Jeremaya 18:1-23

  • Ụrọ dị n’aka ọkpụite (1-12)

  • Jehova gbakụtara ndị Izrel azụ (13-17)

  • Nkata ndị Izrel kpaara Jeremaya na ihe ọ rịọrọ ha (18-23)

18  Jehova gwara Jeremaya okwu, sị:  “Bịa gaa n’ụlọ ọkpụite.+ I ruo, m ga-agwa gị okwu ebe ahụ.”  M wee gawa n’ụlọ ọkpụite, rute, ya abụrụ na o ji wiil e ji akpụ ite na-akpụ ite.  Ma, aka ọkpụite ahụ mebiri arịa o ji ụrọ na-akpụ. N’ihi ya, o ji ya kpụọ ụdị arịa ọzọ otú dị ya mma n’anya.*  Jehova gwaziri m, sị:  “‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime unu ihe ọkpụite a mere? Otú ahụ ụrọ dị n’aka ọkpụite ka ununwa, bụ́ ndị Izrel, dị n’aka m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.  ‘Mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-efopụ mba ọ bụla ma ọ bụ alaeze ọ bụla, kwuokwa na m ga-akwatu ya ma bibie ya,+  mba ahụ wee hapụ ihe ha na-eme nke m kwuru na ọ dịghị mma, m ga-agbanwe obi m gbasara ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha.+  Ma, mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-akụ mba ma ọ bụ alaeze ka osisi, meekwa ka ọ kwụsie ike, 10  ha abịa mee ihe dị njọ n’anya m, nupụkwara m isi, m ga-agbanwe obi m gbasara ihe ọma m bu n’obi imere ha.’ 11  “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ihe m ga-eme unu. Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme. Mewenụ ihe dị mma, na-akpakwanụ àgwà ọma.”’”+ 12  Ma ha sịrị: “Ọ baghị uru!+ N’ihi na anyị ga na-eme uche anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akpọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.”+ 13  Jehova ji maka ihe a kwuo, sị: “Biko, jirinụ ọnụ unu jụọ mba dị iche iche ajụjụ. Ònye nụtụrụla ụdị ihe a? Ndị Izrel* emeela ihe jọgburu onwe ya.+ 14  Snoo nke na-ada na Lebanọn ọ̀ ga-akwụsị ịdị n’elu oké nkume ndị dị n’ebe ndị kpọdara akpọda? Ka mmiri jụrụ oyi, nke na-asọ asọ, si na Lebanọn ọ̀ ga-ata? 15  Ma, ndị m echefuola m.+ Ha na-achụrụ chi dị iche iche na-abaghị uru àjà.+ Ha na-emekwa ka ndị mmadụ na-ada ka ha na-aga n’ụzọ ha, bụ́ ụzọ dịwara kemgbe oge ochie.+ Ha na-eme ihe a ka ndị ahụ soro okporo ụzọ ọzọ na-adịghị larịị.* 16  Ndị m na-eme ihe a ka ala ha na-emenye ndị ga-ahụ ya ụjọ,+Ha ana-afụkwa mkpọrọhịhị ruo mgbe ebighị ebi.+ Onye ọ bụla nke si na ya na-agafe ga-ekporopụ anya na-ele ya, fufeekwa n’isi.+ 17  M ga-achụsasị ha n’ihu ndị iro ha otú ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si efesasị ihe. M ga-agbakụta ha azụ. Agaghị m eche ha ihu n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.”+ 18  Ma ha sịrị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na ọ bụ ndị nchụàjà anyị ga na-agwa anyị ihe iwu kwuru.* Ọ bụ ndị ma ihe ga na-adụ anyị ọdụ. Ọ bụkwa ndị amụma ga na-agwa anyị ihe Chineke kwuru. Bịanụ ka anyị kwuo okwu ọjọọ gbasara Jeremaya,* ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.” 19  Jehova, biko, ṅaa m ntị,Nụrụkwa ihe ndị na-emegide m na-ekwu. 20  È kwesịrị iji ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma? N’ihi na ha egwuorola m* olulu ka m daba nwụọ.+ Cheta otú m si guzoro n’ihu gị kwuo ihe ọma banyere ha,Iji mee ka ị kwụsị iwesa ha iwe. 21  N’ihi ihe a ha mere, hapụ ụmụ ha ka agụụ gụgbuo ha. Hapụkwa ha na ụmụ ha ka e jiri mma agha gbuo ha.+ Ka ndị nwunye ha gbara aka ụmụ, ghọọkwa ụmụ nwaanyị isi mkpe.+ Ka ajọ ọrịa gbuo ụmụ nwoke ha. Ka e jirikwa mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’agha.+ 22  Ka a nụ mkpu ákwá n’ụlọ haMgbe ị ga-eme ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga bịakwute ha na mberede. N’ihi na ha egwuola olulu ka ha jide m,Siekwa ọnyà ka ọ ma m n’ụkwụ.+ 23  Ma, nkata niile ha na-akpa igbu m+Doro gịnwa, bụ́ Jehova, anya. Agbagharala ha njehie ha. Ehichapụkwala mmehie ha. Hapụ ha ka ha daa n’ihu gị+N’oge ị ga-eji iwe na-eme ha ihe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “otú dị mma n’anya ọkpụite ahụ isi kpụọ ya.”
Na Hibru, “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel.”
Ma ọ bụ “a na-awụghị ájá.”
Ma ọ bụ “ga na-enye anyị ntụziaka.”
Na Hibru, “jiri ire anyị mee ya ihe.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”