Jeremaya 34:1-22

  • Ihe Chineke kpebiri ime Zedekaya (1-7)

  • Ndị Izrel mebiri ndụ ha gbara na ha ga-ahapụ ndị ohu ha ka ha laa (8-22)

34  Mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile na alaeze niile dị n’ụwa, bụ́ ndị nọ n’okpuru ya, nakwa ndị niile ọ na-achị, nọ na-alụso Jeruselem na obodo ya niile agha,+ Jehova gwara Jeremaya, sị:  “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Gaa gwa Zedekaya+ eze Juda, sị: “Jehova sịrị, ‘M ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-agbakwa ya ọkụ.+  Ị gaghị agbapụ n’aka ya, n’ihi na a ga-ejiderịrị gị, nyefeekwa gị n’aka ya.+ Gị na eze Babịlọn ga-ahụ ihu na ihu. Ọ ga-agwa gị okwu ihu na ihu. Ị ga-agakwa Babịlọn.’+  Ma, Zedekaya eze Juda, gee ntị n’ihe Jehova kwuru, ‘Jehova kwuru gbasara gị, sị: “A gaghị eji mma agha gbuo gị.  Ị ga-anwụ n’udo.+ Ndị gị ga-amụrụ gị insens* otú ha mụụrụ nna nna gị hà, bụ́ ndị eze bu gị ụzọ. Ha ga-erukwara gị uju, sị, ‘Ewoo, nna anyị ukwu!’ n’ihi na ‘ekwuola m ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”’”  Jeremaya onye amụma gwara Zedekaya eze Juda ihe a niile na Jeruselem,  mgbe ndị agha eze Babịlọn nọ na-alụso Jeruselem na obodo niile fọrọ na Juda agha,+ ya bụ, Lekish+ na Azika.+ Ọ bụ naanị obodo abụọ a fọrọ n’ime obodo niile a rụsiri ike na Juda.  E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya mgbe Eze Zedekaya na ndị niile nọ na Jeruselem gbachara ndụ ka a hapụ ndị ohu ka ha nwere onwe ha.+  Ha gbara ndụ ka onye ọ bụla hapụ ohu ya, bụ́ onye Hibru, ka ọ laa, ma ohu ya nwoke ma ohu ya nwaanyị, ka onye ọ bụla ghara iji onye Juu ibe ya mere ohu. 10  Ndị isi niile na mmadụ niile wee rube isi. Ha gbara ndụ na onye ọ bụla n’ime ha ga-ahapụ ohu ya nwoke na ohu ya nwaanyị ka ọ laa, ka ha gharazie iji ha mere ohu. Ha mere ihe a ha kwekọrịtara ma hapụ ndị ohu ha ka ha laa. 11  Ma, ha mechara kpọrọghachi ndị ohu ha ndị nwoke na ndị ohu ha ndị nwaanyị, bụ́ ndị ha hapụburu ka ha laa. Ha kpọọrọ ha ka ha gbawara ha ohu ọzọ. 12  Jehova gwaziri Jeremaya okwu ọzọ. Jehova gwara ya, sị: 13  “Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ na nna nna unu hà gbara ndụ+ n’ụbọchị m si n’ala Ijipt, ebe ha nọ na-agba ohu, kpọpụta ha.+ M gwara ha, sị: 14  “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu nwere onye Hibru, bụ́ nwanne ya, onye e resịrị ya ka ọ gbawara ya ohu, ya abụrụkwa na ohu ahụ ejeerela ya ozi afọ isii, ọ ga-ahapụ ya ka ọ laa n’afọ nke asaa. Ọ ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya.”+ Ma nna nna unu hà egeghị m ntị. Ha atọghịkwa ntị ha n’ala. 15  Ma, n’oge na-adịbeghị anya,* ununwa gbanwere, mee ihe dị mma n’anya m. Onye ọ bụla n’ime unu hapụrụ nwanne ya na-agbara ya ohu ka ọ laa. Unu nọkwa n’ụlọ a a na-anọ eto aha m gbaa ndụ n’ihu m. 16  Ma unu gbanwere ọzọ, mebie aha m.+ Unu gara kpọrọghachi ndị ohu unu ndị nwoke na ndị nke nwaanyị, ndị obi dị ụtọ na unu hapụrụ ha ka ha nwere onwe ha. Unu kpọọrọ ha ka ha gbawara unu ohu ọzọ.’ 17  “N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: ‘Unu emeghị ihe m gwara unu. Unu ahapụghị ụmụnne unu na-agbara unu ohu ka ha nwere onwe ha.’+ Jehova kwukwara, sị, ‘N’ihi ihe a unu mere, m ga-eme ka mma agha, ọrịa na-efe efe, na ụnwụ gbuo unu.+ Ọ bụ otú m ga-esi mee ka unu nwere onwe unu. Ihe m ga-eme unu ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ 18  M ga-enyefe ndị mebiri ọgbụgba ndụ m n’aka ndị iro ha, n’ihi na ha emeghị ihe mụ na ha kwekọrịtara mgbe anyị ji nwa ehi gbaa ndụ. Anyị gbara ndụ a mgbe ha bọwara nwa ehi ahụ ụzọ abụọ si n’etiti ya gafere.*+ 19  Ndị mụ na ha gbara ndụ a bụ ndị isi Juda, ndị isi Jeruselem, ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị nchụàjà, na ndị obodo a niile, ndị si n’etiti nwa ehi ahụ a bọwara abọwa gafere. 20  M ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.* Ozu ha ga-abụrụ nnụnụ na anụ ọhịa ihe oriri.+ 21  M ga-enyefe Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị o mere ndị isi n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha* nakwa n’aka ndị agha eze Babịlọn,+ ndị hapụrụ ịlụso ha agha.’+ 22  “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye iwu, meekwa ka ha lọghachi n’obodo a. Ha ga-alụso ya agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ.+ M ga-emekwa ka obodo niile dị na Juda tọgbọrọ nkịtị n’enweghị onye ga-ebi na ha.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “taa.”
Otú ahụ ka ndị oge ochie si egosi na ha agbaala ndụ.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”