Jeremaya 13:1-27

  • Ájị̀ ákwà linin mebiri emebi (1-11)

  • A ga-akụwa ite mmanya dị iche iche (12-14)

  • A dọọrọ ndị Juda na-ekweghị mmekwata n’agha (15-27)

    • Onye Kush ọ̀ ga-agbanweli akpụkpọ ahụ́ ya? (23)

13  Jehova gwara m, sị: “Gaa zụta ájị̀* ákwà linin, keekwa ya n’úkwù. Ekwekwala ka mmiri mesa ya.”  M gara zụta ájị̀ otú ahụ Jehova kwuru, keekwa ya n’úkwù m.  Jehova gwakwara m okwu nke ugboro abụọ, sị:  “Chịrị ájị̀ ahụ ị zụrụ, nke i kere n’úkwù, bilie gaa n’Osimiri Yufretis, zookwa ya ebe gbawara agbawa ná nnukwu nkume dị ebe ahụ.”  M wee gaa zoo ya n’akụkụ Osimiri Yufretis, otú ahụ Jehova gwara m.  Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Jehova sịrị m: “Bilie, gaa n’Osimiri Yufretis chịrị ájị̀ ahụ m gwara gị ka i zoo ebe ahụ.”  M gara n’Osimiri Yufretis gwuo ala ebe m zoro ájị̀ ahụ ma chịrị ya. Ma, m chọpụtara na ájị̀ ahụ emebiela. E nweghịkwa ihe a ga-eji ya eme.  Jehova gwakwara m, sị:  “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ihe Juda ji eme ọnụ na ihe Jeruselem ji eme ọnụ ga-ala n’iyi otú ájị̀ a si laa n’iyi.+ 10  Ndị ọjọọ a ga-adị ka ájị̀ a a na-enwekwaghị ihe a ga-eji ya eme, n’ihi na ha jụrụ irubere m isi.+ Ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe dị ha n’obi.+ Ha gara soro chi ọzọ dị iche iche, na-efe ha ofufe, na-akpọkwara ha isiala.’ 11  Jehova kwuru, sị, ‘Otú ahụ e si ekegidesi ájị̀ ike n’úkwù ka m kegidesiri ndị Izrel niile na ndị Juda niile ike n’ahụ́ m. M mere ihe a ka ha wee bụrụ ndị m,+ ndị e si n’aka ha anụ aha m,+ ndị na-eto m, nakwa ndị na-asọpụrụ m. Ma, ha erubereghị m isi.’+ 12  “Gwakwa ha, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “E kwesịrị ịgbaju nnukwu ite ọ bụla mmanya.”’ Ha ga-asịkwa gị, ‘Ọ̀ bụ na anyị amaghị na e kwesịrị ịgbaju nnukwu ite ọ bụla mmanya?’ 13  Ị ga-agwazi ha, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka ndị niile bi n’obodo a ṅụbiga mmanya ókè,+ ma ndị eze na-anọ n’ocheeze Devid ma ndị nchụàjà ma ndị amụma ma ndị niile bi na Jeruselem.” 14  Jehova kwukwara, sị, “M ga-akụpịa ha n’ahụ́ ibe ha, ma ndị bụ́ nna ma ụmụ ha.+ Agaghị m enwere ha ọmịiko. Agaghị m emere ha ebere. Ihe m ga-eme ha agaghịkwa ewute m. E nweghị ihe ga-egbochi m ịla ha n’iyi.”’+ 15  Nụrụnụ, ṅaakwanụ ntị. Unu adịla mpako, n’ihi na Jehova ekwuola okwu. 16  Toonụ Jehova bụ́ Chineke unuTupu ya emee ka ọchịchịrị gbaaNakwa tupu unu akpọbie ụkwụ n’ugwu mgbe chi jiri. Unu ga na-atụ anya ìhè,Ma, ọ ga-eme ka ezigbo ọchịchịrị gbaa. Ọ ga-emekwa ka ezigbo itiri gbaa.+ 17  Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị,M* ga-anọ ebe zoro ezo na-ebe ákwá n’ihi nganga unu. M ga-ebepụta nnukwu anya mmiri, ọ ga-esikwa m n’anya na-asọdata,+N’ihi na a dọọrọ ìgwè atụrụ Jehova+ n’agha. 18  Gwa eze na nne eze, sị,+ ‘Nọrọnụ n’ebe dị ala,N’ihi na ọmarịcha okpueze unu kpu n’isi ga-ada n’ala.’ 19  E mechiela* ọnụ ụzọ ámá obodo ndị dị n’ebe ndịda. E nweghịkwa onye ga-emeghe ha. A dọrọla ndị Juda niile n’agha. A dọrọla ha niile n’agha.+ 20  Lelie anya hụ ndị si n’ebe ugwu na-abịa.+ Olee ebe ìgwè atụrụ e nyefere gị n’aka nọ, ya bụ, ọmarịcha ìgwè atụrụ gị?+ 21  Gịnị ka ị ga-ekwu mgbe ndị i metere enyi ná mmaliteGa-ata gị ahụhụ?+ Ọ̀ bụ na ahụ́ agaghị na-egbu gị mgbu otú ọ na-egbu nwaanyị na-amụ nwa?+ 22  Ị ga-ekwuzi n’obi gị, sị, ‘Gịnị mere ihe a niile ji eme m?’+ Ọ bụ ihe ọjọọ na-enweghị atụ i mere mere e ji yipụ gị uwe mwụda gị.+ Ikiri ụkwụ gị na-egbukwa gị ezigbo mgbu. 23  Onye Kush* ọ̀ ga-agbanweli akpụkpọ ahụ́ ya? Agụ owuru ọ̀ ga-agbanweli àgwà ọ tụrụ?+ Ọ bụrụ na ha ga-agbanweli, maranụ na ununwa bụ́ ndị aka ochie n’ime ihe ọjọọ ga-agbanweli mewe ihe dị mma. 24  N’ihi ya, m ga-achụsasị unu otú ifufe si efesasị irighiri ahịhịa n’ala ịkpa.”+ 25  Jehova kwuru, sị, “Ihe a ka m kpebiri ime gị,N’ihi na i chefuola m,+ tinyekwa obi gị n’okwu ụgha.+ 26  N’ihi ya, m ga-achịli uwe mwụda gị elu ka ọ wụchie gị ihu. A ga-ahụkwa ihe ihere gị.+ 27  A ga-ahụ iko ị na-akwa,+ nụ ubé ị na-ebe ka oké ịnyịnya na-achọ nne ịnyịnya ọ ga-agba,Hụkwa akwụna jọgburu onwe ya ị na-agba. Anọ m n’elu ugwu nta ndị dị n’ọhịaHụ ihe ndị na-asọ oyi ị na-eme.+ Jeruselem, ị ga-ata ahụhụ! Olee mgbe ị ga-akwụsị ime ihe ndị a?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, belt.
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “A nọchibidola.”
Ma ọ bụ “Onye Etiopia.”