Jeremaya 10:1-25
10 Ndị Izrel, nụrụnụ aka ná ntị Jehova na-adọ unu.
2 Jehova kwuru, sị:
“Unu emekwala omenala mba dị iche iche.+
Unu atụla ihe àmà ndị si n’eluigwe ụjọMaka na mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.+
3 N’ihi na omenala mba dị iche iche na-emegharị ndị mmadụ anya.*
Omenkà na-aga gbutuo osisi nkịtị dị n’ọhịa,Jiri ya pịa arụsị.+
4 Ọ na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ya mma,+Jirikwa hama na ntu kụgide ya n’ihe ka ọ ghara ịda.+
5 Arụsị ndị ọ na-apị anaghị ekwu okwu otú ahụ ihe e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba na-anaghị ekwu okwu.+
A na-ebu ha ebu n’ihi na ha anaghị aga ije.+
Atụla ha ụjọ n’ihi na ha agaghị emeli mmadụ ihe ọ bụla.
Ha enweghịkwa ike imere mmadụ ihe ọma ọ bụla.”+
6 Jehova, o nweghị onye dị ka gị.+
Ị bụ onye ukwu. Aha gị na-ede ude, na-egosikwa na ị dị ike.
7 Eze mba niile,+ e nweghị onye na-ekwesịghị ịtụ egwu gị, maka na e kwesịrị ịna-atụ egwu gị.
N’ihi na n’ime ndị niile ma ihe ná mba dị iche iche nakwa n’alaeze ha niile,E nweghị otu mkpụrụ onye dị ka gị.+
8 Ha niile anaghị eche echiche. Ha bụkwa ndị nzuzu.+
Onye na-eche na osisi ga-akụziri ya ihe na-aghọgbu onwe ya.*+
9 A na-esi Tashish+ ebute ọlaọcha, na-esikwa Yufaz ebute ọlaedo.
Omenkà na onye na-eji ígwè akpụ ihe na-eji ha achọ ahụ́ arụsị ndị ahụ mma.
Ndị mmadụ na-ejikwa eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ na-acha pọpụl* eme ákwà ha.
Ọ bụ ndị nwere nkà na-arụ ha niile.
10 Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.
Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+
Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+E nweghịkwa mba ga-adịgide ma o wesa ha iwe.
11 * Gwanụ ha, sị:
“Chi niile ọ na-abụghị ha kere eluigwe na ụwaGa-ala n’iyi. Ha agaghịzi adị n’ụwa a nakwa n’okpuru eluigwe.”+
12 Ọ bụ Chineke ji ike ya kee ụwa,Jiri amamihe ya mee ka elu ala sie ike,+Jirikwa amamihe* ya gbasaa eluigwe ka ákwà.+
13 Olu ya na-emeKa mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ.+
Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.+
Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.*
Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
14 Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche na onye na-amaghị ihe.
Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ.
Ha anaghịkwa eku ume.*+
15 Ha na-emegharị mmadụ anya,* na-atọkwa ọchị.+
N’oge Chineke ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi.
16 Chineke* nke Jekọb adịghị ka arụsị ndị a,N’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile.
Izrel bụkwa mkpara ya.*+
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+
17 Jeruselem* a nọchibidoro anọchibido,Kwakọta ngwongwo gị dị n’ala.
18 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
“N’oge a, m ga-achụpụ ndị bi n’ala a.+
M ga-eme ka ha taa ahụhụ.”
19 Ataala m ahụhụ n’ihi ọkpụkpụ m nke gbajiri agbaji.+
Ahụ́ e merụrụ m enweghị ngwọta.
M kwukwara, sị: “N’eziokwu, ihe a bụ ọrịa na-arịa m. M ga na-edikwa ya.
20 E bibiela ụlọikwuu m. E gbubiekwala ụdọ ụlọikwuu m niile.+
Ụmụ m ahapụla m pụọ. Ha anọghịzi.+
E nweghịzi onye na-agbasa ụlọikwuu m. E nweghịkwa onye na-eweli ákwà ụlọikwuu m elu.
21 N’ihi na ndị na-azụ atụrụ na-akpa àgwà ka ndị na-enweghị uche.+
Ha achọghị ịma ihe Jehova chọrọ ka e mee.+
Ọ bụ ya mere ha ji eme ka ndị na-anaghị aghọta ihe.
A chụsasịala anụmanụ ha niile.”+
22 Geenụ ntị! E nwere ihe anyị nụrụ ugbu a.
A na-anụ oké mkpọtụ n’ala dị n’ebe ugwu.+
Oké mkpọtụ a ga-eme ka obodo ndị dị na Juda tọgbọrọ nkịtị, ghọọ ọgba nkịta ọhịa.+
23 Jehova, ama m nke ọma na ọ dịghị mmadụ n’aka ikpebi ụzọ o kwesịrị iso.
Mmadụ enweghịkwa ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.+
24 Jehova, gbazie m otú dị gị mma.
Ejikwala iwe agbazi m,+ ka ị ghara ibibi m.+
25 Wesa mba ndị na-amaghị gịNakwa ezinụlọ ndị na-anaghị akpọku aha gị ezigbo iwe.+
N’ihi na ha na-alụso Jekọb ọgụ.+
N’eziokwu, ha na-alụso ya ọgụ, na-achọkwa ibibi ya.+
Ha emeekwala ka ala ya tọgbọrọ chakoo.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “enweghị isi.”
^ Ma ọ bụ “na-eche ihe na-enweghị isi.”
^ Ma ọ bụ “ajị anụ e sijiri ka ọ chawa pọpụl.”
^ Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee amaokwu a mgbe mbụ e dere ya.
^ Ma ọ bụ “nghọta.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ọ na-emeghekwara mmiri ozuzo ụzọ.”
^ Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
^ Ma ọ bụ “Ha adịghịkwa ndụ.”
^ Ma ọ bụ “Ha enweghị isi.”
^ Na Hibru, “Òkè.”
^ Na Hibru, “mkpara o ketara.”
^ Na Hibru, “Nwaanyị.”