Jeremaya 12:1-17

  • Jeremaya kwuru ihe na-enye ya nsogbu n’obi (1-4)

  • Ihe Jehova gwara Jeremaya (5-17)

12  Jehova, ị bụ onye ezi omume.+ Mgbe ọ bụla m kọọrọ gị ihe na-enye m nsogbu n’obiNakwa mgbe ọ bụla m ji okwu ikpe bịakwute gị, ị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ma, gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ omume?+ Gịnịkwa mere na e nweghị ihe na-echegbu ndị aghụghọ?   Ị kụrụ ha ka osisi. Ha agbanyekwala mgbọrọgwụ. Ha etoola, mịakwa mkpụrụ. Ha na-akpụ gị n’ọnụ mgbe niile, ma obi ha adịghị n’ebe ị nọ.+   Ma Jehova, ị ma m nke ọma.+ Ị na-ahụkwa m. I nyochaala obi m wee hụ na obi m dị n’ebe ị nọ.+ Họpụta ha ka atụrụ a ga-egbu egbu. Dowekwa ha iche maka ụbọchị a ga-egbu ha.   Olee mgbe ala a ga-akwụsị ịkpọ nkụ? Olee mgbe ahịhịa ndụ dị n’ala a ga-akwụsị ịkpọnwụ?+ A laala anụ ọhịa na nnụnụ n’iyiN’ihi ihe ọjọọ ndị bi n’ala a na-eme. N’ihi na ha na-asị: “Chineke anaghị ahụ ihe ga-eme anyị.”   Ọ bụrụ na ike gwụrụ gị mgbe i so ndị ji ụkwụ na-agba ọsọ,Oleezi otú ị ga-esi soro ịnyịnya gbaa ọsọ?+ Ọ bụrụgodị na obi ruru gị ala n’obodo udo dị,Olee otú obi ga-adị gị ma ị nọrọ n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan?   N’eziokwu ụmụnne afọ gị, ndị otu nna ji gị na ha,Aghọọla gị aghụghọ.+ Ha na-abụ gị ọnụ. Ọ bụrụgodị na ha agwawa gị okwu ọma,Atụkwasịkwala ha obi.   “Ahapụla m ụlọ m.+ Ahapụla m ndị m ketara.+ Enyefeela m ndị m* hụrụ n’anya n’aka ndị iro ha.+   Ndị m ketara dịzi m ka ọdụm nọ n’oké ọhịa. Ha na-agbọ m ụja. Ọ bụ ya mere m jizi kpọ ha asị.   Ndị m ketara dị m ka nnụnụ tụrụ àgwà nke na-eri anụ. Nnụnụ dị iche iche na-eri anụ gbara ya gburugburu ka ha rie ya.+ Anụmanụ niile nọ n’ọhịa, bịanụ, zukọtanụ. Bịanụ ka unu rie nri.+ 10  Ndị na-azụrụ m atụrụ alaala ubi vaịn m n’iyi.+ Ha azọtọọla ala m.+ Ha emeela ka ọmarịcha ala m ghọọ ala ịkpa tọgbọ nkịtị. 11  Ọ ghọọla ala na-abaghị uru. Ọ kpọọla nkụ.* Ọ tọgbọkwa chakoo n’ihu m.+ Ala a niile aghọọla ikpo nkume, Ma, o nweghị onye ọ na-emetụ n’obi.+ 12  Ndị na-ebibi ihe esila n’ụzọ niile* dị n’ala ịkpa bịa,N’ihi na mma agha Jehova si n’otu nsọtụ ala a gburu ndị mmadụ na-aga na nsọtụ ya nke ọzọ.+ E nweghị onye obi ruru ala. 13  Ha kụrụ ọka wit, ma, ihe ha ghọtara bụ ogwu.+ Ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, ma, e nweghị uru ọ na-abara ha. Ihere ihe ha rụpụtara ga-eme ha,N’ihi na Jehova na-ewe ezigbo iwe.” 14  Mụnwa bụ́ Jehova nwere ihe m kwuru gbasara ndị agbata obi m niile bụ́ ndị ọjọọ, ndị na-etinye anya n’ala m nyere ndị Izrel bụ́ ndị m ka ha biri na ya.+ M kwuru, sị: “M ga-efopụ ha n’ala ha.+ M ga-efopụkwa ndị Juda ka ha na ha ghara ịnọ. 15  Ma, m fopụchaa ha, m ga-emere ha ebere, kpọghachikwa onye nke ọ bụla n’ala ya nakwa n’ihe o ketara.” 16  “Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ mụta ihe ndị m na-eme, jirikwa aha m na-aṅụ iyi, sị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi!’ otú ha kụziiri ndị m iji Bel na-aṅụ iyi, ha ga-adịrị ndụ otú ndị m dị ndụ. 17  Ma ọ bụrụ na ha jụ irubere m isi, m ga-efopụ ha ọzọ. M ga-efopụ ha, bibiekwa ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-eru uju.”
Ma ọ bụ “n’ụzọ niile na-adịghị mma.”