Jeremaya 2:1-37

  • Ndị Izrel hapụrụ Jehova fewe chi ọzọ (1-37)

    • Ndị Izrel dị ka osisi vaịn ọhịa (21)

    • Ọbara ndị ogbenye gbasara n’uwe mwụda ya (34)

2  Jehova gwara m, sị:  “Gaa gwa ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ana m echeta nnọọ otú unu si jiri obi unu niile na-efe m* kemgbe unu bụ ụmụaka,+Otú unu si hụ m n’anya mgbe m kwere unu nkwa na m ga-alụ unu+Nakwa otú unu si na-eso m n’ala ịkpa,N’ala a na-akụghị mkpụrụ ọ bụla.+   Ndị Izrel dị nsọ n’anya Jehova.+ Ha bụ mkpụrụ mbụ mịịrị ya.”’ ‘A ga-ama onye ọ bụla ga-anwa ibibi ha ikpe. Ọdachi ga-adakwasịkwa ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”+   Ezinụlọ Jekọb na ezinụlọ niile dị n’Izrel,Nụrụnụ ihe Jehova kwuru.   Jehova kwuru, sị: “Gịnị ka nna nna unu hà sị na m mere+Nke mere ha ji nọrọ m n’ebe dị anya,Na-esokwa arụsị ndị na-abaghị uru,+ hanwa aghọọkwa ndị na-abaghị uru?+   Ha asịghị, ‘Ka anyị chọwa Jehova,*Onye si n’ala Ijipt kpọpụta anyị,+Onye duuru anyị gafee ala ịkpa,Gafee ọzara+ na olulu dị iche iche,Gafee ala mmiri na-anaghị ezokarị+ na ala oké ọchịchịrị,Gafee ala mmadụ na-agafetụbeghị,Nke mmadụ na-ebitụbeghịkwa.’   M kpọbatakwara unu n’ala a kụrụ mkpụrụ osisi,Ka unu rie ihe o mepụtara na ihe ọma ndị dị na ya.+ Ma unu batara merụọ ala m. Unu mekwara ka ihe m ketara bụrụ ihe rụrụ arụ.+   Ndị nchụàjà asịghị, ‘Ka anyị chọwa Jehova.’*+ Ndị na-akụziri ndị ọzọ Iwu m amaghị m. Ndị ọzụzụ atụrụ nupụkwaara m isi.+ Ndị amụma buru amụma n’aha Bel,+Sorokwa ndị na-agaghị abara ha uru ọ bụla.   Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụ ya mere m ga-eji na-agwa unu ihe unu mejọrọ,+Na-agwakwa ụmụ ụmụ unu ihe ha mejọrọ.’ 10  ‘Ma, gaanụ n’ala ndị dị n’ụsọ osimiri* nke ndị Kitim+ lee ihe unu ga-ahụ. Zigakwanụ ozi na Kida+ ma cheenụ echiche nke ọma,Ka unu mata ma ụdị ihe a ò metụla. 11  Ò nweela mba ji ihe ndị na-abụghị chi gbanwere chi ha? Ma, ndị m ejirila ihe na-enweghị ike ịbara ha uru gbanwere mụnwa bụ́ Chineke dị ebube.+ 12  Eluigwe, kporopụ anya na-ele ihe a,Ka ezigbo ụjọ ji gị meekwa ka akpata oyi wụọ gị.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 13  ‘N’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụla mụnwa, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.+ Ha gwukwaara onwe ha oluluNdi gbawara agbawa na-agaghị echedoli mmiri.’ 14  ‘Izrel ọ̀ bụ onye na-eje ozi ka ọ̀ bụ ohu a mụrụ n’ezinụlọ? Gịnịzi mere e ji na-ebukọrọ ihe ya? 15  E nwere ọdụm ndị ji maka ya na-agbọ ụja.+ Ha na-agbọsi ụja ike. Ha mere ka ala ya bụrụ ihe na-awụ akpata oyi. Ha agbaala obodo ya niile ọkụ, nke mere na e nweghịzi onye bi na ha. 16  Ndị Nọf*+ na ndị Tapanis+ na-akwọcha gị isi.* 17  Ọ́ bụghị gị mere onwe gị ihe a,Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Jehova bụ́ Chineke gị+N’oge o du gị na-eje n’ụzọ? 18  Gịnị mere i ji aga n’ụzọ e si aga Ijipt+Ka ị ṅụọ mmiri Shaịhọ?* Gịnịkwa mere i ji aga n’ụzọ e si aga Asiria+Ka ị ṅụọ mmiri Osimiri Yufretis? 19  I kwesịrị ịmụta ihe n’ihe ọjọọ ndị i mere. A ga-adọ gị aka ná ntị maka isi i nupụrụ. Marakwa na i meela ihe ọjọọ na ihe na-agbawa obi,+N’ihi na ị hapụrụ mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị. Ị tụghịkwa m ụjọ.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a. 20  ‘N’ihi na o teela m kụriri yok gị,+Dọbiekwa agbụ e kere gị. Ma ị sịrị na ị gaghị efe m. N’ugwu ọ bụla nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko+Ka ị na-edina jaghee ụkwụ gị, na-agba akwụna.+ 21  M kụrụ gị ka ezigbo mkpụrụ vaịn na-acha uhie uhie,+ nke na-emebighị emebi. Oleezi otú i si gbanwee n’ihu m, ghọzie alaka mebiri emebi nke osisi vaịn ọhịa?’+ 22  ‘I weregodị akanwụ na ncha hiri nne saa ahụ́,Ị ka ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’anya m n’ihi mmehie gị.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 23  Gịnị mere ị ga-eji sị, ‘Emerụghị m onwe m,Anaghịkwa m eso Bel’? Cheta otú i si bie ndụ na ndagwurugwu. Chetakwa ihe i mere. Ị dị ka nne kamel dị garagara,Nke na-agbagharị n’enweghị ebe ọ na-aga. 24  Ị dịkwa ka jakị ọhịa nke ala ịkpa maara ahụ́,Nke na-esigharị imi na-achọ oké ga-agba ya. Ònye ga-achụghachili ya azụ mgbe ọ chọrọ ka oké gbaa ya? Ike ekwesịghị ịgwụ ndị na-achọ ya. Mgbe oge* ya ruru, ha ga-achọta ya. 25  Kwụsị ịgba ọsọ, ma ọ́ bụghị ya, ị ga-agba ụkwụ ọtọ,Akpịrị ga-akpọkwa gị nkụ. Ma ị sịrị, ‘Ọ baghị uru!+ Kama ahụrụ m ndị mba ọzọ* n’anya,+Ọ bụkwa ha ka m ga-eso.’+ 26  Dị ka ihere si eme onye ohi mgbe e jidere ya,Otú ahụ ka ihere merela ndị Izrel,Ma ha ma ndị eze ha ma ndị isi ha,Ma ndị nchụàjà ha ma ndị amụma ha.+ 27  Ha na-asị osisi, ‘Ị bụ nna m,’+Sịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ma, ha na-agbakụta m azụ. Ha echeghị m ihu.+ Mgbe ọdachi dakwasịrị ha, ha ga-asị,‘Bịa zọpụta anyị!’+ 28  Juda, olee ebe chi ndị i meere onwe gị nọ?+ Ha bịa nyere gị aka ma ọ bụrụ na ha ga-azọpụtali gị n’oge ọdachi dakwasịrị gị. N’ihi na chi gị dị ọtụtụ otú ahụ obodo gị dị ọtụtụ.+ 29  Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu niile ji nupụrụ m isi?’+ 30  E nweghị uru ihe m tiri ụmụ gị bara.+ Ha anabataghị aka ná ntị m dọrọ ha.+ Mma agha unu bibiri ndị amụma unu+Otú ọdụm si ebibi ihe. 31  Ọgbọ a, chebaranụ okwu Jehova echiche. Àbụzi m ala ịkpa n’anya ndị Izrel,Ka àbụzi m ala gbara oké ọchịchịrị n’anya ha? Gịnị mere ndị a bụ́ ndị m ji sị, ‘Anyị tụsaara ahụ́ na-agagharị,Anyị agaghịkwa abịakwute gị ọzọ’?+ 32  Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ọ̀ ga-echefuli ihe o ji achọ mma? Nwaanyị a na-alụ ọhụrụ ọ̀ ga-echefu ákwà ọ na-eke n’obi? Ma, ọ dịla ezigbo anya ndị m chefuru m.+ 33  Nwaanyị, gịnị mere i ji agbasi mbọ ike ka ụmụ nwoke hụ gị n’anya? Ị zụọla onwe gị ịna-eme ihe ọjọọ.+ 34  Ọbara ndị* ogbenye aka ha dị ọcha gbasara n’uwe mwụda gị.+ Ahụghị m ka ndị aka ha dị ọcha na-abanye n’ụlọ gị n’ike,Ma, ọbara ha gbasachara n’uwe gị niile.+ 35  Ma ị sịrị, ‘Aka m dị ọcha. N’eziokwu, iwe Chineke na-ewesa m adajụọla.’ Ugbu a, m ga-ata gị ahụhụN’ihi na ị sịrị, ‘Emehieghị m.’ 36  Gịnị mere i ji were na ụzọ gị na-akwụghị ọtọ bụ obere ihe? Ihere Ijipt ga-emekwa gị,+Otú ahụ ihere Asiria mere gị.+ 37  Ihe a ga-eme ka i buru aka n’isi,+N’ihi na Jehova ajụla ndị ị tụkwasịrị obi. Ha agaghị eme ka ihe gaziere gị.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-egosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Olee ebe Jehova nọ?”
Na Hibru, “Olee ebe Jehova nọ?”
Ma ọ bụ “n’agwaetiti.”
Ma ọ bụ “Memfis.”
Ma ọ bụ “na-eri opu isi gị.”
Ya bụ, otu n’ime iyi ndị na-asọba n’Osimiri Naịl.
Na Hibru, “ọnwa.”
Ma ọ bụ “chi ndị mba ọzọ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ndị.”