Jeremaya 27:1-22

  • Yok eze Babịlọn (1-11)

  • A gwara Zedekaya ka o jewere eze Babịlọn ozi (12-22)

27  Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya okwu.  Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Tụhịa eriri n’osisi yok dị iche iche, nyarakwa ha n’olu.  Were ha nye ndị ozi bịara Jeruselem ịhụ Zedekaya bụ́ eze Juda ka hanwa gaa nye ha eze Ịdọm,+ eze Moab,+ eze ndị Amọn,+ eze Taya,+ na eze Saịdọn.+  Gwa ha ka ha gwa ndị eze ha, sị: “‘“E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru. Gwanụ ndị eze unu na o kwuru, sị,  ‘Ọ bụ mụnwa ji ike m na-enweghị atụ na aka m siri ike kee ụwa, keekwa mmadụ na anụmanụ ndị bi na ya. Enyekwala m ya onye ọ masịrị m inye ya.*+  Ugbu a, enyela m ohu m bụ́ Nebukadneza,+ eze Babịlọn, ala a niile. Enyekwala m ya anụ ọhịa dị iche iche ka ha na-ejere ya ozi.  Mba niile ga na-ejere ya na nwa ya na nwa nwa ya ozi ruo mgbe alaeze ya na-agaghịzi adị,+ mgbe ọtụtụ mba na ndị eze ukwu ga-eji ya mere ohu.’+  “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụkwa na mba ma ọ bụ alaeze ọ bụla ajụ ijere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi, jụkwa ịnyara yok eze Babịlọn n’olu, m ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe taa mba ahụ ahụhụ. M ga-esi n’aka Nebukadneza tagide ha ahụhụ ruo mgbe ha gwụchara.’  “‘“‘N’ihi ya, unu egela ndị amụma unu ntị, ha na ndị na-agbara unu afa na ndị na-akọwara unu nrọ na ndị na-emere unu anwansi* nakwa ndị dibịa afa unu, bụ́ ndị na-agwa unu, sị: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.” 10  Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, a ga-esi n’ala unu kpọga unu ebe dị anya. M ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi. 11  “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ma mba nke ga-anyara yok eze Babịlọn n’olu wee na-ejere ya ozi, m ga-eme ka ọ nọgide* n’ala ya, na-akọ ihe na ya, birikwa na ya.’”’” 12  M gwakwara Zedekaya+ bụ́ eze Juda ihe a niile, sị: “Nyaranụ yok eze Babịlọn n’olu, na-ejekwaranụ ya na ndị ya ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ 13  Gịnị mere gị na ndị gị ga-eji kwe ka mma agha,+ ụnwụ,+ na ọrịa na-efe efe+ gbuo unu otú Jehova kwuru na ha ga-egbu mba na-ejereghị eze Babịlọn ozi? 14  Unu egela ndị na-eburu unu amụma ntị. Ha na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.’+ Ma, ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 15  “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụghị m gwara ha ihe ha na-agwa unu. Ha na-ebu amụma ụgha n’aha m. Ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, m ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi, ma unu ma ndị amụma na-eburu unu amụma.’”+ 16  M gwara ndị nchụàjà na ndị a niile, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Unu egela ntị n’ihe ndị amụma na-eburu unu amụma na-ekwu, sị: “N’oge na-adịghị anya, a ga-esi Babịlọn bulata arịa ndị na-adị n’ụlọ Jehova.”+ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 17  Unu egela ha ntị. Na-ejerenụ eze Babịlọn ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ Ma unu jụ ijere ya ozi, obodo a ga-abụzi ebe e bibiri ebibi. 18  Ma ọ bụrụ na ha bụ ndị amụma, ọ bụrụkwa na Jehova na-agwa ha okwu, biko, ka ha rịọ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka a ghara iburu arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem buga Babịlọn.’ 19  “E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru gbasara ogidi ndị dị n’ụlọ ahụ+ na nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri*+ na ihe ndị e ji ebu ihe+ na arịa ndị ọzọ fọrọ n’obodo a, 20  bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn na-eburughị mgbe o si Jeruselem dọrọ Jekonaya nwa Jehoyakim, bụ́ eze Juda, n’agha laa Babịlọn, ya na ndị niile a ma ama na Juda nakwa na Jeruselem.+ 21  N’eziokwu, e nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem. O kwuru, sị: 22  ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn.+ Ebe ahụkwa ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-ebulata ha ebe a.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “onye dị mma n’anya m inye ya.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “o zuru ike.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
E ji ọla kọpa kpụọ efere a dị n’ụlọ nsọ.
Ma ọ bụ “n’obí.”
O nwere ike ịbụ, “ruo mgbe m ga-echeta ha.”