Jeremaya 14:1-22

  • Ụkọ mmiri ozuzo, ụkọ nri, na mma agha (1-12)

  • A ga-egbu ndị amụma ụgha (13-18)

  • Jeremaya kwetara na ndị obodo ya mere ihe ọjọọ (19-22)

14  Jehova gwara Jeremaya banyere oge mmiri na-agaghị ezo,+ sị:   Ndị Juda na-eru uju.+ Ọnụ ụzọ ámá ha niile emebisiela. Ha adaruchaala ala. Ike ụwa agwụkwala ha. Ndị bi na Jeruselem na-ebekwa ákwá.   Ndị ukwu na-edunye ndị ohu* ha ka ha gaa chute mmiri. Ha na-aga n’olulu mmiri, ma ha anaghị ahụ mmiri. Ha na-eburu okpokoro ite ha lọta. E menyela ha ihere, mechuokwa ha ihu. Ha ekpuchiekwala isi ha.   Obi ekorola ndị ọrụ ubi n’elu. Ha ekpuchiekwala isi haN’ihi na ala ha agbawachaalaMaka na mmiri ezobeghị n’obodo ha.+   Nne ele nọ n’ọhịa na-agbahapụkwa nwa ọ mụrụ ọhụrụMaka na ahịhịa ndụ adịghị.   Jakị ọhịa dị iche iche na-eguzo n’elu ugwu ndị ọhịa na-adịghị. Ha na-eku ume ọkụ ọkụ ka nkịta ọhịa. Ha anaghịkwa ahụ ụzọ nke ọma n’ihi na ahịhịa ndụ adịghịzi.+   Jehova, ọ bụ eziokwu na mmehie ndị anyị mere na-egosi na ikpe mara anyị,Biko, nyere anyị aka n’ihi aha gị.+ Mmehie anyị dị ọtụtụ.+ Ọ bụkwa gị ka anyị mehiere.   Onye ndị Izrel ji nwee olileanya, Onye zọpụtara ha+ mgbe ha na-ata ahụhụ,Gịnị mere i ji nọrọ dị ka onye mbịarambịa n’ala a,Dị ka onye ije nke kwụsịtụrụ n’obodo ka ọ rahụ, chi bọọ ya agawa ebe ọ na-aga?   Gịnị mere i ji nọrọ ka nwoke ihe juru anya,Dị ka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta ndị ya? Ma Jehova, ị nọnyeere anyị.+ Ọ bụkwa aha gị ka anyị na-aza.+ Ahapụkwala anyị. 10  Jehova kwuru gbasara ndị Juda, sị: “Ngagharị na-amasị ha.+ Ụkwụ anaghị anọ ha otu ebe.+ Ọ bụ ya mere na ihe ha anaghị amasị Jehova.+ Ọ ga-echeta mmehie ndị ha mere, meekwa ka ha zaa ajụjụ maka ha.”+ 11  Jehova gwakwara m, sị: “Ekpela ekpere ka ihe ọma ọ bụla meere ndị a.+ 12  Ọ bụrụ na ha ebuo ọnụ, agaghị m ege ntị n’arịrịọ ha na-arịọ m.+ Ọ bụrụkwa na ha achụọ àjà a na-esucha ọkụ na àjà ọka, ha agaghị amasị m.+ M ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe laa ha n’iyi.”+ 13  M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ndị amụma na-agwa ha, sị, ‘Unu agaghị ahụ mma agha ọ bụla. Ụnwụ agaghịkwa ada n’ala unu. Kama, Chineke ga-eme ka unu biri nnọọ n’udo ebe a.’”+ 14  Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma ahụ na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha. Enyeghị m ha iwu. Agwaghịkwa m ha okwu.+ Ha na-ahụ ọhụụ ụgha. Ihe ha na-agwa unu bụ ihe na-enweghị isi ha gbatara n’afa nakwa ihe ndị ha chepụtara n’onwe ha.+ 15  N’ihi ya, e nwere ihe Jehova kwuru gbasara ndị amụma ahụ na-ebu amụma n’aha ya, ndị ọ na-abụghị ya dunyere, ndị na-asị na a gaghị eji mma agha ebibi ndị obodo a nakwa na ụnwụ agaghị ada na ya. O kwuru, sị, ‘A ga-eji mma agha na ụnwụ laa ndị amụma ahụ n’iyi.+ 16  Ụnwụ na mma agha ga-egbu ndị ha na-eburu amụma. Ozu ha ga-atọgbọkwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. O nweghị onye ga-eli ha,+ ma hanwa ma ndị nwunye ha ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. M ga-eme ka ọdachi kwesịịrị ha dakwasị ha.’+ 17  “Gwa ha, sị: ‘Ka anya mmiri na-agbapụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị ehihie na abalị,+N’ihi na ndị m adaala ezigbo ada, gbajie ọkpụkpụ,+Merụọkwa ezigbo ahụ́. 18  M banye n’ọhịa,M na-ahụ ndị mma agha gburu.+ M batakwa n’ime obodo,+M na-ahụ ndị ụnwụ kpataara ọrịa dị iche iche.+ Ma ndị amụma ma ndị nchụàjà na-agagharị n’ala ha na-amaghị.’” 19  Ị̀ jụla Juda kpamkpam, ka ị̀ kpọla* Zayọn asị?+ Gịnị mere i ji tie anyị ihe nke na a gaghị agwọtali anyị agwọta?+ Anyị nọ na-atụ anya udo, ma e nweghị ihe ọma merenụ. Anyị nọ na-atụ anya ka a gwọọ anyị, ma ezigbo ụjọ jidere anyị.+ 20  Jehova, anyị kwetara na anyị mere ihe ọjọọ,Kwetakwa na nna nna anyị hà mejọrọ ihe. N’eziokwu, anyị emehiela gị.+ 21  Biko, n’ihi aha gị, ahapụla anyị.+ Elelịkwala ocheeze gị dị ebube. Cheta ọgbụgba ndụ anyị na gị. Emebila ya.+ 22  N’ime arụsị na-abaghị uru mba dị iche iche na-efe, ò nwere nke ga-emeli ka mmiri zoo,Ka eluigwe ọ̀ ga-emeli ka mmiri zoo n’onwe ya? Jehova bụ́ Chineke anyị, ọ́ bụghị naanị gị ga-emeli ka mmiri zoo?+ Anyị nwere olileanya n’ebe ị nọ,N’ihi na ọ bụ naanị gị ga-emeli ihe a niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị nta.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị ọ̀ kpọla.”