Jeremaya 3:1-25

  • Otú ndị Izrel meruru ihe ọjọọ (1-5)

  • Ma ndị Izrel ma ndị Juda na-akwa iko (6-11)

  • A gwara ndị Izrel ka ha chegharịa (12-25)

3  Ndị mmadụ na-ajụ, sị: “Ọ bụrụ na nwoke achụpụ nwunye ya, ya agaa lụọ di ọzọ, nwoke ahụ ò kwesịrị ịkpọrọ ya ọzọ?” Ọ̀ bụ na e merụbeghị ala ahụ?+ “Gị na ọtụtụ ụmụ nwoke akwaala iko.+ Ị̀ ka kwesịrị ịlọghachikwute m?” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.   “Lelie anya lee elu ugwu. Olee ebe a na-anọbeghị dinaa gị n’ike? Ị na-anọ ọdụ n’akụkụ ụzọ na-eche ụmụ nwoke,Otú onye na-akwagharị akwagharị* na-esi akwagharị n’ala ịkpa. I ji akwụna ị na-agba na ihe ọjọọ ị na-eme+Na-emerụ ala a.   N’ihi ya, e meela ka mmiri kwụsị izo.+ E nweghịkwa ụla mmiri. Ị dịzi ka* nwaanyị a lụ alụ na-agba akwụna ihere na-anaghị eme. Ihere anaghị eme gị.+   Ma ugbu a, ị na-akpọku m, na-asị,‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m bụ nwa agbọghọ.+   Ị̀ ga-ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi,Ka ị̀ ga na-agụkọ mmehie anyị mgbe niile?’ Ihe a ka ị na-ekwu,Ma, ị ka na-eme ihe ọjọọ niile i nwere ike ime.”+  N’oge Eze Josaya na-achị,+ Jehova gwara m, sị: “‘Ị̀ hụla ihe Izrel na-enupụ isi mere? Ọ na-aga n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko, ka ọ nọrọ ebe ndị ahụ na-agba akwụna.+  N’agbanyeghịkwa ihe a niile o mere, m nọ na-agwa ya ka ọ lọghachikwute m,+ ma ọ lọghachikwuteghị m. Juda nọkwa na-ekiri nwanne ya nwaanyị na-aghọ aghụghọ.+  Mgbe m hụrụ ihe o mere, m chụpụrụ Izrel na-enupụ isi, nye ya akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm kpamkpam+ n’ihi iko ọ kwara.+ Ma, Juda bụ́ nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ atụghị egwu. Kama, yanwa malitekwara ịga na-agba akwụna.+  O weere akwụna ọ na-agba ka obere ihe. Ọ nọ na-emerụ ala a, ya na nkume na osisi ana-akwa iko.*+ 10  N’agbanyeghị ihe a niile, Juda bụ́ nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ ejighị obi ya niile lọghachikwute m, kama ọ lọghachikwutere m n’ọnụ.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.” 11  Jehova gwaziri m, sị: “Izrel na-enupụ isi bụ onye ezi omume karịa Juda na-aghọ aghụghọ.+ 12  Gaa n’ebe ugwu kwuo, sị:+ “‘“Jehova kwuru, sị, Izrel, onye na-enupụrụ m isi, lọghachi.”+ Jehova kwukwara, sị, ‘Agaghị m ewesa gị iwe,+ n’ihi na ana m akwụsi ike n’ihe m kwuru. Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi. 13  Ma kweta na i mehiere, n’ihi na i nupụrụla Jehova bụ́ Chineke gị isi. Gị na ndị mba ọzọ* na-akwa iko n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko. I geghịkwa m ntị. Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’” 14  Jehova kwuru, sị, “Unu ụmụ na-enupụ isi, lọghachinụ, n’ihi na abụ m ezigbo nna unu ukwu.* M ga-akpọrọ unu. M ga-esi n’otu obodo kpọrọ otu onye, sikwa n’otu ezinụlọ kpọrọ mmadụ abụọ. M ga-akpọtakwa unu na Zayọn.+ 15  M ga-enye unu ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ihe bụ́ uche m,*+ ha ga na-akụziri unu ihe, na-enyekwara unu aka ịghọta ihe. 16  Jehova kwukwara, sị, “N’oge ahụ, unu ga-amụ ọtụtụ ụmụ, ju ebe niile n’ala unu.+ Unu agaghịkwa asị, ‘Igbe ọgbụgba ndụ Jehova!’ Ọ gaghị abatakwa unu n’obi. Unu agaghịkwa echeta ya. Ọ gaghị agụ unu agụụ ịhụ ya. A gaghịkwa arụ ya ọzọ. 17  N’oge ahụ, ha ga-akpọ Jeruselem ocheeze Jehova.+ A ga-akpọkọta mba niile na Jeruselem ka ha too aha Jehova n’ebe ahụ.+ Ha agaghịzi akpọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ha n’obi.” 18  “N’oge ahụ, ezinụlọ Juda na ezinụlọ Izrel ga-ejekọ ije.+ Ha ga-esokwa si n’ala dị n’ebe ugwu banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe ha ketara.+ 19  M nọ na-eche otú obi si dị m ụtọ iwere gị ka otu n’ime ụmụ m ndị nwoke ma nye gị ọmarịcha ala, ala kacha ala niile mba dị iche iche ketara mma.+ M nọkwa na-eche na ị ga na-akpọ m “Nna m” nakwa na ị gaghị akwụsị iso m. 20  ‘N’eziokwu, unu ndị Izrel ghọrọ m aghụghọ otú ahụ nwaanyị dị aghụghọ na-ahapụ di ya.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.” 21  E nwere ụda a na-anụ n’elu ugwu. Ọ bụ ụda ákwá ndị Izrel na-ebe na arịrịọ ha na-arịọ. Otú ha si eme ihe akwụghị ọtọ. Ha echefuola Jehova bụ́ Chineke ha.+ 22  “Ụmụ na-enupụ isi, lọghachinụ. M ga-eme ka unu kwụsị inupụ isi.”+ “Lee anyị! Anyị abịakwutela gị,N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, bụ Chineke anyị.+ 23  N’eziokwu, anyị nọ na-eduhie onwe anyị mgbe anyị nọ na-eme mkpọtụ n’ugwu nta na n’ugwu ukwu dị iche iche.+ Nke bụ́ eziokwu bụ na nzọpụta Izrel dị n’aka Jehova Chineke anyị.+ 24  Kemgbe anyị bụ ụmụaka, chi na-abaghị uru ọ bụla* na-ewekọrọ ihe nna nna anyị hà tara ahụhụ kpata,+Ma ìgwè ewu na atụrụ ha, ma ìgwè ehi ha,Ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. 25  Anyị kwesịrị idina ala, ihere ana-eme anyị. Ka ihere anyị menyere onwe anyị kpuchie anyị,N’ihi na anyị emehiela Jehova bụ́ Chineke anyị,+Anyị na nna nna anyị hà, kemgbe anyị bụ ụmụaka ruo taa.+ Anyị emeghịkwa ihe Jehova bụ́ Chineke anyị gwara anyị mee.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “onye Arebia.”
Na Hibru, “Egedege ihu gị dịzi ka nke.”
Ya bụ, ọ nọ na-efe nkume na osisi.
Ma ọ bụ “chi ndị mba ọzọ.”
O nwere ike ịbụ, “di unu.”
Na Hibru, “obi m.”
Ma ọ bụ “ihe ihere.”