Jeremaya 26:1-24

  • Ndị Izrel chọrọ igbu Jeremaya (1-15)

  • E mechaghị gbuo Jeremaya (16-19)

    • E kwughachiri ihe Maịka buru n’amụma (18)

  • Yuraịja onye amụma (20-24)

26  Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya okwu.  Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Gaa guzoro n’ogige ụlọ Jehova kwuo ihe niile m ga-agwa gị ka i kwuo gbasara* ndị niile bi n’obodo dị iche iche dị na Juda, ndị na-abịa n’ụlọ Jehova ife ya.* Gwa ha ihe niile m na-aga ịgwa gị. Ya enwekwala nke ị ga-ahapụ ịgwa ha.  Ikekwe, ha ga-ege gị ntị, onye ọ bụla n’ime ha ahapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, mụ agbanweekwa obi m gbasara ọdachi m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha maka ihe ọjọọ ha na-eme.+  Gwa ha, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu edebeghị iwu* m nyere unu, wee hapụ ige m ntị,  ọ bụrụkwa na unu ahapụ ige ntị n’ihe ndị ohu m bụ́ ndị amụma na-ekwu, ndị m na-ezitere unu ugboro ugboro,*+  m ga-eme ka ụlọ a dị ka Shaịlo.+ M ga-emekwa ka obodo a bụrụ ihe mba niile ga-eji na-abụ ọnụ.’”’”+  Ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile nụkwara ka Jeremaya na-ekwu ihe ndị a n’ụlọ Jehova.+  Mgbe Jeremaya kwuchara ihe niile Jehova gwara ya ka ọ gwa mmadụ niile, ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile jidere ya, sị: “Ị ga-anwụrịrị.  Gịnị mere i ji buo amụma n’aha Jehova, sị, ‘Ụlọ a ga-adị ka Shaịlo, a ga-ebibikwa obodo a ka a ghara inwe onye ga-ebi na ya’?” Mmadụ niile wee gbaa Jeremaya gburugburu n’ụlọ Jehova. 10  Mgbe ndị isi Juda nụrụ ihe a, ha si n’ụlọ* eze bịa n’ụlọ Jehova ma nọrọ ọdụ n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá a rụrụ ọhụrụ n’ụlọ Jehova.+ 11  Ndị nchụàjà na ndị amụma wee gwa ndị isi ahụ na mmadụ niile, sị: “E kwesịrị igbu nwoke a,+ n’ihi na o buru amụma ihe ga-eme obodo a. Unu jikwa ntị unu nụ ya.”+ 12  Jeremaya gwaziri ndị isi niile na mmadụ niile, sị: “Ọ bụ Jehova zitere m ka m buo amụma a unu nụrụ gbasara ihe ga-eme ụlọ a na obodo a.+ 13  Ma ugbu a, ọ bụrụ na unu emee ka àgwà unu na omume unu dị mma, rubekwara Jehova bụ́ Chineke unu isi, Jehova ga-agbanwe obi ya ka ọdachi ahụ o kwuru okwu ya ghara ịdakwasị unu.+ 14  Ma, mụnwa nọ unu n’aka. Meenụ m ihe ọ bụla dị unu mma na ihe ọ bụla masịrị unu. 15  Ma, maranụ na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọbara onye aka ya dị ọcha ga-adị n’isi unu na n’isi obodo a nakwa n’isi ndị bi na ya, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Jehova ziri m ka m bịa gwa unu ihe a niile.” 16  Ndị isi na mmadụ niile wee gwa ndị nchụàjà na ndị amụma, sị: “E kwesịghị igbu nwoke a, n’ihi na ọ bụ aha Jehova bụ́ Chineke anyị ka o ji gwa anyị okwu.” 17  Ụfọdụ n’ime ndị okenye obodo ahụ malitekwara ịgwa ìgwè mmadụ ahụ niile, sị: 18  “Maịka+ onye Moreshet nọ na-ebu amụma n’oge Hezekaya+ bụ eze Juda, na-agwa ndị Juda niile, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “A ga-akọ Zayọn ka ubi. Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+ Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.”’+ 19  “Hezekaya bụ́ eze Juda na ndị Juda niile hà gburu ya? Ọ̀ bụ na Hezekaya atụghị egwu Jehova, ma rịọ Jehova ka o meere ha ebere,* nke mere na Jehova gbanwere obi ya gbasara ọdachi o kwuru ga-adakwasị ha?+ N’eziokwu, anyị na-achọ ịkpatara onwe anyị* nnukwu ọdachi. 20  “Nwoke ọzọ nke nọkwa na-ebu amụma n’aha Jehova bụ Yuraịja nwa Shemaya onye Kiriat-jierim.+ Ọ nọ na-ebu ụdị amụma a Jeremaya na-ebu, na-ekwu ihe ga-eme obodo a na ala a. 21  Eze Jehoyakim+ na ndị dike ya niile nakwa ndị niile o mere ndị isi nụrụ ihe ọ nọ na-ekwu, eze achọwa igbu ya.+ Ozugbo Yuraịja nụrụ ya, ụjọ tụwara ya, ya agbaga Ijipt. 22  Eze Jehoyakim zikwara Elnetan+ nwa Akbọ na ndị ọzọ ka ha gaa Ijipt. 23  Ha gakwara kpọpụta Yuraịja n’Ijipt, kpọrọ ya kpọtara Eze Jehoyakim, ya ejiri mma agha gbuo ya,+ e liekwa ya n’ebe a na-eli ndị nkịtị.” 24  Ma, Ahaịkam+ nwa Shefan+ chebere Jeremaya, nke mere na e nyefeghị Jeremaya n’aka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ka ị gwa.”
Ma ọ bụ “ịkpọrọ ya isiala.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Na Hibru, “ndị m na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezitere unu.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “gbalịa ime ka obi Jehova jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”