Jeremaya 23:1-40

  • Ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nke ọjọọ (1-4)

  • Obi ga-eru ndị mmadụ ala ma “eze, bụ́ onye ezi omume,” chịwa (5-8)

  • A ga-ata ndị amụma ụgha ahụhụ (9-32)

  • Ozi si n’aka Jehova bụ ibu arọ (33-40)

23  Jehova kwuru, sị, “Ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-egbu atụrụ ndị m na-azụ, na-achụsasịkwa ha, ga-ata ahụhụ.”+  E nwekwara ihe ọzọ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara ndị ọzụzụ atụrụ na-azụ ndị ya. O kwuru, sị: “Unu achụsasịala atụrụ m. Unu na-eme ka ha na-agbasasị. Unu anaghịkwa elekọta ha.”+ Jehova kwukwara, sị, “N’ihi ya, m ga-ata unu ahụhụ maka ihe ọjọọ unu na-eme.”  “M ga-esi n’ala niile m chụsasịrị atụrụ m kpọkọta ndị fọdụrụ n’ime ha.+ M ga-akpọghachi ha n’ala ha na-anọ ata ahịhịa.+ Ha ga-amụ ụmụ, mụbaakwa.+  M ga-ahọpụtara ha ndị ọzụzụ atụrụ ga na-azụ ha nke ọma.+ Ha agaghịzi atụ egwu. Ụjọ agaghịkwa atụ ha. E nweghịkwa nke ga-efu efu n’ime ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.  Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka e nwee eze, bụ́ onye ezi omume, nke ga-esi n’ezinụlọ* Devid.+ Ọ ga na-achị,+ na-egosi na ọ na-aghọta ihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+  N’oge ọ ga na-achị, a ga-azọpụta Juda.+ Obi ga-erukwa ndị Izrel ala n’ebe ha bi.+ Aha a ga na-akpọ ya bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.”+  Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe ha na-agaghịzi na-asị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, na-aṅụ iyi.’+  Kama ha ga na-asị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile ọ chụsasịrị ndị Izrel kpọlata ha, na-aṅụ iyi.’ Ha ga-ebikwa n’ala nke ha.”+  M na-agwa ndị amụma, sị: Obi agbawaala m. Ọkpụkpụ m niile na-ama jijiji. Mgbe m nụrụ okwu dị nsọ Jehova kwuru,Adị m ka onye mmanya na-egbu,Dịkwa ka onye ṅụrọrọ anya. 10  N’ihi na ndị na-akwa iko juru n’ala a.+ Ala a na-eru uju n’ihi ọnụ a bụrụ ya.+ Ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa akpọnwụọkwala.+ Omume ha adịghị mma. Ha dịkwa aka ike. 11  Jehova kwuru, sị, “Ma onye amụma ma onye nchụàjà emebiela.*+ Ahụkwala m ihe ọjọọ ha na-eme n’ụlọ m.”+ 12  Jehova kwukwara, sị, “N’ihi ihe a ha na-eme, ụzọ ha na-aga na ya ga na-amị amị, gbaakwa ọchịchịrị.+ A ga-enu ha aka, ha adaa. M ga-eme ka ọdachi dakwasị haN’afọ ha ga-aza ajụjụ ihe ha mere.” 13  “Ahụkwala m ihe na-asọ oyi ndị amụma nọ na Sameria+ na-eme. Ha na-ebu amụma n’aha Bel,Na-edufukwa ndị Izrel bụ́ ndị m. 14  Ahụkwala m ihe jọgburu onwe ya ndị amụma nọ na Jeruselem na-eme. Ha na-akwa iko,+ na-aghagbukwa onwe ha n’ụgha.+ Ha na-akwado ndị na-eme ihe ọjọọ.* Ha anaghịkwa akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. N’anya m, ha niile dị ka ndị Sọdọm.+ Ndị bi na Jeruselem dịkwa ka ndị Gọmọra.”+ 15  N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe ọ ga-eme ndị amụma ahụ. Ọ sịrị: “M ga-eme ka ha taa ahịhịa na-elu ilu. M ga-enyekwa ha mmiri e tinyere nsí ka ha ṅụọ.+ N’ihi na ndị amụma nọ na Jeruselem emeela ka a kwụsị ife m fewe chi ọzọ n’ala a niile.” 16  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Unu egela ntị n’ihe ndị amụma, ndị na-eburu unu amụma, na-ekwu.+ Ha na-eduhie unu.* Ọ bụ ha na-echepụta ihe ha sị na ha hụrụ n’ọhụụ.+ Ọ bụghị mụnwa bụ́ Jehova na-agwa ha ya.+ 17  Ha na-agwakarị ndị na-anaghị asọpụrụ m, sị,‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa ndị niile kpọchiri obi ha na-eme ihe ọjọọ, sị,‘Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị unu.’+ 18  Ònye guzo ebe ndị ha na Jehova dị ná mma guzoKa ọ nụ okwu ya, ghọtakwa ya? Ònye ṅara ntị n’ihe ọ na-ekwu ka o nwee ike nụ ya? 19  Jehova ga-amalite iwe iwe otú oké ifufe si amalite ife. Otú ahụ oké ifufe si efesi ike ka ọ ga-esi wesa ndị ajọ omume iwe.+ 20  Iwe Jehova agaghị adajụRuo mgbe o mere ihe dị ya n’obi. Unu ga-aghọta ihe a nke ọma n’oge ikpeazụ. 21  Ezighị m ndị amụma ahụ ka ha gaa ebe ọ bụla, ma ha gbaara ọsọ gawa. Agwaghị m ha ihe ọ bụla, ma ha buru amụma.+ 22  Ma, a sị na ha guzo ebe ndị mụ na ha dị ná mma guzo,Ha gaara eme ka ndị m nụ okwu m. Ha gaara emekwa ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha na omume ọjọọ ha.”+ 23  Jehova kwuru, sị, “Àbụ m Chineke naanị mgbe m nọ nso, ma ghara ịbụ Chineke mgbe m nọ ebe dị anya?” 24  Jehova sịkwara, “È nwere onye ga-ezo ebe m na-agaghị enwe ike ịhụ ya?”+ Jehova kwukwara, sị, “È nwere ihe ga-eme n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa mụ aghara ịma?”+ 25  “Anụla m ka ndị amụma, ndị na-ebu amụma ụgha n’aha m, na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’+ 26  Olee mgbe ibu amụma ụgha ga-apụ ndị amụma a n’obi? Ha bụ ndị amụma na-eji obi ha ekwu ihe ha ji aghọgbu ndị mmadụ.+ 27  Mkpa ha bụ iji nrọ ha na-akọrọ ibe ha mee ka ndị m chefuo aha m, otú ahụ ndị nna nna ha ji maka Bel+ chefuo aha m. 28  Onye amụma rọọ nrọ, ya kọọ nrọ ọ rọrọ. Ka onye nụrụ okwu m kwuokwa ihe ọ nụrụ n’aghaghị ụgha.” Jehova kwuru, sị: “Gịnị jikọrọ okporo ọka na mkpụrụ ọka?” 29  Jehova kwukwara, sị, “Ọ̀ bụ na okwu m adịghị ka ọkụ,+ dịrịkwa ka hama e ji akpụ ụ́zụ́, nke na-akụri nnukwu nkume?”+ 30  Jehova sịkwara, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-agwa ndị mmadụ ihe masịrị ha, na-asị na ọ bụ ihe m kwuru.”+ 31  Jehova kwukwara, sị, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-eji ire ha ekwu, sị, ‘Ọ bụ ya kwuru ihe a!’”+ 32  Jehova sịkwara, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-akọ nrọ ha na-arọghị. Ha na-akọ ya, na-eme ka ndị m kpafuo n’ihi ụgha ha na-agha na ọnụ ha na-etu.”+ “Ma ọ bụghị m ziri ha, ọ bụghịkwa m gwara ha ihe ha na-ekwu. N’ihi ya, ha agaghị abara ndị a uru ọ bụla.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 33  “Ọ bụrụ na ndị a ma ọ bụ ndị amụma ma ọ bụ ndị nchụàjà asị gị, ‘Ozi a si n’aka Jehova bụ ibu arọ,’* gwa ha, sị, ‘“Ọ bụ unu bụ ibu arọ! M ga-achụpụkwa unu.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’ 34  Onye amụma ma ọ bụ onye nchụàjà ma ọ bụ onye nkịtị nke na-asị, ‘Ozi si n’aka Jehova bụ ibu arọ,’ m ga-ata onye ahụ na ezinụlọ ya ahụhụ. 35  Onye ọ bụla n’ime unu na-ajụ ibe ya, na-ajụkwa nwanne ya, sị, ‘Gịnị ka Jehova zara? Gịnịkwa ka Jehova kwuru?’ 36  Kwụsịnụ ikwu na ozi Jehova bụ ibu arọ. Ọ bụ ihe onye ọ bụla n’ime unu na-ekwu bụ ibu arọ, n’ihi na unu na-ekwu ihe unu chere. Unu agbanweekwala okwu Chineke anyị dị ndụ, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha. 37  “Jụọ onye amụma ahụ, sị: ‘Gịnị ka Jehova zara gị? Gịnịkwa ka Jehova kwuru? 38  Ebe ọ bụ na unu nọgidere na-asị, “Ozi Jehova bụ ibu arọ,” Jehova kwuru, sị: “N’ihi na unu ka na-asị, ‘Ozi Jehova bụ ibu arọ,’ mgbe m gwachara unu ka unu kwụsị ịsị: “Ozi Jehova bụ ibu arọ,”’ 39  m ga-ebuli unu elu, tụfuo ma unu ma obodo m nyere unu na nna nna unu hà. 40  M ga-emenye unu ihere ruo mgbe ebighị ebi. A gaghịkwa echefu ihere m ga-emenye unu echefu.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “m ga-eme ka ome ezi omume puoro.”
Ma ọ bụ “akwụsịla ife Chineke.”
Na Hibru, “Ha na-eme ka aka ndị ọjọọ dị ike.”
Ma ọ bụ “na-emegharị unu anya.”
Ụzọ ihe abụọ okwu Hibru a sụgharịrị “ibu arọ” nwere ike ịpụta bụ: “ozi gbara ọkpụrụkpụ Chineke ziri” ma ọ bụkwanụ “ihe dị arọ.”