Jeremaya 20:1-18

  • Pash-họ tiri Jeremaya ihe (1-6)

  • Jeremaya akwụsịghị izi ndị mmadụ ozi ọma (7-13)

    • Okwu Chineke dị ka ọkụ na-ere ere n’ime obi Jeremaya (9)

    • Jehova dị ka dike n’agha (11)

  • Jeremaya kwuru otú obi dị ya (14-18)

20  Pash-họ nwa Ịma, bụ́ onye nchụàjà na onyeisi ndị na-elekọta ọrụ n’ụlọ Jehova, nọ na-ege Jeremaya ntị mgbe ọ na-ebu ihe ndị a n’amụma.  Pash-họ wee tie Jeremaya onye amụma ihe ma tinye ya n’ọtọsị+ dị n’Ọnụ Ụzọ Ámá Mgbago nke Benjamin, nke dị n’ụlọ Jehova.  Ma n’echi ya, mgbe Pash-họ hapụrụ Jeremaya, Jeremaya gwara ya, sị: “Aha Jehova gụrụ gị ugbu a bụ Ụjọ Dị Ebe Niile,+ ọ bụghị Pash-họ.  N’ihi na Jehova kwuru, sị, ‘Ihe m ga-eme gị ga-emenye gị na ndị enyi gị niile ụjọ. Ndị iro ha ga-ejikwa mma agha gbuo ha n’ihu gị.+ M ga-enyefe Juda niile n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-adọrọkwa ha n’agha laa Babịlọn ma jiri mma agha gbuo ha.+  M ga-enye ndị iro ha akụnụba niile dị n’obodo a na ihe niile ha nwere na ihe niile bara ezigbo uru dị na ya nakwa akụ̀ niile ndị eze Juda nwere.+ Ha ga-akwakọrọ ha, burukwa ha laa Babịlọn.+  A ga-adọrọkwa gịnwa, bụ́ Pash-họ, n’agha, gị na ndị niile bi n’ụlọ gị. Ị ga-aga Babịlọn, nwụọkwa ebe ahụ. Ọ bụkwa ebe ahụ ka a ga-eli gị na ndị enyi gị niile, n’ihi na i buuru ha amụma ụgha.’”+   Jehova, i meela ihe tụrụ m n’anya. N’eziokwu, ọ tụrụ m n’anya. I gosila na ị ka m ike, wee merie m.+ Abụzi m onye e ji eme ihe ọchị ụbọchị niile. Onye ọ bụla na-akwa m emo.+   Mgbe ọ bụla m na-ekwu okwu, m na-eti mkpu, na-asị,“E nwere ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-ebibi ihe.” Okwu Jehova na-eme ka a na-akwa m emo, na-akparịkwa m ụbọchị niile.+   M kwuziri, sị: “Agaghị m ekwu okwu banyere ya. Agaghịkwa m ekwu okwu n’aha ya ọzọ.”+ Ma n’ime obi m, ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m. Enweghịzi m ike ịgbachi nkịtị. Enweghịkwa m ike imechi ọnụ.+ 10  N’ihi na anụrụ m akụkọ ọjọọ ọtụtụ ndị na-akọ. Ihe na-emenye m ụjọ gbara m gburugburu.+ Ha na-asị, “Kọsaanụ na ọ bụ onye ọjọọ, ka anyị na-akọsa ya.” Onye ọ bụla nke na-asị ka udo dịrị m na-ele anya ka m daa.+ Ha na-asị: “Ikekwe, ọ ga-eme ezigbo mmehie,Anyị emerie ya ma megwara ya ihe o mere anyị.” 11  Ma Jehova, bụ́ dike n’agha, nọnyeere m.+ Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji daa wee ghara imeri m.+ Ezigbo ihere ga-eme ha, n’ihi na ihe ha na-achọ ime m agaghị enwe isi. A gaghị echefu ihere a ga-emenye ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 12  Ma gịnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-enyocha onye ezi omume. Ị na-ahụ obi ndị mmadụ na ihe dị n’ime ime obi*+ ha. Kwe ka m hụ otú ị ga-esi taa ndị iro gị ahụhụ ihe ha mere,+N’ihi na ọ bụ gị ka m hapụụrụ okwu m ka i kpeere m ikpe.+ 13  Bụkuonụ Jehova abụ! Toonụ Jehova! N’ihi na ọ napụtala onye* ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ. 14  Ka a bụọ ụbọchị a mụrụ m ọnụ! Ka a ghara ịgọzi ụbọchị nne m mụrụ m!+ 15  Ka a bụọ nwoke bịara zie nna m ozi ọma ọnụ, onye bịara zie ya, sị: “A mụọrọla gị nwa nwoke!” Nke mere ka o nwee ezigbo aṅụrị. 16  Ka nwoke ahụ dịrị ka obodo dị iche iche Jehova kwaturu n’akwaghị mmakwaara. Ka ọ nụ mkpu ákwá n’ụtụtụ, nụkwa mkpu agha n’etiti ehihie. 17  Gịnị mere na o gbughị m mgbe m nọ n’afọ,Ka nne m bụrụ ili m,Ka o burukwa afọ ime m mgbe niile?+ 18  Gịnị mere m ji si n’afọ nne m pụtaBịa na-ahụ nsogbu na ihe na-agbawa obi,Ihere ana-emekwa m ná ndụ m niile?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na akụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”