghị na ọ bụ nwunye nwa ya.+ Ma, Tema jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị ga-enye m ka mụ na gị nwee mmekọahụ?” 17  Juda wee sị ya: “M ga-esi n’ìgwè anụ m kpụtara gị nwa ewu.” Ma Tema jụrụ ya, sị: “Ị̀ ga-enye m ihe ibé ka m jide ruo mgbe ị ga-akpụnye m ya?” 18  Juda jụziri ya, sị: “Olee ihe ibé ị chọrọ ka m nye gị?” Tema zara ya, sị: “Mgbaaka i ji aka ihe akara+ na eriri gị na mkpara i ji n’aka.” O wee chịrị ha chịnye ya. Ya na ya nwere mmekọahụ, o wee dị ime. 19  Tema biliziri lawa gaa yipụ ákwà ahụ ma yiri ákwà o ji na-eruru di ya uju. 20  Juda dunyere enyi ya, onye Adọlam,+ ka ọ gaa kpụgara nwaanyị ahụ nwa ewu ahụ ma nata ya ihe ibé ahụ. Ma enyi ya ahụghị nwaanyị ahụ. 21  Enyi ya jụrụ ndị obodo nwaanyị ahụ, sị: “Olee akwụna ahụ* nke na-anọ n’akụkụ ụzọ Eneyim?” Ma ha sịrị ya: “E nwetụbeghị akwụna n’ebe a.” 22  N’ikpeazụ, enyi Juda laghachikwuuru Juda, sị ya: “Ahụghị m nwaanyị ahụ. Ndị obodo ahụ sịkwara na e nwetụbeghị akwụna n’ebe ahụ.” 23  N’ihi ya, Juda sịrị: “Hapụ ya ka o werewe ihe ndị ahụ ka anyị ghara ibutere onwe anyị mkparị. A sị ka e kwuwe, m kpụnyere gị nwa ewu a ka ị gaa kpụnye ya, ma ị hụghị ya.” 24  Ma mgbe ihe dị ka ọnwa atọ gachara, a kọọrọ Juda, sị: “Tema nwunye nwa gị agbaala akwụna, ọ tụrụkwala ime n’akwụna ọ gbara.” Juda wee sị: “Kpọpụtanụ ya ka a kpọọ ya ọkụ.”+ 25  Mgbe a na-akpọpụta ya, o zigaara nna di ya ozi, sị: “Ọ bụ nwoke nwe ihe ndị a tụwara m ime.” Ọ sịkwara: “Biko, leruo ihe ndị a anya ka ị mata onye nwe ha, ya bụ, mgbaaka e ji aka ihe akara na eriri na mkpara.”+ 26  Juda wee leruo ha anya, sị: “Ọ bụ onye ezi omume karịa m maka na akpọrọghị m ya kpọnye Shila nwa m.”+ Juda na Tema enweghịkwa mmekọahụ ọzọ. 27  Mgbe oge ruru ka ọ mụọ nwa, ọ bụ ejima ka o bu n’afọ. 28  Mgbe ọ na-amụ nwa, otu n’ime ụmụ ya sepụtara aka ya. Ozugbo ahụ, nwaanyị na-aghọ́ nwa kere ya ibé ákwà na-acha uhie uhie n’aka, sị: “Ọ bụ onye a bu ụzọ pụta.” 29  Ma ozugbo nwa ahụ seere aka ya, nwanne ya nwoke pụtara. Nwaanyị na-aghọ́ nwa wee tie mkpu, sị: “Legodị otú ahụ́ nne gị si gbawaa mgbe ị na-apụta!” N’ihi ya, a gụrụ ya Pirez.*+ 30  Mgbe e mechara, nwanne ya ahụ e kere ibé ákwà na-acha uhie uhie n’aka pụtara, a gụọ ya Zira.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ọ,” ya bụ, Juda.
Ma ọ bụ “onye na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
Pirez pụtara “Mgbawa.” O nwere ike ịbụ ahụ́ nne ya merụrụ mgbe ọ na-amụ ya ka a na-ekwu.