Jeremaya 11:1-23

  • Ndị Juda mebiri ọgbụgba ndụ ha na Chineke (1-17)

    • Chi ndị Juda na-efe dị ọtụtụ ka obodo ndị dị na Juda (13)

  • E ji Jeremaya tụnyere nwa atụrụ a chọrọ igbu egbu (18-20)

  • Ndị obodo Jeremaya na-emegide ya (21-23)

11  Jehova gwara Jeremaya okwu, sị:  “Nụrụnụ ihe mụ na unu gbara ná ndụ. “Gwa* ya ndị Juda na ndị bi na Jeruselem.  Sị ha, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “A ga-abụ onye na-emeghị ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ a ọnụ.+  N’ọgbụgba ndụ a, m gwara nna nna unu hà n’ụbọchị m si n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè, ya bụ, n’Ijipt, kpọpụta ha+ ma sị ha, ‘Ruberenụ m isi, meekwanụ ihe niile m nyere unu n’iwu. Unu ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke unu,+  ka m wee mezuo iyi m ṅụụrụ nna nna unu hà na m ga-enye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ununwa bikwa n’ala ahụ ruo taa.’”’” M wee, sị: “Amen,* Jehova.”  Jehova gwaziri m, sị: “Kọsaa ihe a niile n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, sị: ‘Nụrụnụ ihe mụ na unu kwekọrịtara n’ọgbụgba ndụ a, meekwanụ ya.  N’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta nna nna unu hà, m dụsiri ha ọdụ ike ka ha na-erubere m isi.+ M dụrụ ha ọdụ a ugboro ugboro* otú a m sikwa na-adụ unu taa.”  Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala. Kama onye ọ bụla n’ime ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.+ Ọ bụ ya mere m ji taa ha ahụhụ otú mụ na ha kwekọrịtara mgbe anyị gbara ndụ. M gwara ha ka ha na-eme ihe anyị kwekọrịtara, nke ha na-anaghị eme.’”  Jehova gwaziri m, sị: “Ndị Juda na ndị bi na Jeruselem agbaala izu nupụrụ m isi. 10  Ha emewela ihe ọjọọ ndị nna nna ha, ndị jụrụ irubere m isi, nọ na-eme.+ Ha esorola chi ọzọ dị iche iche, na-efekwa ha.+ Ndị Izrel na ndị Juda emebiela ọgbụgba ndụ mụ na ndị nna nna ha gbara.+ 11  N’ihi ya, Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha.+ Ha agaghịkwa egbochili ya ịdakwasị ha. Ọ bụrụ na ha akpọkuo m ka m nyere ha aka, agaghị m atụpụrụ ha ọnụ.+ 12  Ndị bi n’obodo ndị dị na Juda na ndị bi na Jeruselem ga-agakwuru chi ndị ha na-achụrụ àjà ka ha nyere ha aka,+ ma chi ndị ahụ agaghị anapụta ha mgbe ọdachi ahụ ga-adakwasị ha. 13  Ndị Juda, chi ndị unu na-efe adịla ọtụtụ ka obodo ndị dị na Juda. Unu arụọkwarala Bel, bụ́ chi na-abaghị uru ọ bụla, ọtụtụ ebe unu ga-anọ na-achụrụ ya àjà. Ha dị ọtụtụ ka okporo ámá ndị dị na Jeruselem.’+ 14  “Ma gịnwa bụ́ Jeremaya, ekpekwala ekpere maka ndị a. Ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere,+ n’ihi na agaghị m ege ha ntị ma ha kpọkuwe m n’ihi ọdachi ga-adakwasị ha. 15  Ònye nyere ndị m hụrụ n’anya ikike ịbata n’ụlọ m,Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ọjọọ? Hà ga-eji àjà ha ji anụmanụ achụ mee ka ọdachi ghara ịdakwasị ndị Juda? Hà ga na-aṅụrị ọṅụ n’oge ahụ? 16  E nwere mgbe Jehova kpọrọ unu osisi oliv bụ́ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ,Nke mkpụrụ ya mara ezigbo mma. Ka a nọ na-eme oké mkpọtụ, Chineke mụnyere unu ọkụ. Ndị iro gbajikwara alaka unu. 17  “Onye kụrụ unu,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ekwuola na ọdachi ga-adakwasị unu n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel na ndị Juda na-eme. Ha na-achụrụ Bel àjà iji kpasuo m iwe.”+ 18  Jehova, ị gwara m ka m mara. N’oge ahụ, i mere ka m hụ ihe ha na-eme. 19  Adị m ka nwa atụrụ dị nwayọọ a kpụtara ebe a ga-egbu ya. Amaghị m na ha na-akpara m nkata ọjọọ, sị:+ “Ka anyị laa osisi a na mkpụrụ ya n’iyi. Ka anyị gbuo ya, Ka a ghara icheta aha ya ọzọ.” 20  Ma Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ na-enyocha obi na ihe dị n’ime ime obi.*+ Kwe ka m hụ otú ị ga-esi taa ndị iro gị ahụhụ ihe ha mere,N’ihi na ọ bụ gị ka m hapụụrụ okwu m ka i kpeere m ikpe. 21  N’ihi ya, e nwere ihe Jehova kwuru gbasara ndị Anatọt+ bụ́ ndị na-achọ igbu m,* ndị na-asịkwa: “Ebula amụma n’aha Jehova,+ ka anyị ghara igbu gị.” 22  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-eme ka ha zaa ajụjụ maka ihe ha mere. A ga-eji mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha.+ Ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 23  N’ihi ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ndị Anatọt,+ e nweghị otu onye n’ime ha ga-afọdụ n’afọ m ga-elebara ha anya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ Jeremaya ka a na-ezi ozi a.
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”
Na Hibru, “M na-ebili n’isi ụtụtụ adụ ha ọdụ.”
Na Hibru, “akụrụ.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”