Jeremaya 21:1-14

  • Jehova emeghị ihe Zedekaya rịọrọ ya (1-7)

  • A gwara ndị Izrel ka ha họrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ (8-14)

21  Jehova gwara Jeremaya okwu mgbe Eze Zedekaya+ ziri Pash-họ+ nwa Malkaịja na Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, ka ha gakwuru ya ma rịọ ya, sị:  “Biko, jụọrọ anyị Jehova ase, n’ihi na Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn na-achọ ịlụso anyị agha.+ Ikekwe, Jehova ga-arụrụ anyị otu n’ime ọrụ ya dị ebube, nke ga-eme ka Nebukadneza hapụ anyị.”+  Jeremaya wee sị ha: “Gwanụ Zedekaya, sị,  ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị: “M ga-eme ka ngwá agha unu tụgharịa mee unu ihe, ya bụ, ngwá agha unu ji na-achọ ịlụso eze Babịlọn+ na ndị Kaldia agha, bụ́ ndị nọchibidoro unu n’azụ mgbidi unu. M ga-achịkọtakwa ngwá agha unu* n’etiti obodo a.  M ga-eji aka m siri ike na ike m, jirikwa iwe na ọnụma na oké iwe+ lụso unu agha.+  M ga-egbu ndị bi n’obodo a, ma mmadụ ma anụmanụ. Ọrịa na-efe efe ga-egbu ha.”’+  “‘Jehova kwuru, sị, “Nke a gachaa, m ga-akpọrọ Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo a, ndị nke ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ, nyefee n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.*+ Nebukadneza ga-ejikwa mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere. Ọ gaghịkwa enwere ha ọmịiko ma ọ bụ metere ha ebere.”’+  “Ị ga-agwakwa ndị a, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Họrọnụ otu n’ụzọ ihe abụọ a: ọnwụ na ndụ.  “Mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọgidere n’obodo a. Ma onye pụrụ gaa chịliere ndị Kaldia nọchibidoro unu aka elu ga-adị ndụ, zọọ onwe ya ndụ,* ya abụrụ ụgwọ ọrụ ya.”’*+ 10  “‘Jehova kwuru, sị, “Agbakụtala m obodo a azụ ka ọdachi dakwasị ya, ka ihe ọma ghara ime na ya.+ A ga-enyefe ya n’aka eze Babịlọn.+ Ọ ga-agbakwa ya ọkụ.”+ 11  “‘Ezinụlọ eze Juda, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 12  Ezinụlọ Devid, Jehova kwuru, sị: “Na-ekpenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ. Napụtakwanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya,+Ka ọnụma m ghara ịdị ọkụ+Wee ree unu n’enweghị onye ga-emenyụ yaN’ihi omume ọjọọ unu.”’+ 13  Jehova kwuru, sị, ‘Ndị bi na ndagwurugwuNa ndị bi n’obodo dị n’oké nkume nke dị n’ala dị larịị,’ m ga-eme unu ihe. ‘Ununwa ndị na-asị: “Ònye ga-agbadata lụso anyị agha? Ònyekwa ga-eji ike bata ebe anyị bi?” 14  M ga-eme ka unu zaa ajụjụ ihe unu mere.+ M ga-esunye oké ọhịa unu ọkụ. Ọ ga-erepịakwa ihe niile gbara ya gburugburu.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
O nwere ike ịbụ, “M ga-akpọkọtakwa ha.”
Ma ọ bụ “igbu mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “zọọ mkpụrụ obi ya ndụ.”
Na Hibru, “ihe ọ kwatara.”