Jeremaya 33:1-26

  • Chineke kwere nkwa ịkpọghachi ndị Izrel (1-13)

  • Obi ga-eru ndị mmadụ ala ma “onye ezi omume si n’ezinụlọ Devid” chịwa (14-16)

  • Ọgbụgba ndụ gbasara Chineke na Devid na ndị nchụàjà (17-26)

    • Ọgbụgba ndụ nke na-achị ehihie na nke na-achị abalị (20)

33  Mgbe Jeremaya ka nọ ebe a kpọchiri ya n’Ogige Ndị Nche,+ Jehova gwara ya okwu nke ugboro abụọ, sị:  “E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova, Onye kere ụwa, Jehova, Onye kpụrụ ya ka o sie ezigbo ike, na-ekwu. Jehova bụ aha m. M na-agwa gị, sị,  ‘Kpọkuo m. M ga-aza gị. M ga-eji obi m niile gwa gị ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịghọta aghọta, ndị ị na-amaghịkwa.’”+  “E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara ụlọ ndị dị n’obodo a na ụlọ ndị eze Juda bụ́ ndị a kwaturu ka ndị iro ghara iji mma agha si ná mgbidi ha ji ájá rụọ bịa lụso ha agha.+  M kwukwara ihe ahụ gbasara ndị na-abịa ịlụso ndị Kaldia agha nakwa gbasara ebe dị iche iche ozu ndị m ji iwe na ọnụma gbuo juru, ya bụ, ozu ndị ihe ọjọọ ha na-eme mere m ji jụ obodo a.  M kwuru gbasara obodo ahụ, sị, ‘M ga-eme ka ọ gbakee, ka ahụ́ dị ya mma.+ M ga-agwọkwa ndị bi na ya, mee ka udo dịrị ha, ahụ́ eruokwa ha nnọọ ala.+  M ga-akpọlata ma ndị Juda ma ndị Izrel a dọọrọ n’agha.+ M ga-emekwa ka ha dị ike otú ha dị na mbụ.+  M ga-asachapụ mmehie ha niile,+ gbagharakwa ha mmehie ha niile nakwa iwu m ha mebiri.+  Ịnụ aha obodo a ga-eme ka m na-enwe aṅụrị. M ga-emekwa ka mba niile n’ụwa, ndị ga-anụ gbasara ihe ọma niile m na-emere ndị m,+ too m ma sọpụrụ m. Ha ga-atụ ụjọ, maakwa jijiji+ n’ihi ihe ọma niile m ga-emere ndị bi na ya na udo m ga-eme ka ọ dịrị na ya.’”+ 10  “Jehova kwuru, sị, ‘Unu ga-asị na ebe a abaghịzi uru, na mmadụ na anụ ụlọ anọghị na ya, nakwa na obodo ndị dị na Juda nakwa okporo ámá ndị dị na Jeruselem tọgbọzi nkịtị, na mmadụ anọghị na ha, na e nweghị onye bi na ha, na anụ ụlọ anọghịkwa na ha. Ma, a ga-emecha nụwa 11  mkpu ọṅụ na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ,+ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, olu ndị na-asị: “Keleenụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma.+ Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi!”’+ “Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga na-eweta àjà ekele n’ụlọ Jehova,+ n’ihi na m ga-akpọlata ndị ala a a dọọrọ n’agha ka ha dịrịkwa otú ha dị na mbụ.’” 12  “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị, ‘N’ala a na-abaghịzi uru, nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị, nakwa n’obodo niile dị na ya, a ga-emecha nwee ala anụmanụ na-ata ahịhịa, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru atụrụ ha na-aga.’+ 13  “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị ọzụzụ atụrụ ga-emecha na-agụ atụrụ ha ọnụ n’obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu, n’obodo ndị dị n’ala dị larịị, nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda nakwa n’ala Benjamin nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu+ nakwa n’obodo ndị dị na Juda.’”+ 14  “Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịa mgbe m ga-emezu ọmarịcha nkwa m kwere ndị Izrel na ndị Juda.+ 15  N’oge ahụ, m ga-eme ka onye* ezi omume si n’ezinụlọ Devid pụta.+ Ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+ 16  N’oge ahụ, a ga-azọpụta ndị Juda.+ Obi ga-erukwa ndị bi na Jeruselem ala.+ Aha a ga na-akpọ onye ahụ bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.’”+ 17  “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ Devid ga-anọ n’ocheeze Izrel.+ 18  Ọ dịghịkwa mgbe a na-agaghị enwe nwoke bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nke na-eguzo n’ihu m ka ọ chụọ àjà a na-esucha ọkụ, àjà ọka, na àjà ndị ọzọ.’” 19  Jehova gwakwara Jeremaya ọzọ, sị: 20  “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị, ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha,+ 21  maranụ na e nwekwara ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m,+ a gharazie inwe nwa ya ga-anọ n’ocheeze ya na-achị,+ nweekwa ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị na-ejere m ozi.+ 22  Otú ahụ a na-enweghị ike ịgụta kpakpando ndị dị n’eluigwe* ọnụ, otú ahụkwa a na-enweghị ike ịtụ ájá dị n’oké osimiri atụ̀, ka m ga-eme ka ụmụ* Devid bụ́ ohu m na ndị Livaị na-ejere m ozi mụbaa.’” 23  Jehova gwakwara Jeremaya ọzọ, sị: 24  “Ị́ nụbeghị ihe ndị a na-ekwu? Ha na-asị, ‘Jehova ga-ajụ ezinụlọ abụọ ahụ ọ họọrọ.’ Ha na-elelị ndị m. Ha anaghịzi ewere ha ka mba. 25  “Jehova kwukwara, sị, ‘Otú ahụ m mere ka e nwee ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na abalị,+ meekwa ka e nwee iwu* ndị na-achị eluigwe na ụwa,+ 26  otú ahụ ka m na-enweghị ike ịjụ nwa* Jekọb na nwa* Devid ohu m, agaghịkwa m ahapụ isi n’ụmụ* ya họpụta ndị ga na-achị ndị si n’ezinụlọ* Ebreham, Aịzik, na Jekọb. N’ihi na m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha.+ M ga-emetekwara ha ebere.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ome.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ihe ndị dị n’eluigwe.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ná mkpụrụ.”
Na Hibru, “ná mkpụrụ.”