Jeremaya 35:1-19

  • Ndị Rikab rubeere nna nna ha isi (1-19)

35  N’oge Jehoyakim+ nwa Josaya bụ eze Juda, Jehova gwara mụnwa bụ́ Jeremaya, sị:  “Gaa hụ ezinụlọ ndị Rikab.+ Gwa ha okwu. Kpọbata ha n’ụlọ Jehova, n’otu n’ime ụlọ a na-anọ eri ihe. Ha bata, bunye ha mmanya ka ha ṅụọ.”  M wee kpọrọ Jeazanaya nwa Jeremaya nwa Habazinaya, kpọrọkwa ụmụnne ya na ụmụ ya niile nakwa ezinụlọ ndị Rikab niile,  bata n’ụlọ Jehova. M kpọbara ha n’ụlọ ụmụ Henan nwa Igdalaya, bụ́ onye nke ezi Chineke, na-anọ eri ihe. Ụlọ a dị n’akụkụ ụlọ ndị isi na-anọ eri ihe, nke dị n’elu ụlọ Measaya nwa Shalọm, bụ́ onye nche ọnụ ụzọ, na-anọ eri ihe.  M dọsakwara nnukwu iko dị iche iche mmanya juru, chịsakwa obere iko, n’ihu ezinụlọ ndị Rikab ma sị ha: “Ṅụọnụ mmanya.”  Ma ha sịrị: “Anyị agaghị aṅụ mmanya, n’ihi na Jehonadab*+ nwa Rikab, bụ́ nna nna anyị, nyere anyị iwu, sị, ‘Unu emekatakwala ṅụọ mmanya, ma unu ma ụmụ unu.  Unu arụla ụlọ. Unu aghakwala mkpụrụ. Unu akọla ubi vaịn. Unu enwekwala ubi vaịn. Kama, na-ebinụ n’ụlọikwuu n’oge niile unu dị ndụ, ka unu wee bie ogologo ndụ n’ala a unu bụ ndị mbịarambịa.’  Anyị na-edebekwa iwu niile Jehonadab nwa Rikab bụ́ nna nna anyị nyere anyị. Anyị aṅụtụbeghị mmanya ọ bụla, ma anyị ma ndị nwunye anyị ma ụmụ anyị ndị nwoke ma ụmụ anyị ndị nwaanyị.  Anyị anaghị arụ ụlọ, nke anyị ji ebi n’ụlọ. Anyị enweghị ubi vaịn. Anyị enweghị ala. Anyị enweghịkwa mkpụrụ ọ bụla. 10  Anyị bi n’ụlọikwuu, na-emekwa ihe niile Jehonadab* nna nna anyị nyere anyị n’iwu. 11  Ma, mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn bịara ịlụso obodo a agha,+ anyị sịrị, ‘Bịanụ ka anyị banye Jeruselem ka ndị agha Kaldia na ndị agha Siria ghara ịkpara anyị aka.’ Ugbu a, anyị bizi na Jeruselem.” 12  Jehova wee gwa Jeremaya, sị: 13  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị: “Ọ̀ bụ na a nọghị na-agba unu ume ka unu mee ihe m kwuru?”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 14  “Jehonadab nwa Rikab nyere ụmụ ya iwu ka ha ghara ịṅụ mmanya. Ha aṅụbeghịkwa mmanya ọ bụla ruo taa, n’ihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha.+ Ma, mụnwa agwala unu okwu ugboro ugboro,* ma unu erubereghị m isi.+ 15  Anọ m na-ezitere unu ndị ohu m niile, bụ́ ndị amụma. M na-ezite ha ugboro ugboro,*+ ha ana-asị unu, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme,+ mewe ihe ọma. Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche, unu efekwala ha ofufe, ka unu wee biri n’ala m nyere unu na nna nna unu hà.’+ Ma unu atọghị ntị n’ala. Unu egeghịkwa m ntị. 16  Ụmụ Jehonadab nwa Rikab debere iwu nna nna ha nyere ha,+ ma ndị a egeghị m ntị.”’” 17  “N’ihi ya, Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ọdachi niile m kwuru na ọ ga-adakwasị ndị Juda na ndị niile bi na Jeruselem dakwasị ha,+ n’ihi na m gwara ha okwu ma ha egeghị m ntị. M nọkwa na-akpọ ha ma ha azaghị m.’”+ 18  Ma, Jeremaya gwara ezinụlọ ndị Rikab, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na unu rubeere Jehonadab, bụ́ nna nna unu, isi, na-edebe iwu niile o nyere unu, na-emekwa nnọọ ihe ọ gwara unu mee, 19  Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: “Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ Jehonadab* nwa Rikab ga na-ejere m ozi.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.
Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu.”
Na Hibru, “M na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha.”
Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.