Jeremaya 24:1-10

  • Mkpụrụ fig ndị dị mma na ndị nke mebiri emebi (1-10)

24  Jehova gosiri m nkata abụọ a dọsara n’ihu ụlọ nsọ Jehova. Mkpụrụ fig dịkwa n’ime ha. O gosiri m ha mgbe Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn si na Jeruselem dọrọ Jekonaya*+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda n’agha laa Babịlọn, ya na ndị isi Juda, ndị omenkà, na ndị na-akpụ ụ́zụ́.*+  Mkpụrụ fig ndị dị n’otu nkata dị ezigbo mma. Ha dị ka mkpụrụ fig ndị bu ibe ha ụzọ mịa. Ma, mkpụrụ fig ndị dị na nkata nke ọzọ mebiri ezigbo mmebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha.  Jehova jụkwara m, sị: “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “Ana m ahụ mkpụrụ fig. Mkpụrụ fig ndị nke dị mma dị ezigbo mma. Ma mkpụrụ fig ndị nke mebiri emebi, mebiri ezigbo mmebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha.”+  Jehova gwaziri m, sị:  “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘M ga-ele ndị a e si na Juda dọrọ n’agha, ndị m si ebe a chụga ala ndị Kaldia, anya ọma. M ga-ele ha anya ọma otú m lere mkpụrụ fig ndị a dị mma.  M ga na-elekọta ha, meekwa ka ha lọghachi n’ala a.+ M ga-eme ka ihe gaziere ha. Agaghị m ebibi ha. M ga-akụ ha ka osisi. Agaghịkwa m efopụ ha.+  M ga-eme ka ha jiri obi ha chọọ ịmata m nke ọma, ka ha mata na m bụ Jehova.+ Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha,+ n’ihi na ha ga-eji obi ha niile lọghachikwute m.+  “‘Ma, a bịa n’ihe gbasara mkpụrụ fig ndị ahụ mebiri emebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha,+ Jehova kwuru, sị: “Otú ahụ ka m ga-esi were Zedekaya+ bụ́ eze Juda, ndị o mere ndị isi nakwa ndị fọdụrụ na Jeruselem, ma hà nọ na Juda ma hà nọ n’Ijipt.+  M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha, ụdị nke ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ Ha ga na-akọcha ha, jiri ha na-ama atụ otú ọdachi na-adị, na-akwakwa ha emo. A ga-abụkwa ha ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụga ha.+ 10  M ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-eme ha ihe,+ ruo mgbe ha nwụchapụrụ n’ala m nyere ha na ndị nna nna ha.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Konaya.
O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”