Jeremaya 22:1-30

  • Ihe ndị e kwuru ga-eme ndị eze ọjọọ (1-30)

    • Banyere Shalọm (10-12)

    • Banyere Jehoyakim (13-23)

    • Banyere Konaya (24-30)

22  Jehova kwuru, sị: “Gaa n’ụlọ* eze Juda, kwuo ihe a m na-aga ịgwa gị.  Kwuo, sị, “Eze Juda, onye nọ n’ocheeze Devid, gị na ndị na-ejere gị ozi nakwa ndị gị, bụ́ ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata, nụrụnụ ihe Jehova kwuru.  Jehova sịrị: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume. Napụtanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya. Unu emekpala onye mbịarambịa ọ bụla ahụ́. Unu emesikwala nwa na-enweghị nna* na nwaanyị isi mkpe ike.+ Unu egbukwala* onye aka ya dị ọcha.+  Ọ bụrụ na unu elezie anya mee ihe a m kwuru, ndị eze, bụ́ ndị na-anọchi Devid n’ocheeze ya,+ na ndị na-ejere ha ozi, nakwa ndị obodo ha ga na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ a na-abata. Ha ga-agbara ma ụgbọ ịnyịnya ma ịnyịnya ha na-abata.”’+  “Jehova kwukwara, sị, ‘Ma, ọ bụrụ na unu emeghị ihe a m kwuru, eji m onwe m na-aṅụ iyi na a ga-ala ụlọ a n’iyi.’+  “Jehova kwuru banyere ezinụlọ eze Juda, sị: ‘N’anya m, unu dị ka GiliedNakwa ọnụ ọnụ ugwu Lebanọn. Ma, m ga-eme ka unu bụrụ ala ịkpa. Ọ dịghị obodo ọ bụla n’ime obodo unu niile mmadụ ga-ebi.+   M ga-ahọpụta ndị ga-ebibi unu.* Onye nke ọ bụla ga-eji ngwá agha ya.+ Ha ga-egbutu osisi sida unu ndị kacha mma,Meekwa ka ha daba n’ọkụ.+  “‘Ọtụtụ ndị si mba dị iche iche ga na-ajụ ibe ha ma ha na-agafe obodo a, sị: “Gịnị mere Jehova ji mee obodo ukwu a ihe a?”+  Ha ga-azakwa ha, sị: “Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ ha na Jehova bụ́ Chineke ha gbara gaa na-akpọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, na-efekwa ha.”’+ 10  Unu eberela onye nwụrụ anwụ ákwá. Unu erukwarala ya uju. Kama, besierenụ onye a dọọrọ n’agha ákwá ike,N’ihi na ọ gaghị alọta ọzọ. Ọ gaghịkwa ahụ ala a mụrụ ya anya ọzọ. 11  “E nwere ihe Jehova kwuru banyere Shalọm,*+ bụ́ eze Juda, onye si n’ala a pụọ, onye bụ́kwa nwa Josaya, nke nọchiri Josaya+ nna ya. Ọ sịrị, ‘Ọ gaghị alọta n’ala a ọzọ. 12  N’ihi na n’obodo a dọọrọ ya n’agha laa ka ọ ga-anwụ. Ọ gaghịkwa ahụ ala a anya ọzọ.’+ 13  A ga-ata mmadụ ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ na-arụ ụlọ ya n’akwụwaghị aka ọtọ,Jiri mmegbu na-arụ ọnụ ụlọ dị iche iche n’elu ụlọ ya,Na-eme ka mmadụ ibe ya na-arụrụ ya ọrụ n’efu,Ya rụchaara ya ọrụ, ya ajụ ịkwụ ya ụgwọ,+ 14  Onye na-asịkwa, ‘M ga-arụrụ onwe m nnukwute ụlọ,Nke ọnụ ụlọ ndị dị n’elu ya ga-asakwa mbara. M ga-etinye ha windo. M ga-eji osisi sida machie ahụ́ ya, teekwa ya ágbá na-acha uhie uhie.* 15  Ì chere na ị ga na-achị n’ihi na i ji osisi sida na-egosi na ị ka ndị ọzọ? Nna gị riri nri, ṅụọkwa mmanya,Ma, o kpere ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume.+ Ihe gazikwaara ya. 16  O kpechitere ma ọnụ onye nọ n’ahụhụ ma ọnụ ogbenye. Ihe gazikwaara ha. Jehova kwuru, sị, ‘Ihe a o mere ó gosighị na ọ ma m? 17  Anya gị na obi gị dị n’iji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị gị uru, Dịrịkwa n’igbu* onye aka ya dị ọcha,Nakwa n’irigbu ndị mmadụ na ịnapụ ha ihe ha nwere.’ 18  “Ọ bụ ihe a mere Jehova ji kwuo gbasara Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, sị,‘Ha agaghị eruru ya uju, na-asị: “Ewoo, ị dị ka nwanne m nwoke! Ewoo, ị dị ka nwanne m nwaanyị!” Ha agaghịkwa eruru ya uju, sị: “Ewoo, nna anyị ukwu! Ewoo, onye dị ebube!” 19  Ya nwụọ, a ga-eme ya ihe a na-eme jakị nwụrụ anwụ.+ A ga-akpụrụ ya n’ala gaa tụfuoNá mpụga ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.’+ 20  Gaa Lebanọn tie mkpu ákwá. Besie ákwá ike na Beshan,Nọrọkwa n’Abarim tie mkpu ákwá,+N’ihi na e bibiela ndị niile gị na ha na-eme enyi.+ 21  M dụrụ gị ọdụ n’oge ị na-enweghị ihe na-echegbu gị. Ma, ị sịrị na ị gaghị ege m ntị.+ Otú a ka i si eme kemgbe ị bụ nwata. Ị naghị ege m ntị.+ 22  Ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile.+ A ga-adọrọkwa ndị gị na ha na-eme enyi n’agha. Ọdachi niile ga-adakwasị gị ga-emenye gị ihere, mechuokwa gị ihu. 23  Ọ bụ eziokwu na ọ dị ka ì bi na Lebanọn,+N’ụlọ e ji osisi sida rụọ,+Ị ga na-asụ ude mgbe ahụ́ ga na-egbu gị mgbuOtú o si egbu nwaanyị na-amụ nwa.”+ 24  “Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ọ bụrụgodị na gịnwa bụ́ Konaya*+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, bụ mgbaaka e ji aka ihe akara m gba n’aka nri, m ga-agbapụ gị n’ebe ahụ. 25  M ga-enyefe gị n’aka ndị na-achọ igbu gị* nakwa n’aka ndị ị na-atụ egwu nakwa n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị Kaldia.+ 26  M ga-achụga gị na nne mụrụ gị n’obodo ọzọ na-abụghị ebe a mụrụ unu. Unu ga-anwụkwa ebe ahụ. 27  E nweghịkwa ihe ga-eme ka unu lọghachi n’ala a na-agụ unu* agụụ ka unu nọrọ na ya.+ 28  Nwoke a bụ́ Konaya ọ̀ bụ ite e ledara anya, nke a kụriri akụri,Ka ọ̀ bụ ite na-enweghị onye chọrọ ya? Gịnị mere a ga-eji chụpụ ya na ụmụ ya,Chụga ha n’obodo ha na-amaghị?’+ 29  Ndị bi n’ụwa, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 30  Jehova kwuru, sị: ‘Deenụ n’akwụkwọ na nwoke a amụtaghị nwa. Deekwanụ na ihe agaghị agaziri ya n’oge* niile ọ dị ndụ,N’ihi na e nweghị otu n’ime ụmụ yaGa-anọ n’ocheeze Devid chịa ọzọ na Juda.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “awụfukwala ọbara.”
Na Hibru, “ga-edo ndị ga-ebibi gị nsọ.”
A na-akpọkwa ya Jehoahaz.
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Na Hibru, “n’ịwụfu ọbara.”
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Jekonaya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “n’ụbọchị.”