Jeremaya 28:1-17

  • Jeremaya na onye amụma ụgha bụ́ Hananaya (1-17)

28  N’otu afọ ahụkwa, ná mmalite ọchịchị Zedekaya+ bụ́ eze Juda, n’ọnwa nke ise, n’afọ nke anọ n’ọchịchị ya, Hananaya onye amụma, bụ́ nwa Azọ, onye Gibiọn,+ gwara m n’ụlọ Jehova n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu mmadụ niile, sị:  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-agbaji yok eze Babịlọn.+  Tupu afọ abụọ agaa, m ga-ebulata arịa niile na-adị n’ụlọ Jehova ebe a, ya bụ, arịa ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn si ebe a buga Babịlọn.’”+  “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-akpọlata Jekonaya+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, ya na ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn,+ n’ihi na m ga-agbaji yok eze Babịlọn.’”  Jeremaya onye amụma gwaziri Hananaya onye amụma okwu n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu ndị niile guzo n’ụlọ Jehova.  Jeremaya onye amụma sịrị: “Amen!* Ka Jehova mee ihe a i kwuru! Ka Jehova mezuo ihe i buru n’amụma. Ka o bulata arịa ụlọ Jehova. Ka o sikwa Babịlọn kpọlata ndị niile a dọọrọ n’agha otú i kwuru.  Ma, biko, nụrụ ihe a m na-agwa gị na ndị a niile.  N’oge ochie, ndị amụma ndị bu m ụzọ na ndị bu gị ụzọ buru amụma gbasara ọtụtụ obodo na ọtụtụ alaeze ukwu ndị a ga-alụso agha, ndị ọdachi ga-adakwasị, na ndị ọrịa na-efe efe ga-eme ihe.  Ọ bụrụkwa na onye amụma ọzọ ebuo amụma na udo ga-adị n’ebe ndị ahụ, a ga-ama n’eziokwu na ọ bụ Jehova zitere ya ma ihe o kwuru mezuo.” 10  N’ihi ihe a Jeremaya kwuru, Hananaya onye amụma weere yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu gbajie.+ 11  Hananaya nọkwa n’ihu mmadụ niile ahụ kwuo, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Tupu afọ abụọ agaa, otú a ka m ga-esi gbajie yok Nebukadneza eze Babịlọn, bụ́ nke mba niile nya n’olu.’”+ Jeremaya onye amụma wee gawara onwe ya. 12  Mgbe Hananaya onye amụma gbajichara yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu, Jehova gwara Jeremaya, sị: 13  “Gaa gwa Hananaya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ bụ yok osisi ka ị gbajiri,+ ma a ga-eji yok ígwè dochie ya.” 14  N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-eme ka mba a niile nyara yok ígwè n’olu, iji jeere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi. Ha ga na-ejere ya ozi.+ M ga-enyekwa ya anụ ọhịa dị iche iche.”’”+ 15  Jeremaya onye amụma gwaziri Hananaya+ onye amụma, sị: “Hananaya, biko, gee ntị. Ọ bụghị Jehova zitere gị, ma i meela ka ndị a kwere okwu ụgha.+ 16  N’ihi ihe a i mere, Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ị nwụọ. Ị ga-anwụ n’afọ a, n’ihi na i mere ka ndị mmadụ nupụrụ Jehova isi.’”+ 17  Hananaya onye amụma wee nwụọ n’ọnwa nke asaa n’afọ ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”